Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 9 Jun
Kalenda Ọtọdọks · 27 Mee (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 9 Jun 2027
Wenezdee · Izu nke 6 nke Ista · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Njedebe Ista; ụbọchị tupu Mrigo Eluigwe
Ụbọchị obubu ọnụ
E kwere azụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
22Mgbe ọ kwụsịrị na Sizaria, ọ gara leta chọọchị dị nʼebe ahụ kelee ha. Emesịa, ọ gara nʼihu ruo Antiọk. 23Mgbe ọ nọsịrị nwa oge nta nʼebe ahụ, ọ sitere nʼebe ahụ pụọ jegharịa nʼakụkụ obodo Galeshịa na Frigia na-agba ndị na-eso ụzọ ahụ ume. 24Ma otu nwoke onye Juu, aha ya bụ Apọlọs, onye Alegzandria bịara na Efesọs. Ọ bụ onye ọka okwu, bụrụkwa onye maara ihe edere nʼAkwụkwọ Nsọ nke ọma. 25Nwoke a natara ozizi banyere ụzọ Onyenwe anyị. O sitekwara nʼịnụ ọkụ nke obi kuzie nnọọ ihe ziri ezi banyere Jisọs. Ma ihe ọ maara bụ naanị ihe gbasara baptizim Jọn mere. 26Ma ọ nọgidesịrị ike na-ekwuwa okwu nʼụlọ nzukọ. Mgbe Prisila na Akwila nụrụ okwu ya, ha jekwuru ya, duru ya gaa nʼụlọ, were nwayọọ kọwaara ya ihe niile banyere ụzọ Chineke. 27Mgbe o zubere ịga obodo Akaịa, ndị ụmụnna gbara ya ume. Ha degaara ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ akwụkwọ ka ha nabata ya. Mgbe ọ bịaruru, Onyenwe anyị sitere nʼaka ya mee ka amara ya baa ụba nʼebe ndị kwere ekwe nọ. 28Nʼihi na nʼihu ndị mmadụ niile, o guzoro kwuo okwu megide ozizi ọjọọ na ịrụ ụka niile nke ndị Juu. O gosiri ha site nʼakwụkwọ nsọ na Jisọs bụ Kraịst ahụ.
Oziọma
36Kwerenụ nʼìhè ahụ ugbu a unu nwere ya ka unu ghọọ ụmụ nke ìhè.” Mgbe Jisọs kwusiri nke a ọ hapụrụ ha pụọ ga zoo onwe ya. 37Nʼagbanyeghị ọrụ ịrịbama niile ọ rụrụ nʼetiti ha, ha ekwereghị na ya. 38Nke a bụ imezu ihe Aịzaya onye amụma kwuru, “Onyenwe anyị, onye kweere ozi anyị ọ bụkwa nʼahụ onye ka e kpugheere ogwe aka Onyenwe anyị?” 39Ma ha enweghị ike kwere, nʼihi na Aịzaya kwukwara nʼebe ọzọ, sị, 40“O meela ka ha kpuo ìsì, mekwa ka obi ha kpọchie Ka ha ghara iji anya ha hụ ụzọ maọbụ jiri obi ha ghọta ihe ọbụla Ka ha gharakwa ichigharị, ka m gwọọ ha.” 41Aịzaya kwuru ihe ndị a nʼihi na ọ hụrụ ebube ya, ma kwuo banyere ya. 42Otu ọ dị, ọtụtụ nʼime ndịisi kweere na ya, ma ha ekwupụtaghị nke a. Nʼihi na ha tụrụ egwu na ndị Farisii ga-achụpụ ha site nʼụlọ ekpere. 43Nʼihi na ha hụrụ otuto mmadụ nʼanya karịa otuto Chineke. 44Jisọs tiri mkpu sị, “Onye ọbụla kwere na m, ọ bụghị na m ka o kwere, kama ọ bụ na onye nke zitere m. 45Nʼihi na onye ọbụla hụrụ m ahụla onye nke zitere m. 46Abịara m nʼime ụwa dị ka ìhè ka onye ọbụla nke kwere na m ghara ịnọ nʼọchịchịrị. 47“Ma ọ bụrụ na onye ọbụla anụ okwu m ma ju ime ya, ọ bụghị m na-ekpe ya ikpe. Nʼihi na abịara m ịzọpụta ụwa, ọ bụghị ikpe ụwa ikpe.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 27 Mee na kalenda nzukọ bụ 9 Jun na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike