Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 21 Mee
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 21 Mee 2027
Fraịdee · Izu nke 7 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Fraịdee nke izu nke 7 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Kristofa Magallanes, Onye ụkọchukwu, na ndị otu ya, Ndị nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ
Obubu ọnụ na nchegharị
Ụbọchị nchegharị
Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Abụ Ọma nzaghachi
12Otuto dịrị gị, o Onyenwe anyị; kuziere m iwu gị niile. 16Iwu gị na-amasị m; agaghị m elefu okwu gị anya. 18Kpughee anya m abụọ ka m hụ oke ihe ebube niile dị iche iche dị nʼime okwu gị. 27Mee ka m ghọta ozizi ụkpụrụ gị; ka m nwe ike tụgharịa uche nʼọrụ ebube gị niile. 34Nye m nghọta, aga m edebe iwu gị ma jiri obi m niile rubere ya isi. 35Duo m nʼụzọ nke iwu gị niile, nʼihi na ọ bụ nʼime ha ka m na-achọta obi ụtọ.
Oziọma
1Ọ hapụrụ ebe ahụ gaa nʼobodo ndị dị na mpaghara Judịa ma gafeekwa nʼofe Jọdan. Igwe mmadụ bịakwutekwara ya, ọzọ, dị ka o si emekwa, o ziri ha ihe. 2Ụfọdụ ndị Farisii bịara, ma nʼihi ị nwalee ya, ha jụrụ ya sị, “O ziri ezi nʼiwu ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghị m?” 3Ma ọ zara ha sị, “Gịnị ka Mosis nyere unu nʼiwu?” 4Ha sịrị, “Mosis kwenyere ka nwoke dee asambodo alụkwaghị m, nye nwunye ya ma zilaga ya.” 5Jisọs sịrị ha, “Ọ bụ nʼihi na obi unu siri ike nke ukwuu ka o ji deere unu iwu a. 6Ma na mmalite nke okike ụwa, Chineke ‘kere ha nwoke na nwanyị.’ 7‘Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. 8Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.’ Ya mere, ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ, kama otu anụ ahụ. 9Ya mere, ihe Chineke jikọtara, ka mmadụ ọbụla atọsala ya.” 10Mgbe ha banyere nʼụlọ, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ọzọ ihe banyere okwu a. 11Ọ sịrị ha, “Onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m ma lụrụ nwanyị ọzọ na-eme mmehie ịkwa iko megide ya. 12Ma ọ bụrụ na nwanyị ọbụla agbaa dị ya alụkwaghị m ma lụrụ nwoke ọzọ, ọ na-emekwa mmehie ịkwa iko.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Kristofa Magallanes, Onye ụkọchukwu, na ndị otu ya, Ndị nwụrụ nʼihi okwukwe
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike