Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 31 Mee

Kalenda Ọtọdọks · 18 Mee (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 31 Mee 2027

Mọnde · Izu nke 5 nke Ista · Olu 4

Mmemme na ndị nsọ

Commemoration of the Holy Fathers of Seven Ecumenical Councils

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Ọrụ 12:12–17

12Mgbe ọ ghọtara ihe merenụ, ọ gawara nʼụlọ Meri nne Jọn onye a na-akpọkwa Mak, ebe ọtụtụ mmadụ zukọtararị na-ekpe ekpere. 13Mgbe ọ kụrụ aka nʼọnụ ụzọ ama, otu odibo nwanyị aha ya bụ Roda bịara ka o zaa ya. 14Mgbe ọ nụrụ olu Pita, ọṅụ juru ya obi nke mere na ọ gbaara ọsọ laghachi azụ nʼemegheghị ụzọ. Ọ gara tisaa, “Ọ bụ Pita nọ nʼọnụ ụzọ!” 15Ha sịrị ya na ọ na-ekwu okwu dịka onye uche ya na-ezughị oke. Mgbe ọ nọgidesịrị ike na-ekwu otu ihe ahụ, ha sịrị, “Ọ ghaghị ị bụ mmụọ ozi ya.” 16Ma Pita nọgidere na-akụ aka nʼụzọ. Mgbe ha meghere ụzọ hụ ya, ọ gbagwojuru ha anya. 17O feere ha aka ka ha mechie ọnụ. Ọ kọọrọ ha otu Onyenwe anyị si dupụta ya site nʼụlọ mkpọrọ. Ọ gwara ha, “Meenụ ka Jemis na ụmụnna anyị niile mata ihe ndị a.” Ọ pụrụ gawa ebe ọzọ.

Oziọma

Jọn 8:42–51

42Jisọs gwara ha, “Ọ bụrụ nʼezie na Chineke bụ Nna unu, unu ga-ahụ m nʼanya, nʼihi na ọ bụ Chineke zitere m. Abịaghị m site nʼike aka m. 43Gịnị mere unu adịghị aghọta ihe m na-ekwu? Ọ bụ na unu enweghị ike ịnabata okwu m. 44Unu bụ ụmụ nke nna unu ekwensu. Uche unu bụ imezu ihe nke nna unu na-achọ. Ọ bụ ogbu ọchụ site na mbụ. Ọ dịghị ejigide eziokwu nʼihi na eziokwu adịghị nʼime ya. Mgbe ọ na-ekwu okwu ụgha, ọ na-ekwu dị ka ọdịdị ya sịrị dị, nʼihi na ọ bụ onye ụgha bụrụkwa nna nke ụgha. 45Ma nʼihi na m na-ekwu eziokwu, ọ bụ ya mere unu ekwenyeghị na m. 46O nwere onye nʼime unu pụrụ ịtụ m mmehie m nʼihu? Ọ bụrụ na m na-ekwu eziokwu, gịnị mere unu ekwenyeghị na m? 47Onye ọbụla sitere na Chineke na-anụ ihe Chineke na-ekwu. Ihe kpatara unu adịghị anụ bụ maka unu abụghị ndị nke Chineke.” 48Ndị Juu zara sị, “Anyị e kwughị eziokwu mgbe anyị sịrị na ị bụ onye Sameria, na mmụọ ọjọọ bikwa nʼime gị?” 49Jisọs zaghachiri, “Mmụọ ọjọọ ọbụla adịghị nʼime m, kama ana m asọpụrụ Nna m, ma unu adịghị asọpụrụ m. 50Anaghị m achọ otuto nke onwe m, kama ọ dị onye nke na-achọ ya. Ọ bụkwa ya bụ onye ikpe. 51Nʼezie, nʼezie, agwa unu, onye ọbụla na-edebe okwu m agaghị anwụ ọzọ.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 18 Mee na kalenda nzukọ bụ 31 Mee na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike