Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 11 Jun

Kalenda Ọtọdọks · 29 Mee (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 11 Jun 2027

Fraịdee · Izu nke 6 nke Ista · Olu 5

Mmemme na ndị nsọ

Virginmartyr Theodosia of Constantinople († 730)

Ụbọchị obubu ọnụ

E kwere azụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Ọrụ 19:1–8

1Mgbe Apọlọs nọ na Kọrint, Pọl sitere ụzọ nke nʼime elu ala bịarute Efesọs. Nʼebe ahụ, ọ hụrụ ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ahụ, 2sị ha, “Unu natakwara Mmụọ Nsọ mgbe unu kweere?” Ha sịrị ya, “Mba, anyị anụbeghị na ọ nwere ihe dịka Mmụọ Nsọ.” 3Ya mere, ọ sịrị, “Gịnị ka unu kwenyere nʼime ya mgbe e mere unu baptizim?” Ha sịrị, “Baptizim nke Jọn.” 4Mgbe ahụ, Pọl sịrị, “Baptizim Jọn bụ nke gbasara nchegharị site na mmehie, na-agwa ndị mmadụ ka ha kwere nʼonye ahụ na-eso ya na-abịa, nke bụ, ikwere nʼime Jisọs.” 5Mgbe ha nụrụ nke a, e mere ha baptizim nʼaha Onyenwe anyị Jisọs. 6Mgbe Pọl bikwasịrị ha aka ya abụọ nʼisi, ha natara Mmụọ Nsọ. Ha kwukwara okwu nʼasụsụ dị iche iche, bukwaa amụma. 7Ha niile ruru ndị ikom iri na abụọ. 8Ọ banyere nʼụlọ nzukọ ahụ ma were nkwuwa okwu, na ịrụ ụka nʼebe o doro anya gwasie ha okwu ike banyere alaeze Chineke. Ọ bụ ọnwa atọ ka o were ya ime nke a.

Oziọma

Jọn 14:1–11

1“Ka obi ghara ịlọ unu mmiri. Kwerenụ na Chineke; kwerekwanụ na m. 2Nʼụlọ Nna m, e nwere ọtụtụ ebe obibi. Ọ bụrụ na o sighị otu a dịrị, agaara m agwa unu na m na-aga kwadoro unu ebe obibi? 3Ọ bụrụ na m agaa dozichara unu ebe obibi, aga m alọghachi bịa kpọrọ unu, ka ebe m nọ bụrụkwa ebe unu ga-anọ. 4Unu maara ụzọ ebe m na-aga.” 5Tọmọs sịrị ya, “Onyenwe anyị, anyị amaghị ebe ị na-aga, olee otu anyị ga-esi mata ụzọ ya?” 6Jisọs sịrị ya, “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ. O nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụghị site na m. 7Ọ bụrụ na unu maara onye m bụ, unu gaara amatakwa Nna m. Site ugbu a, unu amatala ya. Ma hụkwa ya.” 8Filip sịrị ya, “Onyenwe anyị, zi anyị Nna ahụ, afọ ga-ejukwa anyị.” 9Jisọs sịrị ya, “Ọtụtụ oge ndị a mụ na unu nọrọ ọ bụ na ị matabeghị onye m bụ, Filip? Onye ọbụla hụrụ m ahụla Nna. Olee otu i si asị, ‘zi anyị Nna ahụ?’ 10Ọ bụ na i kweghị na m nọ nʼime Nna, na Nna nọkwa nʼime m? Okwu niile m na-agwa unu esitekwaghị nʼebe m nọ pụta, kama ọ bụ Nna bi nʼime m na-arụ ọrụ ya. 11Kwere ihe m kwuru na anọ m nʼime Nna, na Nna nọkwa nʼime m. Ma ọ bụghị otu a, kwerenụ nʼihi ọrụ ebube ndị a.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 29 Mee na kalenda nzukọ bụ 11 Jun na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike