Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 28 Mee
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 28 Mee 2027
Fraịdee · Izu nke 8 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Fraịdee nke izu nke 8 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Obubu ọnụ na nchegharị
Ụbọchị nchegharị
Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Abụ Ọma nzaghachi
1Toonu Onyenwe anyị! Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ. Bụọnụ abụ ito ya nʼetiti ndị nsọ ya. 2Ka Izrel ṅụrịa ọṅụ nʼime onye kere ha; ka ndị bi na Zayọn nwee obi ụtọ nʼime Eze ha. 3Ka ha jiri ite egwu too aha ya ka ha jiri ọyọ na ụbọ akwara kpọọrọ ya egwu. 4Nʼihi na ihe banyere ndị ya na-atọ Onyenwe anyị ụtọ. Ọ na-eji nzọpụta kpukwasị ndị dị umeala nʼobi nʼisi dịka okpueze. 5Ka ndị nsọ ṅụrịa ọṅụ nʼime nsọpụrụ a, bụkwaa abụ nʼihi ọṅụ nʼelu ihe ndina ha. 6Ka otuto Chineke dịrị nʼọnụ ha, ka mma agha ihu abụọ dịrịkwa nʼaka ha, 9imezu ihe ahụ e kpebiri, depụtakwa megide ha. Nke a bụ nsọpụrụ dịrị ndị nsọ ya. Toonu Onyenwe anyị.
Oziọma
11Mgbe ọ batara na Jerusalem, ọ gara nʼime nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Mgbe o legharịchara anya nʼihe niile dị nʼebe ahụ, ma ebe ọ bụ na chi ejiela, ya na ndị na-eso ụzọ ya pụrụ gaa Betani. 12Nʼechi ya, mgbe ha si Betani na-apụta, agụụ gụrụ ya. 13Site nʼebe dị anya, ọ hụrụ otu osisi fiig nke nwere akwụkwọ ndụ. Mgbe ọ bịaruru osisi ahụ nso, ọ gagharịrị nʼukwu ya niile ma ọ ga-achọta mkpụrụ nʼelu ya, ma ọ hụghị mkpụrụ ọbụla, naanị akwụkwọ ndụ, nʼihi na oge a abụghị oge osisi a ji amị mkpụrụ. 14Mgbe ahụ, ọ gwara osisi ahụ sị, “Ka mmadụ ọbụla ghara iri mkpụrụ sitere na gị ruo ebighị ebi.” Ndị na-eso ụzọ ya nụrụ mgbe o kwuru okwu a. 15Mgbe ha ruru Jerusalem, ọ banyere nʼime ụlọnsọ ukwu, bido ịchụpụ ndị na-azụ ahịa na ndị na-ere ahịa nʼebe ahụ. O kpugharịrị tebul ndị na-agbanwe ego, kwatuokwa oche niile nʼọdụ ahịa ndị na-ere nduru. 16O gbochikwara onye ọbụla iwebata ngwongwo ahịa orire nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ. 17Ma dị ka ọ na-ezi ha ihe, ọ sịrị, “Ọ bụ na-edeghị ya sị, Ụlọ m ka a ga-akpọ ụlọ ekpere nye mba niile? Ma unu emeela ya ọgba ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike. ” 18Mgbe ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu nụrụ nke a, ha malitere na-achọ ụzọ igbu ya ma ha tụrụ egwu ya nʼihi na ozizi ya juru igwe mmadụ niile ahụ anya. 19Mgbe uhuruchi bịara, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya siri nʼobodo ahụ pụọ. 20Nʼisi ụtụtụ echi ya, mgbe ha na-agafe, ha hụrụ na osisi fiig a esitela na mgbọrọgwụ ya kpọnwụọ. 21Pita chetara ihe merenụ ma sị ya, “Onye ozizi, lee! Osisi fiig ahụ ị bụrụ ọnụ akpọnwụọla!” 22Jisọs zara ha sị, “Nweenụ okwukwe nʼime Chineke. 23Nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na onye ọbụla asị ugwu a, ‘Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa dabanye nʼoke osimiri,’ nke na-enweghị obi abụọ nʼime ya, kama o kweere na ihe o kwuru ga-emezu, ihe ahụ ọ kwuru ga-emezukwa. 24Ya mere, ka m gwa unu, ihe ọbụla unu rịọrọ nʼekpere, kwerenụ na unu anatala ya, ọ ga-abụkwa nke unu. 25Ma mgbe ọbụla unu guzoro na-ekpe ekpere, gbagharanụ, ma ọ bụrụ na unu nwere ihe ọbụla megide onye ọbụla, ka Nna unu nke bi nʼeluigwe gbagharakwa unu mmehie unu. 26Ma ọ bụrụ na unu agbagharaghị, Nna unu nke bi nʼeluigwe agaghị agbagharakwa unu mmehie unu.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike