Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 10 Jun
Kalenda Ọtọdọks · 28 Mee (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 10 Jun 2027
Tọọzdee · Izu nke 6 nke Ista · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Mrigo Eluigwe nke Onyenwe anyị
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
2Nʼụbọchị ikpeazụ, ugwu nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ga-abụ nke eguzobere dịka ugwu dị elu karịa ugwu niile, a ga-ebuli ya elu karịa ugwu nta niile, mba niile dị iche iche ga-eruba nʼime ya dịka iyi. 3Ọtụtụ ndị mmadụ ga-abịa ma sịkwa, “Bịanụ, ka anyị rigoruo ugwu Onyenwe anyị, ka anyị gaa nʼụlọnsọ ukwu Chineke nke Jekọb. Ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya niile, ka anyị nwe ike jee ije nʼokporoụzọ ya niile.” Iwu ga-esi na Zayọn pụta, okwu Onyenwe anyị ga-esitekwa na Jerusalem pụta.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
10Gabiganụ! Gabiganụ sitenụ nʼọnụ ụzọ ama niile. Dozienụ ụzọ maka ndị m. Wuzienụ ụzọ niile, wuzienụ okporoụzọ niile. Bupụsịanụ nkume niile, weliekwanụ ọkọlọtọ maka mba niile. 11Onyenwe anyị ekwusaala okwu nye nsọtụ niile nke ụwa sị, “Gwanụ Ada Zayọn, ‘Lee Onye Nzọpụta gị na-abịa! Lee, ụgwọ ọrụ ya dị ya nʼaka, nkwụghachi nke ọ ga-akwụghachi sokwa ya na-abịa.’ ” 12A ga-akpọ ha Ndị Nsọ, ndị Onyenwe anyị gbapụtara; a ga-akpọkwa unu ndị a na-achọsi ike, Obodo a na-agbakụtaghị azụ. 63:1Onye bụ onye a si nʼEdọm na-abịa, onye si Bozra, nke uwe ya dị ọbara ọbara? Onye bụ onye a, yi uwe mara oke mma, onye na-azọ ije dịka ịba ụba nke ike ya si dị? “Ọ bu mụ onwe m, onye na-ekwu okwu nʼezi omume, onye dị ike ịzọpụta!” 2Gịnị mere uwe gị ji na-acha ọbara ọbara, dịka uwe onye na-azọcha mkpụrụ vaịnị? 3“Azọchaala m ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị, naanị m zọchara ya; o nweghị onye sị na mba niile dị iche iche bịa nyere m aka. Azọchara m ha nʼiwe m, zọpịasịakwa ha nʼime oke ọnụma m; ọbara ha gbasasịrị nʼuwe m, ma metọsịa uwe m niile. 7Aga m ekwupụta ihe banyere ịhụnanya Onyenwe anyị. Aga m eto ya nʼihi ihe niile o mere. Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi ịdị mma ya nʼebe Izrel nọ, e, nʼihi ọtụtụ ihe ọma o mere nʼihi mmeso ọma niile o mesoro ụlọ Izrel, nke ọ na-emeso ha dịka obi ebere ya na ọmịiko ya si dị. 8Nʼihi na Onyenwe anyị sịrị, “Ndị a bụ nke m; e, ha agakwaghị agọnarị m ọzọ.” Ya mere, ọ ghọọrọ ha Onye nzọpụta. 9Nʼime mkpagbu ha niile, a kpagbukwara ya onwe ya, ọ bụkwa mmụọ ozi nke ihu ya zọpụtara ha. Nʼime ịhụnanya ya na obi ebere ya, ọ gbapụtara ha, bulie ha elu, kuru ha ogologo ụbọchị ndị a niile ndị gara aga.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
1Lee, ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa, mgbe a ga-ekesa ihe nkwata gị niile nʼetiti mgbidi gị. 4Nʼụbọchị ahụ, ụkwụ ya ga-eguzo nʼelu Ugwu Oliv, nke dị nʼọwụwa anyanwụ Jerusalem. Mgbe ahụ, Ugwu Oliv ga-ekewa abụọ, mee ka ndagwurugwu buru ibu dịrị site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ. Nʼihi ya, ugwu ahụ ga-eke onwe ya abụọ. Otu akụkụ ga-adị nʼugwu, nke ọzọ ga-adị nʼụzọ ndịda. 8Nʼụbọchị ahụ, mmiri na-enye ndụ ga-esi na Jerusalem na-asọpụta. Ọ ga-ekewa abụọ, ọkara ya ga-asọbanye nʼosimiri Nnu dị nʼihu anyanwụ ebe ọkara nke ọzọ ga-asọbanye nʼosimiri Mediterenịa dị nʼọdịda anyanwụ. Ha ga na-asọ nʼọkọchị na nʼudu mmiri. 9Ma Onyenwe anyị ga-abụ eze nʼelu ụwa niile. Nʼụbọchị ahụ, naanị otu Onyenwe anyị ga-adị, naanị aha ya kwa ka a ga na-efe ofufe. 10Ala niile, site na Geba ruo Rimọn, nke dị na ndịda Jerusalem ga-adị ka ọzara. Ma ọ bụ naanị Jerusalem ga-adị nʼebe lara elu. Ọ ga-adịkwa nʼọnọdụ ya site nʼọnụ ụzọ ama nke Benjamin ruo nʼebe ọnụ ụzọ ama nke Mbụ, ruo nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼAkụkụ, sitekwa nʼỤlọ elu Hananel ruo nʼebe a na-azọchapụta mmanya eze. 11A ga-ebiju na ya na-enweghị nsogbu. A gaghị emebikwa ya ọzọ. Jerusalem ga-ebikwa nʼudo na-atụghị egwu.
Ofufe ụtụtụ: Oziọma
9Mgbe Jisọs biliri nʼọnwụ nʼisi ụtụtụ nʼụbọchị mbụ nke izu, onye mbụ o gosiri onwe ya bụ Meri Magdalin, onye ahụ o siri nʼahụ ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa. 10Ọ lara gaa kọrọ ndị ya na ha na-anọ na mbụ, bụ ndị nọrịị na-ebe akwa ma na-erukwa ụjụ. 11Mgbe ha nụrụ na ọ dị ndụ, na ọ hụkwala ya, ha ekweghị. 12Mgbe ihe ndị a gasịrị, o gosiri mmadụ abụọ nʼime ha onwe ya nʼụdị ọzọ, mgbe ha na-abanye nʼime obodo. 13Ndị a laghachiri bịa kọọrọ ndị nke ọzọ ma ha ekwetakwaghị. 14Emesịa, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya iri na otu ahụ onwe ya, mgbe ha nọkọrọ na-eri nri. Ọ baara ha mba nʼihi enweghị okwukwe ha nakwa mkpọchi obi ha, nʼihi na ha jụrụ ikwenye nʼihe ndị ọzọ hụrụ ya gwara ha mgbe e mesịrị ka ọ si nʼọnwụ bilite. 15Ọ gwara ha sị, “Gaanụ nʼime ụwa niile kwusaara ihe niile e kere eke oziọma. 16Onye ọbụla kweerenụ na onye e mekwara baptizim ka a ga-azọpụta. Ma a ga-ama onye ọbụla na-ekwereghị ikpe. 17Ihe ịrịbama ndị a ga-esokwa ndị kwerenụ. Site nʼaha m, ha ga-achụpụ mmụọ ọjọọ; kwuokwa okwu nʼasụsụ ọhụrụ dị iche iche. 18Ha ga-eji aka ha abụọ atụtụlie agwọ, ṅụọkwa nsi ma ọ gaghị emerụ ha ahụ ma otu. Ha ga-ebikwasị ndị ọrịa aka, ahụ ga-adịkwa ha mma.” 19Mgbe Onyenwe anyị Jisọs gwasịrị ha okwu ndị a, e weliri ya elu, baa nʼeluigwe, ebe ọ nọdụ ala nʼakụkụ aka nri Chineke. 20Ha pụrụ kwusaa oziọma nʼebe niile. Onyenwe anyị nọnyekwaara ha, mee ka okwu ya guzosie ike site nʼihe ịrịbama dị iche iche nke na-eso ya.
Akwụkwọ ozi
1Ezigbo enyi m Tiofilọs, nʼakwụkwọ m nke mbụ m dere gị banyere ihe niile Jisọs malitere ime nakwa ikuzi, 2ruo nʼụbọchị e mere ka ọ laghachi nʼeluigwe mgbe o sitere nʼike Mmụọ nsọ nyesịa ndị na-eso ụzọ ya iwu, bụ ndị ọ họpụtara. 3Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ nke ọnwụ, o gosiri ha onwe ya nʼụzọ dị iche iche nʼebe o doro anya na ya dị ndụ. O mere ka ha hụ ya anya nʼime iri ụbọchị anọ, na-akụziri ha banyere alaeze Chineke. 4Nʼotu oge, ọ nọnyeere ha na nri, o nyere ha iwu a, “Unu esila na Jerusalem pụọ, kama cherenụ nkwa nke Nna m, nke unu nụrụ site nʼọnụ m. 5Nʼihi na Jọn jiri mmiri mee unu baptizim, ma nʼoge na-adịghị anya, a ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.” 6Mgbe ha gbakọrọ, ha jụrụ ya, “Onyenwe anyị, ọ bụ ugbu a ka i ga-enyeghachi Izrel alaeze ahụ?” 7Ma ọ sịrị ha, “Ọ bụghị ọrụ unu ịmata oge na mgbe Nna m na-akwado ihe o zubere ime nʼikike nke onwe ya. 8Ma mgbe Mmụọ Nsọ bịakwasịrị unu, unu ga-anata ike. Mgbe ahụ, unu ga-agbara m ama na Jerusalem, na Judịa niile ya na Sameria ruokwa ebe niile ụwa sọtụrụ.” 9Mgbe o kwusiri nke a, e weliri ya elu mgbe ha na-ele anya, igwe ojii kpuchikwara ya, zopu ya nʼanya ha. 10Mgbe ha na-elegidesi anya ike nʼeluigwe dịka ọ na-ala, na mberede, ụmụ nwoke abụọ yi uwe ọcha guzooro ha nso. 11Ha sịrị, “Ndị ikom Galili, gịnị mere unu jiri guzoro ebe a na-ele anya nʼeluigwe? Jisọs a onye e sitere nʼetiti unu kpọrọ laa nʼeluigwe ga-alọghachikwa otu ahụ unu si hụ ya o siri laa nʼeluigwe.” 12Ha sitere nʼUgwu a na-akpọ Oliv nke dị Jerusalem nso, njem nke otu ụbọchị izuike, laghachi na Jerusalem.
Oziọma
36Mgbe ha ka na-ekwu banyere nke a, ya onwe ya guzooro nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.” 37Oke egwu tụrụ ha, obi lọkwara ha mmiri nʼihi na ha chere na ha ahụla mmụọ. 38Ma ọ sịrị ha, “Gịnị mere ụjọ ji atụ unu, gịnị mere unu ji nwee obi abụọ? 39Leenụ m anya nʼaka na nʼụkwụ. Ọ bụ mụ onwe m! Metụnụ m aka ka unu hụrụ, nʼihi na mmụọ adịghị enwe anụ ahụ na ọkpụkpụ dị ka unu hụrụ m nwere.” 40Mgbe o kwuchara nke a, o gosiri ha aka ya na ụkwụ ya. 41Ma dị ka o siiri ha ike ikwere nʼihi ọṅụ na oke mgbagwoju anya, ọ sịrị ha, “Ọ dị ihe oriri unu nwere ebe a?” 42Ha nyere ya otu ntakịrị azụ a mịkpọrọ amịkpọ. 43Ma ọ naara ya rie ya nʼihu ha. 44Mgbe ahụ, ọ sịrị ha, “Okwu ndị a ka m gwara unu mgbe mụ na unu nọ, na ihe niile e dere nʼiwu Mosis na ndị Amụma na nʼAbụ Ọma banyere m ga-emezucha.” 45Mgbe ahụ, o meghere akọnuche ha ka ha ghọta akwụkwọ nsọ. 46Ọ sịrị ha, “Nke a bụ ihe e dere na, Kraịst ahụ ga-ahụ ahụhụ ma sitekwa nʼọnwụ bilie nʼụbọchị nke atọ. 47Na a ga-ekwusa nchegharị na mgbaghara mmehie site nʼaha ya nye mba niile, malite na Jerusalem. 48Unu bụ ndị akaebe nke ihe ndị a. 49Ma lee, agaje m izitere unu ihe ahụ Nna m kwere na nkwa. Ya mere, nọrọnụ nʼime obodo ruo mgbe a ga-eyikwasị unu ike nke si nʼelu.” 50O duuru ha garuo na Betani, chilie aka ya abụọ elu gọzie ha. 51Dị ka ọ na-agọzi ha, ọ sitere nʼebe ha nọ pụọ, e weliri ya elu, baa nʼeluigwe. 52Mgbe ahụ, ha fere ya ofufe jiri oke ọṅụ laghachi na Jerusalem. 53Ha nọgidere nʼụlọnsọ ukwu ahụ na-eto Chineke oge niile.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 28 Mee na kalenda nzukọ bụ 10 Jun na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike