Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 12 Mee

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 12 Mee 2027

Wenezdee · Izu nke 7 nke Oge Ista

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke izu nke 7 nke Oge Ista

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: ọcha

Onye nsọ Pankras, Onye nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ

Ndị nsọ Neriọs na Akiliọs, Ndị nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọrụ 20:28–38

28Ma ugbu a, kpacharanụ anya! Leziekwanụ onwe unu na igwe atụrụ nke Mmụọ Nsọ mere unu ndị nlekọta anya ya. Ka unu bụrụ ndị ọzụzụ atụrụ nke chọọchị Chineke, bụ nke o ji ọbara ya zụtara onwe ya. 29Nʼihi na amaara m na mgbe m lachara, agụ jọgburu onwe ya ga-abata nʼetiti unu nke na-agaghị emere igwe atụrụ ebere. 30Ụfọdụ nʼime unu ga-ebili tụgharịa eziokwu ahụ ịhụ ka ha si otu a dọrọ ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ahụ nye onwe ha. 31Ya mere, na-echenụ nche! Chetakwanụ na nʼime afọ atọ m nọrọ nʼetiti unu, ehihie na abalị, eji m ịkwa akwa na anya mmiri na-adụ unu ọdụ. 32“Ugbu a ana m etife unu nʼaka Chineke na nlekọta ya. Ana m etifekwa unu nʼaka okwu amara ya nke pụrụ ịgba okwukwe unu ume na inyekwa unu akụnụba ọ kwadobeere ndị ahụ e doro nsọ. 33Ọ dịghị mgbe ọbụla agụụ ịdọtara onwe m ọlaọcha maọbụ ọlaedo maọbụ uwe nke onye ọbụla ji gụọ m. 34Ọ bakwaghị uru ịgwa unu na ọ bụ aka m rụpụtara ọrụ gbooro m mkpa niile, na nke gbokwara mkpa ndị ahụ mụ na ha so. 35Nʼihe niile, abụkwa m ihe ilere anya nye unu banyere inyere ndị ogbenye aka, site nʼịrụ ọrụ nʼụzọ dị otu a, na-echetara m okwu nke Onyenwe anyị Jisọs kwuru sị, ‘Ngọzị karịrị dị nʼinye enye karịa ịnara anara.’ ” 36Mgbe o kwusiri okwu ndị a, o soro ha niile gbuo ikpere nʼala kpekwa ekpere. 37Ha bere akwa nke ukwuu, makụọ Pọl, sutukwa ya ọnụ. 38O wutere ha karịa na o kwuru na ha agaghị ahụ ya anya ọzọ. Emesịa, ha duru ya ruo ebe ọ banyere ụgbọ mmiri.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 68:28–29, 32–35

28O Chineke, kpọlite ike gị; mee ka ike gị pụta ìhè, O Chineke, dịka i mere na mbụ. 29Nʼihi ụlọnsọ ukwu gị nke dị na Jerusalem, ndị eze ga-ewetara gị onyinye dị iche iche. 32Bụkuo Chineke abụ, unu alaeze niile nke ụwa, bụkuo Onyenwe anyị abụ otuto, Sela 33Bụọ abụ nye onye na-agba ịnyịnya nʼeluigwe, e, ọ bụladị eluigwe nke dịrị site na mgbe ochie, onye olu ike ya dịka egbe eluigwe. 34Kwusaa ike Chineke, onye ịdị ukwuu nke ịma mma ya na-ekpuchi Izrel, onye ike ya dị nʼeluigwe. 35O Chineke, ị dị oke egwu nʼime ụlọnsọ gị; Chineke nke Izrel na-enye ndị ya ume na ike. Toonu Chineke!

Oziọma

Jọn 17:11–19

11Ugbu a, anọghịkwa nʼime ụwa, ma ha ka nọ nʼime ụwa, ana m alaghachikwute gị. Ya mere, Nna dị nsọ, chebe ha nke ọma site nʼike nke aha gị, bụ aha nke ahụ i nyere m, ka ha bụrụ otu dịka anyị onwe anyị si bụrụ otu. 12Mgbe mụ na ha nọ nʼụwa, echebere m ha site nʼaha gị nke i nyere m. Echebekwara m ha, o nwekwaghị onye ọbụla nʼime ha lara nʼiyi, karịakwa onye ahụ bụ nwa nke ịla nʼiyi, ka e mezuo ihe akwụkwọ nsọ kwuru. 13“Ma ugbu a, ana m alọghachikwute gị, ma ana m ekwu ihe ndị a nʼụwa ugbu a ka ha nwee nʼọṅụ m, nʼebe o zuruoke nʼime ha. 14Enyela m ha okwu gị. Ma nʼihi ya, ụwa akpọọla ha asị. Nʼihi na ha abụghị ndị nke ụwa dị ka mụ onwe m na-abụghị onye nke ụwa. 15Ekpeghị m ekpere ka iwepụ ha nʼụwa, kama ka ịnapụta ha site nʼaka ajọ onye ahụ. 16Ha onwe ha abụghị ndị nke ụwa dị ka mụ onwe m na-abụkwaghị onye nke ụwa. 17Were eziokwu doo ha nsọ, okwu gị bụ eziokwu. 18Dị ka i siri zite m nʼụwa, otu a ka m na-ezipụkwa ha nʼụwa. 19Ọ bụkwa nʼihi ha ka m jiri debe onwe m nsọ, ka ha onwe ha bụrụkwa ndị e doro nsọ nʼeziokwu.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike