Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 25 Mee

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 25 Mee 2027

Tiuzdee · Izu nke 8 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tiuzdee nke izu nke 8 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Onye nsọ Bede Onye a na-asọpụrụ, Onye ụkọchukwu na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta a na-ahọrọ

Onye nsọ Gregori nke Asaa, Pope · Ncheta a na-ahọrọ

Onye nsọ Meri Magdalin de Pazzi, Nwaagbọghọ · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọ dịghị na nsụgharị a

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 50:5–8, 14, 23

5“Chikọtaranụ m ndị m e doro nsọ, bụ ndị mụ na ha ji ịchụ aja gbaa ndụ.” 6Eluigwe na-ekwupụta ezi omume ya, nʼihi na Chineke nʼonwe ya bụ onye ikpe. Sela 7“Nụrụnụ, ndị m, m ga-ekwukwa, Izrel, aga m agba ama megide unu, Abụ m Chineke, Chineke unu. 8Anaghị m abara unu mba nʼihi ịchụ aja unu, na aja nsure ọkụ unu nke na-adị m nʼihu oge niile. 14“Chụọrọ Chineke aja ekele, mezuo nkwa i kwere Onye kachasị ihe niile elu, 23Onye na-eji ekele achụrụ m aja, na-asọpụrụ m, ọ bụkwa onye na-edozi ụzọ ya, ka m ga-eme ka ọ hụ nzọpụta Chineke.”

Oziọma

Mak 10:28–31

28Pita malitere ịgwa ya sị, “Anyị ahapụla ihe niile soro gị!” 29Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ọ dịghị onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, maọbụ ụmụnne ya ndị nwoke, maọbụ ụmụnne ya ndị nwanyị, maọbụ nne ya, maọbụ nna ya, maọbụ ụmụntakịrị ya, maọbụ ala ubi ya nʼihi m, na nʼihi oziọma a, 30nke na-agaghị anataghachikwa nʼụwa a, ụlọ, ụmụnne ndị nwoke, ụmụnne ndị nwanyị, nne, ụmụaka na ala ubi, tinyere mkpagbu, ihe ruru okpukpu narị karịa ihe niile nke ọ hapụrụ. Ọ ga-anatakwa ndụ ebighị ebi nʼụwa ọzọ. 31Ma ọtụtụ ndị bu ụzọ ga-abụ ndị ikpeazụ, ma ọtụtụ ndị ikpeazụ ga-abụkwa ndị bu ụzọ.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike