Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 30 Mee
Kalenda Ọtọdọks · 17 Mee (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 30 Mee 2027
Sọnde · Olu 4
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 5 nke Ista
Sọnde nke Nwanyị Sameria
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 7
1Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe chi na-abọzibeghị nke ọma, Meri Magdalin bịara nʼili ahụ, ma hụ na e wepụla nkume ahụ e jiri mechie ọnụ ili ahụ. 2O ji ọsọ bịakwute Saimọn Pita na onye ọzọ ahụ nke na-eso ụzọ ya, bụ onye Jisọs hụrụ nʼanya sị, “Ha esitela nʼili ahụ bupụ Onyenwe anyị. Anyị amaghị ebe ha dobere ya!” 3Ya mere Pita na onye nke ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya pụrụ gawa nʼili ahụ. 4Ha abụọ jiri ọsọ na-aga, ma onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya gbakarịrị Pita nʼọsọ buru ya ụzọ ruo nʼili ahụ. 5O hulatara ala, nyoo anya nʼime ili, hụ akwa ọcha ahụ ebe ha wụsara nʼala, ma ọ baghị nʼime. 6Ya mere Saimọn Pita, onye na-eso ya nʼazụ bịarutere banye nʼime ili ahụ. Ọ hụrụ akwa ozu ahụ ka ọ wụsara nʼala, 7ya na akwa nke e ji kechie ya isi. Ịchafọ a na akwa ọcha ahụ adịkọtaghị nʼotu ebe, kama a pịara ya apịa dobe ya iche nʼebe ọzọ. 8Onye ọzọ ahụ nke na-eso ụzọ ya, onye nke buru ụzọ bịaruo nʼili banyekwara nʼime ili ahụ. Ọ hụrụ ma kwerekwa. 9(Ruo nʼoge a, ha aghọtabeghị site nʼakwụkwọ nsọ na ọ ghaghị i si nʼọnwụ bilie.) 10Emesịa ndị na-eso ụzọ ya laghachiri nʼụlọ ha.
Akwụkwọ ozi
19Ugbu a, ndị ahụ niile gbasasịrị nʼihi mkpagbu ahụ bidoro mgbe a tụgburu Stivin na nkume, jeruru akụkụ Fonisia na Saiprọs na Antiọk na-ekwusa oziọma ahụ naanị nʼetiti ndị Juu. 20Ma otu ọ dị, ụfọdụ nʼime ndị ikom ndị ahụ sitere nʼakụkụ Saiprọs na Sirini gara Antiọk, malite ikwusara ndị Griik oziọma banyere Onyenwe anyị Jisọs. 21Onyenwe anyị gọziri mgbalị ha niile. Nʼihi na ọtụtụ mmadụ chegharịrị kwere nʼOnyenwe anyị. 22Mgbe nzukọ dị na Jerusalem nụrụ ihe ndị a, ha zipụrụ Banabas ka ọ gaa Antiọk. 23Mgbe o rutere, hụ ihe amara Chineke rụrụ nʼetiti ha. Ọ ṅụrịrị ọṅụ, mgbakwaa ha niile ume, gwa ha ka ha were obi ha niile nọgide nʼime Onyenwe anyị. 24Ọ bụ ezigbo mmadụ, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ na okwukwe. O nwekwara okwukwe dị ebube, nʼihi ya ọtụtụ mmadụ chegharịkwara bịakwute Onyenwe anyị. 25Emesịa, ọ gara Antiọk obodo Tasọs ịchọ Sọl. 26Mgbe ọ chọpụtara ya, o duuru ya bịa nʼAntiọk. Ihe ha ka otu afọ, ka ha na-ezukọ nʼụlọ chọọchị na-akụziri ọtụtụ igwe mmadụ ihe. Ọ bụ nʼime Antiọk ka e buru ụzọ kpọọ ndị na-eso ụzọ ya ndị Kraịst. 29Ndị na-eso ụzọ ya kwekọrịtara ịtụkọta na iziga onyinye dị iche iche nye ndị kwere ekwe nọ na Judịa. Onye ọbụla nyekwara ihe dịka o nwere ike. 30Ha mere nke a, ha zigara ndị okenye ihe ha tụkọtara, site nʼaka Banabas na Sọl.
Oziọma
5Ya mere, ọ batara nʼotu obodo nta dị na Sameria a na-akpọ Saika, nʼakụkụ ala ahụ Jekọb nyere Josef nwa ya nwoke. 6Olulu mmiri Jekọb dị nʼebe ahụ, ma ebe ọ bụ na ike gwụrụ Jisọs nʼije ya, ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ olulu mmiri ahụ. Ọ bụ ihe dị ka oge ehihie. 7Otu nwanyị onye Sameria bịara ịdọrọ mmiri, Jisọs sịrị ya, “Nyetụ m mmiri ka m ṅụọ.” 8(Ndị na-eso ụzọ ya abaala nʼime obodo ịga zụta nri.) 9Nwanyị ahụ sịrị ya, “Olee otu gị bụ onye Juu si arịọ m bụ nwanyị Sameria mmiri ka ị ṅụọ?” (Nʼihi na ndị Juu na ndị Sameria anaghị emekọrịta ihe ọbụla.) 10Jisọs zara sị, “Ọ bụrụ na ị matara onyinye Chineke, na onye ahụ na-arịọ gị mmiri, ị gaara arịọ ya, ọ gakwara enye gị mmiri nke ndụ.” 11Nwanyị ahụ sịrị ya, “Nna anyị ukwu, o nweghị ihe ọbụla i ji ị ga-eji dọrọ mmiri, olulu a dịkwa omimi. Oleekwanụ ebe ị ga-eweta mmiri ndụ a. 12Ọ bụ na ị ka nna nna anyị Jekọb ukwuu, onye gwuuru anyị olulu mmiri a? Ya onwe ya na ụmụ ya na igwe ehi na atụrụ ya ṅụkwara mmiri sitere na ya?” 13Jisọs zara sị, “Onye ọbụla ṅụrụ mmiri a, akpịrị ga-akpọ ya nkụ ọzọ. 14Ma onye ọbụla ga-aṅụ mmiri ahụ m nyere ya, akpịrị agaghị akpọkwa ya nkụ ọzọ. Nʼeziokwu, mmiri ahụ m nyere ya ga-aghọrọ ya isi iyi nke na-asọpụtara ya ndụ ebighị ebi.” 15Mgbe ahụ nwanyị ahụ sịrị ya, “Onyenwe anyị nye m mmiri a, ka akpịrị ghara ịkpọ m nkụ ọzọ, ka m gharakwa ịdị na-abịa ebe a ịdọrọ mmiri.” 16Ọ gwara ya sị, “Gaa kpọta di gị ma lọghachi.” 17Nwanyị ahụ zaghachiri ya sị, “Enweghị m dị.” Jisọs sịrị ya, “I kwuru eziokwu mgbe ị sịrị na i nweghị di. 18I nweela di ise, ma nwoke gị na ya bi ugbu a abụghị di gị. Ihe kwuru bụ nnọọ eziokwu.” 19Nwanyị ahụ sịrị ya “Nna anyị ukwu, ahụrụ m na ị bụ onye amụma. 20Nna nna anyị ha fere ofufe nʼugwu a, ma unu na-ekwu nʼebe ndị mmadụ ga-eferịrị ofufe bụ naanị na Jerusalem.” 21Jisọs sịrị ya, “Nwanyị kwere okwu m, oge na-abịa mgbe ị na-agaghị akpọ isiala nye Nna, maọbụ nʼugwu a ma ọ bụkwanụ na Jerusalem. 22Unu na-efe ihe unu na-amaghị ma anyị na-efe ihe anyị matara, nʼihi na nzọpụta sitere nʼaka ndị Juu. 23Ma oge na-abịa, ugbu a ọ bịala, mgbe ndị na-efe Nna ahụ nʼeziokwu ga-efe ya nʼime mmụọ na nʼeziokwu. Nʼihi na ọ bụ ndị dị otu a ka Nna chọrọ ka ha na-efe ya. 24Chineke bụ mmụọ ndị niile na-efe ya ga-eferịrị ya nʼime mmụọ na eziokwu.” 25Nwanyị ahụ sịrị ya, “Amaara m na Mezaya” (onye a na-akpọ Kraịst) “na-abịa. Mgbe ọ bịara, ọ ga-akọwaziri anyị ihe niile.” 26Jisọs sịrị ya, “Mụ, onye na-agwa gị okwu, abụ m ya.” 27Nʼoge ahụ ndị na-eso ụzọ ya lọghachitara. Ọ gbagwojukwara ha anya nke ukwuu ịhụ na ya na nwanyị na-ekwurịta okwu. Ma o nweghị onye nʼime ha jụrụ nwanyị ahụ sị, “Gịnị ka ị chọrọ?” ma ọ bụkwanụ, “Gịnị kpatara gị na ya ji na-ekwurịta okwu?” 28Mgbe ahụ, nwanyị ahụ hapụrụ ite mmiri ya laghachi nʼime obodo ga gwa ndị mmadụ, 29“Bịanụ lee otu nwoke onye gwara m ihe niile m merela. Ọ ga-abụ na ọ bụ ya bụ Kraịst ahụ?” 30Ha sitere nʼobodo ahụ gbapụtasịa soro ụzọ ahụ, ka ha gakwuru ya. 31Ma otu ọ dị, ndị na-eso ụzọ ya rịọrọ ya sị, “Onye ozizi rienụ nri.” 32Ma ọ sịrị ha, “Enwere m nri m na-eri nke unu na-amaghị maka ya.” 33Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ ya sịrịtara onwe ha, “Ọ ga-abụ na o nwere onye butere ya nri?” 34Jisọs sịrị ha, “Nri m bụ ime uche onye ahụ zitere m nakwa ịrụcha ọrụ ya. 35Unu na-asị, ‘ọ fọdụghị ọnwa anọ ka ịghọ mkpụrụ nʼubi ruo?’ Ma ana m agwa unu, megheenụ anya unu lee ubi ahụ, ha achaala maka ọghụghọ. 36Ọ bụladị ugbu a, onye na-aghọ mkpụrụ na-anata ụgwọ ọrụ, ọ na-achịkọta mkpụrụ ahụ maka ndụ ebighị ebi, ka onye ghara mkpụrụ na onye ghọrọ ya nwee ike ịṅụrịkọta ọṅụ. 37Ya mere okwu ahụ nke na-asị, ‘Otu onye na-agha mkpụrụ, onye ọzọ na-aghọkwa ya bụ eziokwu.’ 38E zigara m unu ka unu gaa ghọta ihe unu na-arụghị ọrụ maka ya. Ndị ọzọ rụrụ ọrụ a, ma unu ewe uru dị nʼọrụ ha.” 39Ọtụtụ ndị obodo Sameria kweere na ya nʼihi ama ahụ nwanyị ahụ gbara, “Ọ gwara m ihe niile m mere.” 40Ya mere mgbe ndị Sameria bịakwutere ya, ha rịọrọ ya ka ọ nọnyetụrụ ha, ọ nọnyekwaara ha ụbọchị abụọ. 41Ọtụtụ ndị ọzọ kwerekwara na ya nʼihi okwu ya. 42Ha gwara nwanyị ahụ, “Ihe anyị jiri kwere ugbu a abụghị ihe i kwuru, kama ọ bụ nʼihi na anyị onwe anyị anụla olu ya, matakwa na onye a bụ Onye nzọpụta nke ụwa nʼeziokwu.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 17 Mee na kalenda nzukọ bụ 30 Mee na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike