Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 10 Mee

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 10 Mee 2027

Mọnde · Izu nke 7 nke Oge Ista

Mmemme na ndị nsọ

Mọnde nke izu nke 7 nke Oge Ista

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: ọcha

Onye nsọ Jọn nke Avila, Onye ụkọchukwu na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọrụ 19:1–8

1Mgbe Apọlọs nọ na Kọrint, Pọl sitere ụzọ nke nʼime elu ala bịarute Efesọs. Nʼebe ahụ, ọ hụrụ ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ahụ, 2sị ha, “Unu natakwara Mmụọ Nsọ mgbe unu kweere?” Ha sịrị ya, “Mba, anyị anụbeghị na ọ nwere ihe dịka Mmụọ Nsọ.” 3Ya mere, ọ sịrị, “Gịnị ka unu kwenyere nʼime ya mgbe e mere unu baptizim?” Ha sịrị, “Baptizim nke Jọn.” 4Mgbe ahụ, Pọl sịrị, “Baptizim Jọn bụ nke gbasara nchegharị site na mmehie, na-agwa ndị mmadụ ka ha kwere nʼonye ahụ na-eso ya na-abịa, nke bụ, ikwere nʼime Jisọs.” 5Mgbe ha nụrụ nke a, e mere ha baptizim nʼaha Onyenwe anyị Jisọs. 6Mgbe Pọl bikwasịrị ha aka ya abụọ nʼisi, ha natara Mmụọ Nsọ. Ha kwukwara okwu nʼasụsụ dị iche iche, bukwaa amụma. 7Ha niile ruru ndị ikom iri na abụọ. 8Ọ banyere nʼụlọ nzukọ ahụ ma were nkwuwa okwu, na ịrụ ụka nʼebe o doro anya gwasie ha okwu ike banyere alaeze Chineke. Ọ bụ ọnwa atọ ka o were ya ime nke a.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 68:1–6

1Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nke Devid. Abụ Ọma. Otu Abụ. Ka Chineke bilie, ka ndị iro ya bụrụ ndị a chụsasịrị; ka ndị iro ya site nʼihu ya gbalaga. 2Dịka ikuku si achụsa anwụrụ ọkụ, sikwa otu a chụsaa ha. Dịka mmanụ na-ehi ụra si agbaze nʼọkụ, ka ndị na-eme ihe ọjọọ laa nʼiyi nʼihu Chineke. 3Ka ndị ezi omume bụrụ ndị nwere obi ụtọ, ma ṅụrịa nʼihu Chineke; ka ha bụrụ ndị nwere obi ụtọ, jupụtakwa nʼọṅụ. 4Bụkuo Chineke abụ, bụkuonụ aha ya abụ otuto, toonu onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya, Onyenwe anyị bụ aha ya, ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya. 5Ọ bụ nna ndị nke na-enweghị nna, onye na-ekpechitere ndị di ha nwụrụ anwụ ọnụ ha, onye a bụ Chineke, onye bi nʼebe ya dị nsọ. 6Chineke na-eme ka ndị naanị ha nọ nwee ezinaụlọ, ọ na-eji ịbụ abụ dupụta ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ, ma ndị nnupu isi ka ọ na-eme ka ha biri, nʼala kpọrọ nkụ.

Oziọma

Jọn 16:29–33

29Ndị na-eso ụzọ ya sịrị, “Lee, ugbu a ka okwu gị doro anya. Ọ bụkwaghị ilu ka i na-atụ. 30Ugbu a ka o doro anyị anya na ị maara ihe niile. Ọ bakwaghị uru ka onye ọbụla jụọ gị ihe ọbụla. Nʼihi nke a, anyị kwere na i si nʼebe Chineke nọ bịa.” 31Jisọs zara ha, “Unu ekwerela ugbu a? 32Lee! Oge na-abịa, oge ahụ eruola, mgbe unu ga-agbasacha. Onye ọbụla nʼụlọ nke ya. Mgbe ahụ, unu ga-ahapụ naanị m, ma ọ bụghị naanị m nọ nʼihi na mụ na Nna m nọ. 33“Agwala m unu ihe ndị a niile ka unu nwee udo nʼime m. Nʼime ụwa, unu ga-enwe nsogbu. Ma ka obi sie unu ike, nʼihi na emeriela m ụwa.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike