Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 29 Mee

Kalenda Ọtọdọks · 16 Mee (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 29 Mee 2027

Satọdee · Izu nke 4 nke Ista · Olu 3

Mmemme na ndị nsọ

Venerable Theodore the Sanctified († 368)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Ọrụ 12:1–11

1Nʼoge ahụ, eze Herọd jidere ụfọdụ ndị so na chọọchị buru nʼobi ịkpagbu ha. 2O jiri mma agha gbuo Jemis nwanne Jọn. 3Mgbe ọ chọpụtara na omume ya tọrọ ndị Juu ụtọ, ọ gara nʼihu jidekwa Pita. Nke a mere nʼoge mmemme Achịcha Ekoghị eko. 4Mgbe o jidere ya, o tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ ebe o mere ka ndị agha chee ya nche, ndị agha anọ nʼotu oge, ndị agha anọ ọzọ nʼoge nke ọzọ. Ebumnobi ya bụ ịkpọpụta ya nʼihu ọha mmadụ kpee ya ikpe mgbe Mmemme Ngabiga gasịrị. 5Mgbe e debere Pita nʼụlọ mkpọrọ, nzukọ esepụghị aka nʼikpe ekpere nʼihi ya nye Chineke. 6Ma nʼabalị na-esota ụbọchị ahụ Herọd ga-akpụpụta ya, Pita nọ nʼụra nʼetiti ndị agha abụọ, e jiri eriri igwe kee ya nʼụkwụ nʼaka, ma ndị nche ọzọ nọkwa nʼọnụ ụzọ na-eche ya nche. 7Na mberede mmụọ ozi Onyenwe anyị bịara guzoro nʼebe ahụ, ìhè nwukwara nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ. Ọ kutụrụ Pita aka nʼakụkụ sị, “Ngwangwa, bilie ọtọ!” Eriri igwe ahụ dapụrụ nʼaka ya. 8Mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Yiri uwe gị na akpụkpọụkwụ gị.” O mere otu ahụ, Mmụọ ozi ahụ gwakwara ya, “Yirikwa akwa mgbokwasị gị soro m.” 9Pita sooro ya nʼazụ, o chere na ọ na-ahụ ọhụ, ma ọ mataghị na ihe mmụọ ozi ahụ na-eme bụ ezie. 10Ha gafere ndị nche nke mbụ na nke abụọ rute nʼọnụ ụzọ e si abanye nʼime obodo, nke bụ ọnụ ụzọ igwe. Ọnụ ụzọ igwe ahụ meghekwara nʼonwe ya, ha esite na ya gafee. Mgbe ha gara ije ruo ebe tere anya nʼama nke ọzọ, ngwangwa mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya. 11Mgbe ahụ kwa ka Pita ghọtara ihe niile mere. O kwuru, “Ugbu a, amatala m nʼezie, na Onyenwe anyị ezitela mmụọ ozi ya, ka ọ bịa zọpụta m site nʼaka eze Herọd na ihe niile ndị Juu na-atụ anya ya. Ugbu a ọ napụtakwala m site nʼọchịchọ ọjọọ niile nke ndị Juu.”

Oziọma

Jọn 8:31–42

31Jisọs gwara ndị Juu ndị kwere na ya, “Ọ bụrụ na unu anọgide nʼokwu m nʼezie unu ga-abụ ndị na-eso ụzọ m. 32Unu ga-amatakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.” 33Ha zara ya, “Anyị bụ ụmụ Ebraham, o nwebeghị oge anyị ji bụrụ ohu onye ọbụla. Olee otu i si na-asị na a ga-eme ka anyị nwere onwe anyị?” 34Jisọs zara ha, “Nʼezie, nʼezie asị m unu, onye ọbụla na-eme mmehie bụ ohu mmehie. 35Ohu enwekwaghị ọnọdụ mgbe ọbụla nʼezinaụlọ, ma ọkpara nwere ọnọdụ ruo ebighị ebi. 36Ya mere, ọ bụrụ na Ọkpara ahụ emee ka unu nwere onwe unu nʼezie, unu ga-abụ ndị nwere onwe unu. 37Ama m na unu bụ ụmụ ụmụ Ebraham, ma unu na-achọ igbu m nʼihi na okwu m enweghị ọnọdụ nʼime unu. 38Ana m ekwu ihe m hụrụ nʼebe Nna m nọ, ma unu na-eme ihe unu nụrụ site nʼaka nna unu.” 39Ha zara ya, “Ebraham bụ nna anyị.” Jisọs sịrị ha, “Ọ bụrụ na unu bụ ụmụ Ebraham, unu gara na-arụ ọrụ Ebraham rụrụ. 40Ma unu na-achọ igbu m, bụ onye gwara unu eziokwu ahụ m nụrụ nʼebe Chineke nọ. Ebraham emeghị otu a. 41Unu na-arụ ọrụ nna unu rụrụ.” Ha sịrị ya, “Anyị abụghị ụmụ a mụrụ site nʼịkwa iko; naanị Chineke ya onwe ya bụ otu Nna anyị nwere.” 42Jisọs gwara ha, “Ọ bụrụ nʼezie na Chineke bụ Nna unu, unu ga-ahụ m nʼanya, nʼihi na ọ bụ Chineke zitere m. Abịaghị m site nʼike aka m.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 16 Mee na kalenda nzukọ bụ 29 Mee na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike