Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 30 Mee
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 30 Mee 2027
Sọnde · Izu nke 9 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 9 nke Oge Nkịtị
Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
12Debe ụbọchị izuike site nʼido ya nsọ, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu. 13Nʼime ụbọchị isii ka ị ga-eje ozi gị niile. Ọ bụkwa nʼime ha ka ị ga-arụzu ọrụ gị niile, 14ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izuike nke Onyenwe anyị Chineke gị. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, gị onwe gị, nwa gị nwoke na nwa gị nwanyị, onye ọrụ gị nwoke, onye ọrụ gị nwanyị, ehi gị, ịnyịnya ibu gị maọbụ anụ ụlọ gị ọbụla, ọ bụladị onye ọbịa bi nʼobodo gị, ka ohu gị nwoke na ohu gị nwanyị zuru ike dịka gị onwe gị si ezu ike. 15Ị ga-echetakwa na ị bụ ohu nʼala Ijipt, ma Onyenwe anyị Chineke mere ka i si nʼohu pụta. Ọ bụ ike ya dị ukwuu ka o ji napụta gị. Ọ bụ ya mere Onyenwe anyị Chineke gị ji nye iwu na ị ga-edebe ụbọchị izuike nsọ.
Abụ Ọma nzaghachi
2Bidonụ iti egwu, kụọ ihe iti egwu, kpọọnụ ụbọ akwara na-enye abụ ụtọ na une. 3Fụọnụ opi ike nʼoge ọnwa ọhụrụ, na mgbe ọnwa gbapụtara nʼuju ya, nʼụbọchị mmemme anyị; 4nke a bụ iwu dịrị Izrel, ụkpụrụ Chineke nke Jekọb. 5O mere ka o guzosie ike dịka iwu nye Josef mgbe ọ pụrụ imegide Ijipt. Anụkwara m olu nʼasụsụ nke m na-amaghị, ka ọ na-asị: 6“Ewezugala m ibu arọ site nʼubu ha; aka ha abụọ nwere onwe ha site nʼịrụ ọrụ. 7Nʼime ihe mgbu unu, unu kpọrọ oku, anapụtara m unu, azara m unu site nʼegbe eluigwe; anwara m unu na mmiri nke Meriba. Sela 9Unu agaghị enwe chi ndị mba ọzọ nʼetiti unu; unu agaghị akpọkwa isiala nye chi si ala ọzọ. 10Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt. Meghe ọnụ unu ka ọ saa mbara, aga m emeju ya.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
6Nʼihi na ọ bụ Chineke ahụ sịrị, ka ìhè si nʼọchịchịrị chawapụta; bụkwa onye mere ka ìhè ya nwuwa nʼime obi anyị. Nke a ka o mere iji wetara anyị ìhè amamihe nke ebube Chineke nʼihu Kraịst. 7Anyị onwe anyị bụ ndị natara akụ nke dị oke ọnụahịa dị nʼime ite ụrọ, iji gosi na ike kacha elu si nʼaka Chineke, ọ bụghị nʼaka anyị. 8A na-akpagbu anyị nʼakụkụ niile, ma adịghị emeri anyị. Mgbe ụfọdụ, anyị nọ na mgbagwoju anya ma anyị adịghị ada mba. 9A na-esogbu anyị, ma adịghị ahapụ naanị anyị; mgbe ụfọdụ, a na-akụtu anyị nʼala ma adịghị ala anyị nʼiyi. 10Ọtụtụ mgbe, anyị na-ebugharị nʼahụ anyị ọnwụ Jisọs, ka ndụ nke Jisọs nwekwa ike pụta ìhè nʼahụ anyị. 11Mgbe ọbụla anyị dị ndụ, anyị nọ nʼọnwụ nʼihi Jisọs, ka ndụ Jisọs nwee ike pụta ìhè nʼahụ anyị pụrụ ịnwụ anwụ.
Oziọma
23Otu ụbọchị izuike, ya na ndị na-eso ụzọ ya na-agafe nʼubi a kụrụ ọka. Dị ka ha na-agafe, ndị na-eso ụzọ ya malitere ịghọ ụfọdụ ogbe ọka nʼime ọka ndị ahụ. 24Ndị Farisii siri ya, “Lee, gịnị mere ha ji na-eme ihe megidere iwu nʼụbọchị izuike.” 25Ma ọ sịrị ha, “Unu agụtaghị ihe Devid na ndị so ya mere mgbe agụụ gụrụ ha? 26Nʼoge Abịata bụ onyeisi nchụaja, ọ banyere nʼụlọ Chineke taa achịcha e chere nʼihu ya, nke ziri ezi na ọ bụ naanị ndị nchụaja kwesiri ịta ya. O nyetụkwara ndị ya na ha so.” 27Mgbe ahụ, ọ gwakwara ha sị, “E mere ụbọchị izuike maka mmadụ, emeghị mmadụ maka ụbọchị izuike.” 28Ya mere, Nwa nke Mmadụ bụ Onyenwe ọ bụladị ụbọchị izuike. 3:1Nʼoge ọzọ, ọ banyere nʼụlọ ekpere, otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ nọkwa nʼebe ahụ. 2Ụfọdụ ha nọ na-achọ ụzọ ha ga-esi boo ya ebubo, ya mere ha lekwasịrị ya anya ịhụ ma ọ ga-agwọ ya ọrịa nʼụbọchị izuike. 3Ma ọ gwara nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị, “Bilie guzoro nʼetiti ebe a.” 4Mgbe ahụ ọ jụrụ ha sị, “Olee nke ziri ezi nʼiwu ime nʼụbọchị izuike: ọ bụ ime ezi ihe ka ọ bụ ime ihe ọjọọ, ịzọpụta ndụ ka ọ bụ ịla ndụ nʼiyi?” Ma ha gbachiri nkịtị. 5O lere ha anya nʼiwe, o wutere ya nʼihi na obi ha kpọrọ nkụ. Ọ sịrị nwoke ahụ, “Setịpụ aka gị.” O setịpụrụ aka ya, aka ya dizikwara nke ọma. 6Ngwangwa, ndị Farisii sitere nʼebe ahụ pụọ nʼiwe. Gaa soro ndị otu Herọd gbaa izu otu ha ga-esi laa ya nʼiyi.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike