Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 27 Mee

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 27 Mee 2027

Tọọzdee · Izu nke 8 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Ahụ na Ọbara Kachasị Nsọ nke Kraịst

Mmemme ukwu · Agba ofufe: ọcha

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọpụ 24:3–8

3Mgbe ahụ, Mosis bịara gwa ndị Izrel okwu niile na iwu niile Onyenwe anyị nyere. Ha niile zaghachiri ya nʼotu olu sị, “Anyị ga-emezu ihe niile Onyenwe anyị kwuru.” 4Mosis deturu ihe niile Onyenwe anyị kwuru. Nʼisi ụtụtụ echi ya, o biliri wuo ebe ịchụ aja na ndịda ugwu ahụ. O gwunyere ogidi nkume iri na abụọ nke nọchiri anya ebo iri na abụọ ụmụ Izrel. 5Mosis zipụtara ụmụ okorobịa Izrel, ndị chụrụ aja nsure ọkụ ma werekwa ụmụ oke ehi chụọ aja udo nye Onyenwe anyị. 6Mosis tinyere ọkara ọbara ehi ndị ahụ nʼime efere. Ma o fesara ọkara ọbara nke fọdụrụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ. 7Emesịa, Mosis guzoro nʼebe ahụ gụpụta na ntị mmadụ niile, ihe dị nʼAkwụkwọ Ọgbụgba ndụ ahụ. Mgbe ụmụ Izrel nụrụ ya, ha weere otu olu kwuo sị, “Anyị anụla, anyị ga-eme ihe niile Onyenwe anyị kwuru. Anyị ga-erube isi.” 8Mgbe ahụ, Mosis weere ọbara ahụ dị nʼime efere, fesaa ya nʼahụ ndị ahụ niile, sị, “Nke a bụ ọbara ọgbụgba ndụ ahụ nke dị nʼetiti unu na Onyenwe anyị, dịka okwu niile ndị a si dị.”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 116:12–13, 15–18

12Gịnị ka m ga-enyeghachi Onyenwe anyị nʼihi mmeso ọma niile o mesoro m? 13Aga m eweli iko nke nzọpụta m elu kpọkuokwa aha Onyenwe anyị. 15Ọnwụ nke ndị nsọ ya dị oke ọnụahịa nʼanya Onyenwe anyị. 16O Onyenwe anyị, nʼezie, abụ m ohu gị; abụ m ohu gị, nwa nwoke nke ohu gị nwanyị; ị zọpụtala m site na agbụ e kere m. 17Aga m achụrụ gị aja ekele kpọkuokwa aha Onyenwe anyị. 18Ọ bụkwa nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ kwụghachi Onyenwe anyị nkwa m kwere,

Ihe ọgụgụ nke abụọ

Hib 9:11–15

11Mgbe Kraịst bịara dị ka onyeisi nchụaja nke ezi ihe ahụ dị ugbu a, site nʼụlọ ikwu dị ukwuu zuruoke nke a na-ejighị aka mee, nke na-esoghị nʼihe e kere eke, 12o jighị ọbara ụmụ ewu na nke ụmụ ehi banye nʼebe ahụ, kama o ji ọbara nke ya onwe ya banye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ naanị otu mgbe, jiri ya wetara anyị niile mgbapụta ebighị ebi. 13Ma ọ bụrụ na ọbara ewu na nke oke ehi dị iche iche, ya na ntụ nwa agbọghọ ehi, nke e fekwasịrị ndị rụrụ arụ, pụrụ ido ha nsọ, meekwa ka ha dị ọcha nʼelu ahụ. 14Ọbara Kraịst onye sitere na Mmụọ dị ebighị ebi were onwe ya chụọrọ Chineke aja nʼenweghị ntụpọ ọbụla, ọ ga-esi aṅaa ghara ịsachapụ omume ruru unyi nke akọnuche anyị, ka anyị nwee ike ife Chineke dị ndụ. 15Nʼihi nke a, ọ bụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, ka ndị a kpọrọ site na ya nata ihe nketa ebighị ebi ahụ bụ nke e kwere ha na nkwa. A pụrụ ime nke a nʼihi ọ nwụọla ọnwụ gbapụta ụmụ mmadụ site nʼikpe ọmụma nke mmehie ha mere nʼokpuru ọgbụgba ndụ nke mbụ ahụ.

Oziọma

Mak 14:12–16, 22–26

12Nʼụbọchị mbụ nke Mmemme achịcha na-ekoghị eko, mgbe ha na-achụ aja atụrụ ngabiga, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa kwadoro gị ihe, maka oriri ngabiga?” 13O zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Gaanụ nʼime obodo, otu nwoke bu ite mmiri ga-ezute unu. Soronụ ya. 14Ebe ọbụla ọ banyere, sịnụ onyenwe ụlọ ahụ, Onye ozizi sịrị, Olee ụlọ ọbịa a kwadoro m, ebe mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-anọ rie oriri ngabiga? 15Ọ ga-egosi unu otu ọnụụlọ buru ibu nʼelu ụlọ ahụ, ebe e dozichara ihe niile. Kwadoonụ ihe anyị nʼebe ahụ.” 16Ndị na-eso ụzọ ya pụrụ baa nʼime obodo, ha hụrụ ihe niile dị ka ọ gwara ha. Ma kwadokwa nri ngabiga ahụ. 22Dị ka ha na-eri nri, o weere achịcha, nye ekele, nyawa ya, nye ha sị, “Rienụ ya, nke a bụ ahụ m.” 23Mgbe ahụ, o buuru iko, nye ekele bunyekwa ha. Ha niile ṅụrụ site nʼotu iko ahụ. 24Ọ sịrị ha, “Nke a bụ ọbara m nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, nke a na-awụfu nʼihi ọtụtụ mmadụ. 25Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, agaghị m aṅụ mmanya vaịnị ọzọ tutu ruo ụbọchị ahụ, mgbe m ga-aṅụ ya ọhụrụ nʼalaeze Chineke.” 26Mgbe ha bụsịrị abụ, ha pụrụ gaa nʼUgwu Oliv.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike