Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 4 Jun

Kalenda Ọtọdọks · 22 Mee (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 4 Jun 2027

Fraịdee · Izu nke 5 nke Ista · Olu 4

Mmemme na ndị nsọ

Martyr Basiliscus the Bishop of Comana († c. 308)

Ụbọchị obubu ọnụ

E kwere azụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Ọrụ 15:5–34

5Ma ụfọdụ ndị kwere ekwe si nʼotu ndị Farisii biliri na-ekwu sị, “Na ọ dị mkpa ka e bie ha ugwu ma gwakwa ha ka ha dobe iwu Mosis.” 6Mgbe ahụ, ndị ozi na ndị okenye zukọtara itule okwu a. 7Mgbe ha nọ tulegide okwu ahụ ruo oge dị anya, Pita guzoro ọtọ sị ha, “Ụmụnna m, unu niile maara na site na mbụ Chineke họpụtara m site nʼetiti unu, ka m zisaa oziọma ahụ nye ndị mba ọzọ ka ha nụrụ, ma kwerekwa. 8Chineke a, onye maara obi mmadụ niile gbaara ha akaebe site nʼinye ha onyinye Mmụọ Nsọ dịka anyị si nata ya na mbụ. 9O gosighị na o nwere ihe dị iche nʼetiti anyị na ha. Nʼihi na o mere ka obi ha dị ọcha site nʼokwukwe. 10Ugbu a, gịnị mere unu ji anwa Chineke ọnwụnwa site na-itinye nʼolu ndị na-eso ụzọ ya ibu arọ nke anyị maọbụ nna nna anyị ha na-enweghị ike ịdọkpụ? 11Mba, anyị kwenyere na ọ bụ site nʼamara nke Onyenwe anyị Jisọs ka a ga-eji zọpụta anyị, dịka a ga-esi zọpụtakwa ha.” 12Mmadụ niile nọdụrụ nwayọọ, ha bidoro ige ntị nʼakụkọ Banabas na Pọl na-akọrọ ha banyere ihe ịrịbama niile na ọrụ ebube niile Chineke jiri ha rụọ nʼetiti ndị mba ọzọ. 13Mgbe ha kwusiri okwu ndị a, Jemis sịrị, “Ụmụnna m geenụ ntị. 14Saimọn akọọlara anyị otu Chineke si buru ụzọ lekọta ndị mba ọzọ site na isite nʼetiti ha họpụtara onwe ya ndị ga-ekwere na aha ya. 15Nke a na okwu ndị amụma dakọtara, dịka e dere ya, 16“ ‘Mgbe nke a gasịrị, aga m alọghachi, aga m ewughachikwa ụlọ ikwu Devid nke dara ada. Ebe ya niile dakpọsịrị adakpọsị ka m ga-ewugharịkwa, aga m emekwa ka ọ guzozie, 17ka ndị fọdụrụ nʼetiti mmadụ nwe ike chọọ Onyenwe anyị, ọ bụladị ndị mba ọzọ niile ndị a kpọkwasịrị aha m, ka Onyenwe anyị kwuru, onye na-emekwa ihe ndị a.’ 18Nke a amaara site na mgbe ochie. 19“Nʼihi nke a, mkpebi ikpe m bụ nke a, ka anyị ghara isogbu ndị mba ọzọ lọghachikwutere Chineke, 20kama o kwesiri ka anyị degara ha akwụkwọ gwa ha sị ha hapụ iri nri ọbụla e ji chụọrọ arụsị aja. Ka ha wezugakwa onwe ha site na mmehie ịkwa iko, ya na iri anụ a nyagburu anyagbu, maọbụ ọbara. 21Site na mbụ, Mosis nwere ndị na-ekwusa iwu nʼobodo niile. A na-agụkwa ya nʼụlọ nzukọ nʼụbọchị izuike niile.” 22Mgbe ahụ, ndị ozi na ndị okenye, ha na nzukọ niile, kpebiri ka a họpụta ndị ikom a ga-eziga Antiọk ha na Pọl na Banabas. Ha họpụtara Judas onye a na-akpọkwa Basabas, na Saịlas, ndị ndu so nʼetiti ụmụnna. 23Ha nyekwara ha nʼakwụkwọ ozi dị otu a, Akwụkwọ a sitere nʼaka ndị ozi, na ndị okenye ndị bụ ụmụnna unu. A na-edetara ya unu ndị sitere na mba ọzọ kwere bụ ndị nọ nʼAntiọk, Siria na Silisia. Ekele. 24E mere ka anyị mata na ụfọdụ ndị otu anyị ebuterela unu nsogbu na ọgbaaghara, mee ka obi lọọ unu mmiri, na-emebi mkpụrụobi unu. Ma nʼezie, ha anataghị ike nʼaka anyị ime nke a. 25Nʼihi nke a, anyị zukọrọ, sitekwa nʼotu obi kpebie ịhọpụta ụfọdụ ndị ikom na izitere unu ha, ha na ndị anyị hụrụ nʼanya, bụ Pọl na Banabas, 26ndị ikom werela ndụ ha tụnye nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. 27Ya mere, anyị na-ezite Judas na Saịlas ndị ga-akọwara unu nʼihu nʼihu, ihe anyị dere nʼakwụkwọ a. 28Nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi nʼanya Mmụọ Nsọ na nʼanya anyị kwa, na o kwesighị ka anyị bokwasị unu ibu arọ karịa ihe ndị a dị mkpa. 29Ma o kwesiri ka unu hapụ iri ihe ọbụla e jiri chụọ aja nye arụsị, ya na iri anụ ọbụla a nyagburu anyagbu, maọbụ ọbara. Kewapụkwanụ onwe unu site nʼịkwa iko. Ọ bụrụ na unu eme ihe ndị a, unu mere nke ọma. Nọọnụ nke ọma. 30Ya mere, e zipụrụ ha, ha jeruokwa Antiọk. Mgbe ha kpọkọrọ nzukọ ahụ, ha nyere ha akwụkwọ ozi ahụ. 31Mgbe ndị otu ọgbakọ ahụ gụsịrị ya, ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu nʼihi agbamume ha natara. 32Judas na Saịlas, ndị ha onwe ha bụ ndị amụma, kwuru ọtụtụ okwu, iji gbaa ha ume na ime ka okwukwe ndị kwere ekwe guzosie ike. 33Mgbe ha nọnyesịrị ha nwa oge nta, ndị kwere ekwe ji ngọzị nke udo zilaga ha ka ha laghachikwuru ndị zitere ha. 34Ma ọ masịrị Saịlas ịnọtukwu nʼebe ahụ.

Oziọma

Jọn 10:17–28

17Maka nke a ka Nna jiri hụ m nʼanya, nʼihi na ana m atọgbọ ndụ m, ka m wereghachikwa ya ọzọ. 18O nweghị onye ọbụla pụrụ ịnara m ya, kama ana m atọgbọ ya nʼike nke onwe m. Enwere m ikike ịtọgbọ ya, nweekwa ikike iwereghachi ya ọzọ. Anatara m iwu a site nʼaka Nna m.” 19Ọzọkwa, nkewa batara nʼetiti ndị Juu nʼihi okwu ndị a. 20Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu, “Ọ bụ onye mmụọ ọjọọ na-achị ya, onye isi mebiri. Ọ bara uru ige ya ntị?” 21Ma ndị ọzọ na-ekwu, “Okwu ndị a adịghị ka nke onye mmụọ ọjọọ bi nʼime ya. Mmụọ ọjọọ o nwere ike ime ka anya onye kpuru ìsì meghee?” 22Nʼoge ahụ, mmemme icheta mgbe e doro ụlọnsọ ukwu ahụ nsọ ruru na Jerusalem. Ọ bụ oge oke oyi, 23ma Jisọs nọ na-ejegharị nʼụlọnsọ ukwu, nʼịba Solomọn. 24Ndị Juu gbara ya gburugburu sị ya, “Ruo ole mgbe ka ị ga-edebe anyị nʼọnọdụ olileanya? Ọ bụrụ na ị bụ Kraịst ahụ, gwaghee anyị ọnụ.” 25Jisọs zara ha, “Agwara m unu, ma unu ekweghị. Ọrụ m na-arụ nʼaha Nna m na-agba ama banyere m. 26Ma unu ekwenyeghị, nʼihi na unu esoghị nʼigwe atụrụ m. 27Atụrụ m na-anụ olu m. Amaara m ha, ha na-esokwa m. 28Ana m enye ha ndụ ebighị ebi. Ha agaghị ala nʼiyi. Mmadụ ọbụla enwekwaghị ike ịpụnarị ha nʼaka m.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 22 Mee na kalenda nzukọ bụ 4 Jun na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike