Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 22 Mee
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 22 Mee 2027
Satọdee · Izu nke 7 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee nke izu nke 7 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Rita nke Cascia · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Abụ Ọma nzaghachi
13Dịka nna si enwe obi ebere nʼebe ụmụ ya nọ, otu a ka Onyenwe anyị si enwe obi ebere nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ, 14nʼihi na ya onwe ya maara otu e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ aja. 15Ebe mmadụ nọ, ụbọchị ya niile dị ka ahịhịa, ọ na-etopụta, na-awasa dịka okoko osisi ọhịa, 16ifufe na-efesi ya ike, ọ na-adakwa, adịghị echetakwa ya nʼọnọdụ mbụ ya. 17Ma ịhụnanya Onyenwe anyị na-adịgide site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi nʼetiti ndị na-atụ egwu ya. Ezi omume ya na-adịgidekwara ụmụ ụmụ ha, 18nye ndị ahụ niile na-edebe ọgbụgba ndụ ya na ndị na-echeta irubere ụkpụrụ ya isi.
Oziọma
13Ndị mmadụ na-ekutere ya ụmụntakịrị ka o metụ ha aka, ma ndị na-eso ụzọ ya baara ha mba. 14Ma mgbe Jisọs hụrụ nke a, iwe were ya nke ukwuu, ọ sịrị ha, “Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m. Unu egbochikwala ha. Nʼihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị otu a. 15Nʼeziokwu asị m unu, onye ọbụla nke na-agaghị anabata alaeze Chineke dị ka nwantakịrị agaghị aba nʼime ya.” 16Mgbe ahụ, o kuuru ha nʼaka ya, bikwasị ha aka ya abụọ ma gọzie ha.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Rita nke Cascia
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike