Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 12 Jun
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 12 Jun 2027
Satọdee · Izu nke 10 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee nke izu nke 10 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ncheta Satọdee nke Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
14Ọ bụ ịhụnanya Kraịst na-akwagide anyị, nʼihi na anyị kwere na otu onye nwụrụ maka mmadụ niile, nke pụtara na mmadụ niile anwụọla. 15Ọ nwụrụ nʼihi mmadụ niile, ka ndị dị ndụ gharakwa ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama maka onye ahụ nwụrụ nʼihi ha ma sikwa nʼọnwụ kulie. 16Bido ugbu a gawa, anyị adịghị elekwa onye ọbụla anya dịka mmadụ nkịtị. Nʼihi na anyị sitere nʼụzọ dị otu a lee Kraịst anya, chee na ọ bụ mmadụ efu. Ma ugbu a, anyị amakwaghị ya nʼụzọ dị otu a. 17Ya mere, ọ bụrụ na onye ọbụla amalite ịdị ndụ nʼime Kraịst, ọ ghọọla onye e kere ọhụrụ, ihe ochie agaala, nke ọhụrụ anọchie. 18Ma ọ bụ Chineke bụ onye na-eme ihe ndị a. Ọ bụ ya onwe ya sitere nʼaka Kraịst mee ka anyị na ya dịrị nʼudo. Ma ugbu a, o nyela anyị ọrụ ije ozi, ịkpọ ndị ọzọ ka ha bịa ka ya na ha dịrịkwa nʼudo. 19Ihe nke a pụtara bụ na Chineke sitere na Kraịst na-eme ka ya na ụwa dị na mma. Ọ dịghị agụkọrọ ụmụ mmadụ mmehie niile, kama o tinyela nʼaka anyị ozi banyere ụzọ o si eme ka ya na ụmụ mmadụ dịkwa na mma ọzọ. 20Ya mere, anyị bụ ndị na-anọchi anya Kraịst ijere ya ozi nʼụwa. Chineke ji anyị na-agwa unu okwu. Anyị na-arịọ unu dịka ọ bụ Kraịst nʼonwe ya na-arịọ unu. Biko, bịanụ ka unu na Chineke dịrị nʼudo. 21Nʼihi na o mere ka onye ahụ na-amaghị mmehie bụrụ mmehie nʼọnọdụ anyị, ka esi otu a mee ka anyị nwee oke nʼime ezi omume Chineke site na ya.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma Devid. Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị; ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya. 2Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị; echefukwala mmeso ọma ya niile, 3ọ bụ ya na-agbaghara gị mmehie gị niile; na-agwọkwa gị ọrịa gị niile, 4onye na-agbapụta ndụ gị site nʼolulu werekwa ịhụnanya na ọmịiko kpukwasị gị dịka okpueze, 8Onyenwe anyị nwere obi ọmịiko na-emekwa amara. Ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, o jupụtara nʼịhụnanya. 9Iwe ya anaghị adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụghị oge niile ka ọ na-anọgide na-ata mmadụ ụta; 11Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ịhụnanya ya si dị ukwuu nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ. 12Dịka ọwụwa anyanwụ si dị anya, site nʼọdịda anyanwụ, otu a ka o sirila mee ka mmehie anyị niile dịrị anya site nʼebe anyị nọ.
Oziọma
33“Ọzọkwa, unu nụrụ na a gwara ndị mmadụ nʼoge gara aga sị, ‘Aṅụla iyi ụgha, kama mezuo ihe niile unu ṅụrụ nʼiyi nye Onyenwe anyị.’ 34Ma asị m unu aṅụla iyi ọbụla. Ejikwala eluigwe aṅụ iyi nʼihi na eluigwe bụ ebe ocheeze Chineke dị. 35Ejikwala ụwa aṅụ iyi nʼihi na ụwa bụ ebe mgbakwasị ụkwụ ya. Ejikwala Jerusalem aṅụ iyi nʼihi na ọ bụ obodo Eze ukwu ahụ. 36Ejikwala isi gị aṅụ iyi nʼihi na ị pụghị ime ka otu agịrị isi gị dị ọcha maọbụ dị oji. 37Aṅụla iyi ọbụla. Kama ka okwu unu bụrụ ‘E’ maọbụ ‘Ee’; ihe ọbụla gafere nke a sitere nʼaka ajọ onye ahụ.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike