Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 10 Jun
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 10 Jun 2027
Tọọzdee · Izu nke 10 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tọọzdee nke izu nke 10 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
15Ee, tutu ruo taa, mgbe ọbụla ha na-agụ akwụkwọ iwu ahụ Mosis dere, ihe mkpuchi na-adịgide nʼobi ha. 16Ma mgbe onye ọbụla tụgharịrị nʼebe Onyenwe anyị nọ, a na-ewepụ akwa mkpuchi ahụ. 17Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Mmụọ, ma ebe ọbụla kwa Mmụọ Onyenwe anyị nọ, nʼebe ahụ ka mmadụ pụrụ inwere onwe ya. 18Anyị niile bụ ndị e wepụrụla akwa mkpuchi site nʼihu, na-egosi ebube nke Onyenwe anyị. A na-agbanwe anyị ịbanye nʼoyiyi ya site nʼebube ruo nʼebube, nke si nʼaka Onyenwe anyị, onye bụ Mmụọ. 4:1Ya mere, ebe anyị natara ije ozi a site nʼebere Chineke, ike adịghị agwụ anyị nʼobi. 3Ma a sịkwa na oziọma nke anyị na-ekwusa dịka ihe e zoro ezo, ọ bụ ihe e zoro ezo nye ndị ahụ na-ala nʼiyi. 4Nʼebe ha nọ, chi nke ụwa a ekpuchiela uche ndị na-ekweghị ekwe iji gbochie ha ịhụ ìhè nke oziọma ahụ na-ezipụta ebube Kraịst, onye dị nʼụdị Chineke nʼonwe ya. 5Nʼihi na ọ bụghị anyị onwe anyị ka anyị na-ekwusa, kama anyị na-ekwusa na Kraịst Jisọs bụ Onyenwe anyị. Ma anyị onwe anyị bụ ụmụodibo unu nʼihi Jisọs. 6Nʼihi na ọ bụ Chineke ahụ sịrị, ka ìhè si nʼọchịchịrị chawapụta; bụkwa onye mere ka ìhè ya nwuwa nʼime obi anyị. Nke a ka o mere iji wetara anyị ìhè amamihe nke ebube Chineke nʼihu Kraịst.
Abụ Ọma nzaghachi
8Aga m ege ntị mara ihe Chineke, onye bụ Onyenwe anyị ga-ekwu; ọ na-ekwe ndị ya, ndị nsọ ya nkwa udo, ma ka ha ghara ịlọghachi na nzuzu. 9Nʼezie, nzọpụta ya dị nso ndị na-atụ egwu ya, ka ebube ya si otu a dịgide nʼala anyị. 10Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi ezukọtala; ezi omume na udo esutula ọnụ. 11Ikwesi ntụkwasị obi ga-esite nʼala pupụta, ezi omume ga-esite nʼeluigwe ledata anya. 12Nʼezie, Onyenwe anyị ga-enye ihe dị mma, ala anyị ga-amịkwa mkpụrụ ubi ya. 13Ezi omume ga-aga nʼihu ya, idoziri ya ụzọ ọ ga-esi gaa.
Oziọma
20Ka m dọọ unu aka na ntị. Ọ bụrụ na ezi omume unu akarịghị ezi omume ndị Farisii na ndị ozizi iwu, unu apụghị ịba nʼalaeze eluigwe ma ọlị. 21“Unu nụrụ na-agwara ndị mmadụ nʼoge gara aga, sị, ‘Onye egbula mmadụ, onye ọbụla gburu mmadụ a ga-ekpe ya ikpe.’ 22Ma asị m unu, na onye ọbụla nke na-ewe iwe megide nwanna ya, na-enyefe onwe ya nʼaka ikpe. Onye ọbụla nke na-akpọ nwanna ya ‘ Raka,’ ya bụ Onye iberiibe, ga-aza ajụjụ nʼụlọikpe. Ọzọkwa, onye ọbụla nke kpọrọ nwanne ya, ‘Onye nzuzu,’ na-edo onwe ya ịba nʼọkụ ala mmụọ. 23“Ya mere, ọ bụrụ na ị gaa inye onyinye gị nʼebe ịchụ aja, ma cheta nʼebe ahụ na gị na nwanne gị adịghị nʼudo, 24hapụ onyinye gị nʼebe ịchụ aja, laa ka gị na nwanne gị kpezie. Mgbe unu mere udo, laghachi bịa nye onyinye gị. 25“Mee ọsịịsọ ka gị na onye kpọ gị eje ụlọ ikpe kpezie, mgbe ọ na-eburubeghị ikpe gị na ya jee nʼaka ọkaikpe, onye ga-enyefe gị nʼaka ndị nche, ma eleghị anya etinye gị nʼụlọ mkpọrọ. 26Nʼezie, agwa m gị, ị gaghị e si nʼebe ahụ pụta ruo mgbe ị kwụghachiri kobo niile i ji.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike