Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 3 Jun
Kalenda Ọtọdọks · 21 Mee (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 3 Jun 2027
Tọọzdee · Izu nke 5 nke Ista · Olu 4
Mmemme na ndị nsọ
Meeting of the Vladimir Icon of the Mother of God (established in memory of the deliverance of Moscow from the Tatar invasion led by Crimean Khan Makhmet-Girei in 1521)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
22Mgbe ahụ, Solomọn guzoro nʼihu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, na nʼihu ọgbakọ ụmụ Izrel niile, gbasapụ aka ya abụọ chilie ha elu, 23kwuo sị, “ Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, ọ dịghị Chineke dịka gị nʼeluigwe nke dị nʼelu, maọbụ nʼụwa, nʼokpuru eluigwe. Gị onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya gị na ndị ohu gị, bụ ndị ji obi ha niile na-eso ụzọ gị. 27“Ma ọ bụ ezie na gị Chineke ga-ebi nʼelu ụwa? Lee, eluigwe ọbụladị ebe kachasị elu nke eluigwe, ezughị ịba gị. Olee otu ụlọ a nke m wuru ga-esi bata gị? 28Ma Onyenwe anyị Chineke m, ṅaa ntị nʼekpere ohu gị, na arịrịọ ọ na-arịọ maka ebere. Nụrụ akwa na ekpere nke ohu gị na-ekpe nʼihu gị taa. 29Biko, mee ka anya gị abụọ ghere oghe nʼebe ụlọnsọ ukwu a dị, abalị na ehihie, bụ ebe a i kwuru banyere ya, sị, ‘Aha m ga-adị nʼebe ahụ,’ ka i si otu a nụrụ ekpere nke ohu gị ga-ekpe banyere ebe a. 30Nụrụkwa arịrịọ ohu gị na nke ndị gị Izrel niile, mgbe ọbụla ha chere ihu ha nʼebe a nʼekpere. Biko, site nʼeluigwe bụ ebe obibi gị nụrụ, mgbe ị nụrụ biko, gbagharakwa.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
10Obi na-atọ m ụtọ nke ukwuu nʼime Onyenwe anyị, mkpụrụobi m ga-etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke m. Nʼihi na o werela uwe nzọpụta kpuchie m, werekwa uwe oke ọṅụ nke ezi omume ya yikwasị m nʼahụ. Adị m ka nwoke na-alụ nwanyị ọhụrụ, onye na-emezi isi ya ka ọ dịrị ka nke onye nchụaja. E, adị m ka nwaagbọghọ na-alụ di, nke ji ọla ọma dị iche iche chọọ onwe ya mma. 11Dịka aja dị nʼubi si eme ka ihe a kụrụ nʼubi pupụta, dịka ubi a gbara ogige si eme ka mkpụrụ ubi too, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-esi mee ka ezi omume na otuto pupụta nʼihu mba niile. 62:1Nʼihi Zayọn agaghị m emechi ọnụ, nʼihi Jerusalem agaghị m anọ jii, ruo mgbe ezi omume ya ga-enwuwa dịka ihe ụtụtụ; mgbe nzọpụta ya kwa ga-enwukwa dịka ọwaọkụ na-enwu enwu. 2Mba niile ga-ahụ ezi omume gị. Ndị eze niile ga-ahụkwa ebube gị. A ga-akpọkwa gị aha ọhụrụ ahụ nke ọnụ Onyenwe anyị ga-agụ gị. 3Ị ga-aghọ okpueze nke ịma mma nʼaka Onyenwe anyị, ihe iyi nʼisi nke ndị ụlọeze nʼaka Chineke gị. 4A gakwaghị akpọ gị onye ahapụrụ ahapụ, maọbụ kpọọ ala gị ala tọgbọrọ nʼefu. Ma a ga-akpọ gị Hefziba, kpọkwa ala gị Beula, nʼihi na ihe gị ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ, a ga-alụkwa ala gị dịka nwunye. 5Dịka nwokorobịa si alụrụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, otu a ka Onye na-ewu gị ga-alụ gị, dịka onye lụrụ nwunye ọhụrụ sị aṅụrị ọṅụ nʼebe nwunye ọhụrụ ya nọ, otu a ka Chineke gị ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi gị.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
1“Bilie, mụkee, nʼihi na ìhè gị abịala, ebube Onyenwe anyị awaakwala nʼahụ gị dịka anyanwụ. 2Lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa niile, oke ọchịchịrị na-ekpuchi ndị niile bi nʼụwa, ma Onyenwe anyị ga-awa dịka anyanwụ nʼahụ gị ebube ya ga-achakwa ka ihe nʼebe i nọ. 3Mba niile dị iche iche ga-abịakwute ìhè gị, ndị eze niile ga-abịaru mmụke nke ọwụwa gị. 4“Welienụ anya unu abụọ elu legharịa gburugburu unu, ha niile na-ezukọta na-abịakwute gị; ụmụ gị ndị ikom na-esi nʼebe dị anya bịa, ụmụ gị ndị inyom ka a ga-ekukwa nʼụkwụ. 5Mgbe ahụ, ị ga-elepụ anya ma chakee, obi gị ga-atọ gị ụtọ, saa mbara nʼihi ọṅụ, nʼihi na akụ niile nke osimiri ka a ga-ewebatara gị, akụnụba nke ọtụtụ mba ga-abịara gị. 6Ọtụtụ igwe ịnyịnya kamel nke si Midia na Efaa ga-ejupụta nʼala gị, ma ndị sikwa nʼobodo Sheba ga-ebutere gị ọlaedo na ụda na-esi isi ụtọ. Ha ga-ekwusakwa otuto Onyenwe anyị. 7A ga-enye gị igwe ewu na atụrụ niile nke ndị Keda. Ebule niile nke Nebaiot ga-abụ nke gị. A ga-anabata ha dịka onyinye nʼelu ebe ịchụ aja m. Aga m edozi ụlọnsọ m dị ebube, mee ya ka ọ maa mma karịa. 8“Olee ndị bụ ndị a na-efegharị dịka igwe ojii, ndị na-efegharị dịka ụmụ nduru na-efeba nʼakwụ ha? 9Nʼezie, mụ ka ala ndị ahụ mmiri gbara gburugburu na-echere; ụgbọ niile nke Tashish ga-ebukwa ụzọ, na-ebughachi ụmụ gị site nʼebe dị anya, ha na ọlaọcha na ọlaedo ha niile. Inye Onyenwe anyị bụ Chineke gị nsọpụrụ, Onye nsọ nke Izrel, nʼihi na ọ jirila ịma mma gọzie gị. 10“Ndị mba ọzọ ga-abịa wuziere unu mgbidi unu niile. Ndị na-achị achị na ndị eze ha niile ga-ejere unu ozi. Ọ bụ ezie na m tikpọrọ gị nʼiwe m, ma site nʼamara m, aga m emere gị ebere. 11Ọnụ ụzọ ama gị ga-eghe oghe oge niile site nʼụtụtụ ruo nʼụtụtụ, ịnabata akụ niile si na mba dị iche iche. A ga-edurukwa ndị eze dị iche iche bata nʼime ya nʼọnọdụ ndị a dọtara nʼagha. 12Mba ọbụla jụrụ ijere gị ozi ga-ala nʼiyi; a ga-ekpochapụ ha. 13“Otuto niile na ịma mma niile nke Lebanọn ga-abụ nke gị. Osisi junipa, na osisi fịa, na osisi junipa, na osisi saipres, ka a ga-eji chọọ ụlọnsọ m mma. Aga m emekwa ka ebube jupụta nʼebe ahụ ụkwụ m na-adị mgbe niile. 14Ụmụ ndị na-emegbu gị ga-abịa kpọọ isiala nye gị. Ndị ahụ niile na-elelị gị ga-abịa daa nʼala nʼihu gị sutu ụkwụ gị ọnụ. Ha ga-akpọ Jerusalem, Obodo Onyenwe anyị, Zayọn nke Onye nsọ Izrel. 15“Ọ bụ ezie na ọ dị mgbe ị bụ onye a kpọrọ asị, onye a na-emegbu, onye mmadụ niile na-eweda nʼala, ma ugbu a, ị ga-ama mma ruo ebighị ebi; ị ga-abụ ihe na-ewetara ọgbọ niile nke ụwa ọṅụ, nʼihi na otu a ka m ga-eme gị. 16Ị ga-aṅụ mmiri ara nke mba dị iche iche, ọ bụkwa ara ndị eze ka a ga-eji zuo gị. Mgbe ahụ, ị ga-amata nʼezie na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nzọpụta gị na Onye mgbapụta gị, Onye dị ike nke Jekọb.
Ofufe ụtụtụ: Oziọma (maka Aịkọn Vladimir nke Nne Chineke)
39Nʼoge ahụ, Meri biliri gaa ọsịịsọ nʼotu obodo dị nʼugwu Juda. 40Nʼebe ahụ, ọ banyere nʼụlọ Zekaraya, kelee Elizabet. 41Mgbe Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa nọ ya nʼafọ megharịrị ahụ. E mere ka Elizabet jupụta na Mmụọ nsọ. 42O tiri mkpu nʼoke olu sị, “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ nʼetiti ụmụ nwanyị niile. Onye a gọziri agọzi ka nwa ahụ ị bu nʼafọ bụkwa. 43Onye kwanụ ka m bụ na ihuọma dị otu a kpọrọ m na nne Onyenwe m ga-abịa ileta m? 44Ngwangwa m nụrụ olu ekele gị, nwa nọ m nʼafọ wuliri elu nʼọṅụ. 45Ngọzị ga-adịrị onye ahụ kwere na Onyenwe anyị ga-emezu ihe o kweere ya na nkwa ime.” 46Ma Meri sịrị, “Mkpụrụobi m na-ebuli Onyenwe anyị elu 47mmụọ m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke bụ Onye nzọpụta m, 48nʼihi na o ledatala anya, lekwasị m, bụ odibo ya dị ala. Site ugbu a gaa nʼihu, ọgbọ niile ga-akpọ m onye a gọziri agọzi. 49Nʼihi na Onye dị ike emeelara m ihe dị ukwuu. Aha ya dịkwa nsọ. 56Meri nọnyeere ya ihe dịka ọnwa atọ ma mesie laghachi nʼụlọ ya.
Akwụkwọ ozi
20Ma mgbe ndị na-eso ụzọ bịara gbaa ya gburugburu, o bilitere, laghachikwa nʼime obodo ahụ. Ma nʼechi ya, ya na Banabas sooro gaa Debi. 21Ha zisasịrị oziọma nʼime obodo ahụ, nke mere ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Ha lọghachiri nʼobodo Listra site ya gaa Aikoniọm na Antiọk. 22Nʼebe ahụ ha gbara ndị na-eso ụzọ ume kasịekwa ha obi sị ha jidesie okwukwe ahụ ike. Ha sịrị, “Anyị ga-agabiga ọtụtụ mkpagbu dị iche iche tupu anyị abaa nʼalaeze Chineke.” 23Mgbe ha họpụtachara ndị okenye nʼime nzukọ niile. Ha sitere nʼobubu ọnụ na ekpere tinye ha nʼaka Onyenwe anyị, bụ onye ha kwenyere na ya. 24Ha sitere nʼakụkụ Pisidia garuo Pamfilia. 25Mgbe ha zisachara oziọma nʼobodo Pega, ha gbadara gaa Atalia. 26Site nʼebe ahụ, ha sooro ụgbọ mmiri jeruo Antiọk bụ ebe a nọ nyefee ha nʼamara Chineke nʼihi ọrụ ndị a ha rụzuru. 27Mgbe ha bịaruru, ha kpọkọtara nzukọ kọwara ha ihe niile Chineke sitere nʼaka ha mee, na otu o siri meghe ọnụ ụzọ nke okwukwe nye ndị mba ọzọ.
Akwụkwọ ozi (maka ndị nsọ)
11Ụmụnna m, achọrọ m ime ka unu mata, na oziọma ahụ m kwusaara unu abụghị ihe mmadụ chepụtara nʼuche ya. 12Nʼihi na anataghị m ya site nʼaka mmadụ ọbụla, ọ dịkwaghị onye ọbụla ziri m ya, kama ọ bụ Jisọs Kraịst nʼonwe ya bụ onye kpughere ya nye m. 13Amara m na unu anụla ihe banyere ndụ m nʼoge gara aga, nʼofufe ndị Juu, na otu m si jiri ike kpagbuo nzukọ Chineke nʼebe niile, ma gbalịsiekwa ike ibibi ya. 14Abụ m otu nʼime ndị amaara aha ha nʼetiti ndị ọgbọ m, nʼihe banyere ofufe ndị Juu. Nʼihi oke ịnụ ọkụ nʼobi nke m nwere ịgbaso na idebezu ụkpụrụ omenaala na ofufe, nke nna nna m ha. 15Ma mgbe ọ tọrọ Chineke ụtọ, bụ onye kewapụrụ m iche tupu amụọ m, kpọọ m site nʼamara ya, 16ikpughe Ọkpara ya nʼime m, ka m nwe ike kwusaa ihe banyere ya nʼetiti ndị mba ọzọ, e jekwurughị m anụ ahụ ọbụla ịnụta ihe ọbụla nʼaka ya. 17Ejekwaghị m Jerusalem ịhụ ndị ahụ bu m ụzọ bụrụ ndị ozi, kama a gara m Arebịa, ma laghachikwa azụ na Damaskọs. 18Ọ bụ mgbe afọ atọ gasịrị, ka m gara Jerusalem ịhụ Sefas. Anọnyekwara m ya ụbọchị iri na ise. 19Ma ọ dịkwaghị onyeozi ọzọ m hụrụ, ma ọ bụghị naanị Jemis, nwanne Onyenwe anyị.
Akwụkwọ ozi (maka Aịkọn Vladimir nke Nne Chineke)
5Na mmekọrịta unu na ibe unu, nweenụ ụdị uche ahụ nke dị nʼime Jisọs Kraịst: 6Onye ọ bụ ezie na o nwere ụdịdị Chineke site na mmalite ma ọ gụghị ụdịdị ya dị ka Chineke dị ka ihe ọ ga-ejidesi aka ike. 7Kama, ọ gụrụ onwe ya dị ka ihe efu, site na ịnara ụdịdị nke onye bụ ohu, onye nke a mụrụ dị ka mmadụ. 8Ebe ahụrụ ya ka ọ dịka mmadụ nʼoyiyi, o wedakwara onwe ya ala, site nʼirube isi ruo ọnwụ, bụ ọnwụ nke obe. 9Ọ bụ nʼihi nke a ka Chineke ji bulie ya elu nʼebe kachasị elu, nyekwa ya aha kachasị aha niile elu. 10Ka ọ ga-abụ mgbe ọbụla a kpọrọ aha Jisọs ka ikpere niile ọbụla gbuo nʼala, ihe niile dị nʼeluigwe, ndị niile bi nʼụwa, na ndị bi nʼokpuru ụwa. 11Ka ire niile ọbụla kwupụta na Jisọs Kraịst bụ Onyenwe anyị, maka inye Chineke bụ Nna, otuto.
Oziọma
39Jisọs sịrị, “Ọ bụ nʼihi ikpe ka m ji bịa nʼụwa, ka ndị na-adịghị ahụ ụzọ bido ịhụ ụzọ, na ka ndị na-ahụ ụzọ ghọọ ndị kpuru ìsì.” 40Mgbe ụfọdụ ndị Farisii nọ nso nʼebe ahụ nụrụ nke a, ha sịrị ya, “Anyị onwe anyị, anyị bụkwa ndị kpuru ìsì?” 41Jisọs sịrị ha, “Ọ bụrụ na unu kpuru ìsì, ikpe ọmụma mmehie agaghị ama unu, ma ugbu a ebe unu sị na unu na-ahụ ụzọ ikpe ọmụma unu na-adịgide.” 10:1“Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla na-adịghị esite nʼọnụ ụzọ aba nʼọgba atụrụ kama ọ na-arị elu ka o site nʼelu ụlọ ahụ wufee, bụ onye ohi bụrụkwa onye na-apụnara mmadụ ihe. 2Onye na-esite nʼọnụ ụzọ abanye bụ onye ọzụzụ atụrụ. 3Onye nche ọnụ ụzọ na-emeghere ya ụzọ, atụrụ ya na-anụkwa olu ya. Ọ na-akpọ atụrụ nke ya aha, ma duru ha pụọ. 4Mgbe ọ kpọpụtasịrị ndị niile bụ nke ya, ọ na-aga nʼihu ha. Atụrụ ya na-esokwa ya nʼazụ nʼihi na ha maara olu ya. 5Ha agaghị eso onye ọbịa, kama ha gbaara ya ọsọ. Nʼihi na ha amaghị olu onye ọbịa.” 6Jisọs ji ihe yiri ihe gwa ha okwu. Ma ha aghọtaghị ihe ọ nọ na-agwa ha. 7Ọzọ, Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie, ana m agwa unu, mụ onwe m bụ ọnụ ụzọ ọgba atụrụ ahụ. 8Ndị niile bịara tupu mụ onwe m abịa bụ ndị ohi na ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike. Ụmụ atụrụ aṅakwaghị ha ntị. 9Mụ onwe m bụ ụzọ. Onye ọbụla sitere na m banye, a ga-azọpụta ya. Ọ ga na-apụ na-abata na-achọtakwa nri.
Oziọma (maka ndị nsọ)
1“Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla na-adịghị esite nʼọnụ ụzọ aba nʼọgba atụrụ kama ọ na-arị elu ka o site nʼelu ụlọ ahụ wufee, bụ onye ohi bụrụkwa onye na-apụnara mmadụ ihe. 2Onye na-esite nʼọnụ ụzọ abanye bụ onye ọzụzụ atụrụ. 3Onye nche ọnụ ụzọ na-emeghere ya ụzọ, atụrụ ya na-anụkwa olu ya. Ọ na-akpọ atụrụ nke ya aha, ma duru ha pụọ. 4Mgbe ọ kpọpụtasịrị ndị niile bụ nke ya, ọ na-aga nʼihu ha. Atụrụ ya na-esokwa ya nʼazụ nʼihi na ha maara olu ya. 5Ha agaghị eso onye ọbịa, kama ha gbaara ya ọsọ. Nʼihi na ha amaghị olu onye ọbịa.” 6Jisọs ji ihe yiri ihe gwa ha okwu. Ma ha aghọtaghị ihe ọ nọ na-agwa ha. 7Ọzọ, Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie, ana m agwa unu, mụ onwe m bụ ọnụ ụzọ ọgba atụrụ ahụ. 8Ndị niile bịara tupu mụ onwe m abịa bụ ndị ohi na ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike. Ụmụ atụrụ aṅakwaghị ha ntị. 9Mụ onwe m bụ ụzọ. Onye ọbụla sitere na m banye, a ga-azọpụta ya. Ọ ga na-apụ na-abata na-achọtakwa nri.
Oziọma (maka Aịkọn Vladimir nke Nne Chineke)
38Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ọ banyere nʼotu obodo nta ebe nwanyị a na-akpọ Mata nabatara ya nʼụlọ ya. 39O nwere nwanne nwanyị a na-akpọ Meri nke nọdụrụ ala nʼụkwụ Onyenwe anyị na-ege ntị nʼihe ọ na-ekwu. 40Ma uche Mata gbasasịrị agbasa ebe ọ na-akwado maka ile ọbịa. Ọ bịakwutere ya sị ya, “Onyenwe anyị, ọ bụ na o metụghị gị nʼobi na nwanne m nwanyị hapụrụ naanị m ije ozi niile? Gwa ya ka ọ bịa nyere m aka.” 41Ma Onyenwe anyị zara ya sị, “Mata, Mata, ị na-echegbu onwe gị ma na-adọgbukwa onwe gị banyere ọtụtụ ihe, 42maọbụ naanị otu ihe dị mkpa, Meri ahọrọla nke ka mma, nke a na-agaghị anapụkwa ya.” 11:27Mgbe ọ kpụ okwu a nʼọnụ, otu nwanyị sitere nʼime igwe mmadụ ahụ tie mkpu sị, “Ngọzị na-adịrị afọ mụrụ gị na ara nke e jiri zụọ gị.” 28Ma ọ sịrị, kama, “Ngọzị na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke, na-emekwa ha.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 21 Mee na kalenda nzukọ bụ 3 Jun na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike