Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 11 Mee
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 11 Mee 2027
Tiuzdee · Izu nke 7 nke Oge Ista
Mmemme na ndị nsọ
Tiuzdee nke izu nke 7 nke Oge Ista
Ụbọchị izu · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
17Site na Melitọs, ọ zipụrụ ozi ka a kpọọrọ ya ndị okenye chọọchị nke Efesọs ka ha bịa zute ya. 18Oge ha bịakwutere ya, ọ gwara ha, “Unu maara nke ọma otu m si nọ nʼetiti unu mgbe niile mụ na unu nọrọ, site nʼụbọchị mbụ ụkwụ m zọkwasịrị nʼala Eshịa tutu ruo ugbu a. 19Arụrụ m ọrụ Onyenwe anyị site nʼobi umeala na anya mmiri nʼetiti ntaramahụhụ dị ukwuu, site nʼizu ọjọọ ndị Juu gbara maka m. 20Unu hụrụ na m ahapụghị ime ka unu mara ihe ọbụla ga-abara unu uru, mgbe ọbụla m na-akụziri unu ihe nʼụlọ maọbụ nʼihu ọha. 21E kwusaala m nye ma ndị Juu ma ndị Griik okwu nchegharị nʼebe Chineke nọ, na okwukwe nʼebe Onyenwe anyị Jisọs nọ. 22“Ma otu ọ dị, ana m aga Jerusalem dịka iwu Mmụọ Nsọ nyere m si dị, ma amaghị m ihe ọnọdụ m ga-abụ nʼebe ahụ. 23Karịakwa na Mmụọ Nsọ na-agbara m ama nʼebe ọbụla na mkpọrọ na ntaramahụhụ na-eche m nʼebe ahụ. 24Ma akpọghị m ndụ m ihe ọbụla. Karịa naanị ka m gbazuo ọsọ m ma jezuokwa ozi ahụ m natara nʼaka Onyenwe anyị Jisọs, nke bụ ịkọwa banyere oziọma nke amara Chineke. 25“Ma ugbu a, amaara m na o nweghị onye ọbụla nʼime unu, bụ ndị m jegharịrị nʼetiti ha na-ezisara ihe banyere alaeze a ga-ahụ m anya ọzọ. 26Ya mere, ana m agwasị unu ike, taa, na abụ m onye aka ya dị ọcha nʼebe ọbara onye ọbụla nʼime unu dị. 27Nʼihi na-esepụghị m aka ikwupụta nzọpụta Chineke nye unu.
Abụ Ọma nzaghachi
9I nyere mmiri ozuzo nʼebe ọ dị ukwuu, O Chineke, i tutere ihe nketa gị nke ike gwụrụ. 10Ndị gị biri nʼime ya, site nʼoke akụnụba gị, O Chineke, ị rọpụtaara ndị ogbenye mkpa ha. 19Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke anyị, na Onye Nzọpụta anyị, Onye na-ebu ibu arọ anyị ụbọchị niile. Sela 20Chineke anyị bụ Chineke na-azọpụta; mgbapụta pụọ nʼọnwụ na-esite nʼaka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.
Oziọma
1Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, o leliri anya nʼeluigwe sị, “Nna, oge ahụ a kara aka eruola, nye Ọkpara gị otuto, ka Ọkpara gị nyekwa gị otuto. 2I nyela ya ikike nʼebe mmadụ niile nọ, na ike inye ndị niile i nyere ya ndụ ebighị ebi. 3Nke a bụkwa ndụ ebighị ebi ahụ. Ka ha mata na naanị gị bụ Chineke nʼezie, matakwa Jisọs Kraịst onye ahụ i zitere nʼụwa. 4Enyere m gị otuto nʼụwa site nʼịrụzu ọrụ niile ị nyere m ka m rụọ. 5Ma ugbu a, Nna, nye m otuto nʼihu gị, ụdị otuto ahụ m nwere nʼihu gị tupu e kee ụwa. 6“Emere m ka ndị ahụ i siri nʼụwa kponye m mara aha gị. Ha bụ ndị nke gị, i nyere m ha, ha debekwara okwu gị. 7Ugbu a, ha amarala na ihe niile i nyere m si nʼaka gị bịa. 8Ma ugbu a, enyela m ha okwu ahụ i nyere m, ha nabatakwara ya, marakwa nʼeziokwu na-esi m nʼebe ị nọ bịa. Ha kwenyekwara na ọ bụ gị zitere m. 9Ana m ekpere ha ekpere, ọ bụghị nʼihi ụwa ka m na-ekpe ekpere. Kama ana m ekpe ekpere banyere ndị ahụ i nyere m, nʼihi na ha bụkwa ndị nke gị. 10Ihe niile m nwere bụ nke gị, ihe niile i nwere bụkwa nke m. E sitere na ha mee ka otuto m pụta ìhè. 11Ugbu a, anọghịkwa nʼime ụwa, ma ha ka nọ nʼime ụwa, ana m alaghachikwute gị. Ya mere, Nna dị nsọ, chebe ha nke ọma site nʼike nke aha gị, bụ aha nke ahụ i nyere m, ka ha bụrụ otu dịka anyị onwe anyị si bụrụ otu.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike