Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 4 Jun
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 4 Jun 2027
Fraịdee · Izu nke 9 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Obi Kachasị Nsọ nke Jisọs
Mmemme ukwu · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1“Mgbe Izrel bụ nwantakịrị, ahụrụ m ya nʼanya, ọ bụkwa site nʼIjipt ka m kpọpụtara nwa m. 3Ọ bụ mụ onwe m kuziiri Ifrem otu e si aga ije, ejidere m ha nʼaka m abụọ, ma ha amaghị na ọ bụ mụ onwe m gwọrọ ya. 4Eji m ụdọ nke mmadụ bụ ebere, na ịhụnanya duo ya. Adịrị m ha dịka onye nʼebuli ibu arọ site nʼolu ha, ehulatakwara m ala, were aka m tinye ha nri nʼọnụ. 8“M ga-esi aṅaa rara gị nye, gị Ifrem? M ga-esi aṅaa rara gị nye, gị Izrel? M ga-esi aṅaa mee gị ka ịdị ka Adma? M ga-esi aṅaa meso gị dịka Zeboiim? Obi m na-akwasị akwa ike nʼime m; ọ na-agụsị m agụụ ike inyere unu aka. 9Agaghị m emezu iwe ọkụ m maọbụ bibiekwa Ifrem ọzọ. Nʼihi na abụ m Chineke, abụghị m mmadụ. Abụ m Onye Nsọ na-ebi nʼetiti unu. Agaghị m emegidekwa obodo ha.
Abụ Ọma nzaghachi
2Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m; aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m. Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m, ọ ghọrọla m onye nzọpụta.” 3Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmiri site nʼolulu mmiri nke nzọpụta. 4Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwukwa sị, “Nyenụ Onyenwe anyị otuto, Kwupụtakwa aha ya; meenụ ka amata nʼetiti mba niile ihe niile ọ rụrụ; kwusaanụ na aha ya bu ihe e buliri elu. 5Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o meela oke ihe dị ebube. Meekwanụ ka ụwa niile mara ihe ọ rụrụ. 6Ka ndị niile bi na Zayọn tie mkpu ọṅụ, bụkwaa abụ. Nʼihi na Onye nsọ nke Izrel. dị ukwuu, e, ọ dị ike nke ukwuu, bụ Onye ahụ na-ebi nʼetiti unu.”
Ihe ọgụgụ nke abụọ
8Ọ bụ ezie na mụ bụ onye dịkarịsịrị nta nʼetiti ndị nsọ niile, e nyere m amara nke a, ikwusara ndị mba ọzọ oziọma banyere akụ nke enweghị atụ nke juru nʼime Kraịst, 9meekwa ka mmadụ niile hụ ihe bụ atụmatụ nke ihe omimi e zoro nʼime Chineke onye kere ihe niile, ọtụtụ afọ. 10Ka ọ ga-abụ site na chọọchị, a ga-eme ka amamihe Chineke nʼụdị dị iche iche bụrụ ihe ọchịchị na ikike niile dị nʼeluigwe ga-amata. 11Nke a bụ nʼusoro nke atụmatụ ya dị ebighị ebi, nke e mezuru nʼime Jisọs Kraịst Onyenwe anyị, 12bụ onye anyị nwere ntụkwasị obi na obi siri ike ịbịakwute site nʼokwukwe anyị nwere na ya. 14Ọ bụ nʼihi nke a ka m na-egbu ikpere m nʼala nʼihu Nna anyị, 15onye ezinaụlọ niile dị nʼụwa a na nke dị nʼeluigwe na-esite nʼaka ya enwe aha. 16Ekpere m bụ ka o site nʼịba ụba nke otuto ya, nye unu ike na-esite na Mmụọ ya, mee ka unu dị ike nʼime mmụọ unu; 17ka Kraịst nwee ike biri nʼobi unu site nʼokwukwe, ka unu ndị gbanyere mgbọrọgwụ guzosiekwa ike nʼịhụnanya. 18Ana m arịọkwa, ka unu na ndị nsọ niile nwee ike ịghọta ihe bụ obosara, ogologo, ịdị elu na ịdị omimi, 19na ịmatakwa ịhụnanya nke Kraịst nke karịrị amamihe, ka unu jupụtakwa nʼizuoke niile nke Chineke.
Oziọma
31Ma ndị Juu achọghị ka ahụ ndị ahụ a kpọgidere nʼobe nọgide nʼebe ahụ ka chi bọọ, nʼihi na ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe. Echi ya bụ ga-abụ ụbọchị izuike pụrụ iche. Ha rịọọrọ Pailet ka a gbajisie ha ụkwụ ma bupụkwa ahụ ha. 32Ndị agha ahụ bịara gbajie ụkwụ onye nke mbụ na onye nke ọzọ a kpọgburu ha na ya. 33Ma mgbe ha bịaruru nʼebe Jisọs nọ, ha hụrụ na ọ nwụọlarị. Nʼihi nke a, ha agbajighị ụkwụ ya. 34Kama otu onye nʼime ndị agha ahụ weere ùbe mapuo ya akụkụ ya. Ngwangwa ọbara na mmiri gbapụtara. 35Onye hụrụ ihe ndị a gbara ama ka unu kwere, ama ya bụ eziokwu, ọ matakwara na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu. 36Ihe ndị a niile mere ka e mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, “Ọ dịghị ọkpụkpụ ya ọbụla nke a ga-agbaji.” 37E dekwara nʼebe ọzọ nʼakwụkwọ sị, “Ha ga-elegide onye ahụ ha mapuru ahụ anya.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike