Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 10 Mee
Kalenda Ọtọdọks · 27 Eprel (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 10 Mee 2027
Mọnde · Izu nke 2 nke Ista · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
Apostle and Hieromartyr Simeon, Bishop of Jerusalem, a Kinsman of the Lord († 107)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
19Ya mere, chegharịanụ ugbu a ma lọghachikwutekwanụ Chineke, ka e nwee ike ihichapụ mmehie unu, 20ka enyekwa unu ntute nke ime mmụọ nke sitere nʼihu Onyenwe anyị, ma zitekwara unu Kraịst ahụ, bụ onye ahọpụtara nye unu, nke bụ Jisọs. 21Onye eluigwe na-aghaghị ịnabata tutu ruo oge ahụ Chineke ga-eweghachi ihe niile nʼọnọdụ ha, dịka o kwere na nkwa nʼogologo oge gara aga site nʼọnụ ndị amụma ya dị nsọ. 22Mosis sịrị, ‘Onyenwe anyị bụ Chineke ga-eme ka onye amụma ga-adị ka m biliere unu site nʼetiti ụmụ nne unu, unu aghaghị ige ntị nʼihe niile ọ ga-agwa unu. 23Onye ọbụla jụrụ ige onye amụma ahụ ntị, ka a ga-ekewapụ kpamkpam site nʼetiti ndị ya ma bibiekwa ya.’ 24“Nʼezie ndị amụma niile site na Samuel na ndị ọzọ so ya nʼazụ, bukwara amụma banyere ụbọchị ndị a. 25Ma unu bụ ndị nketa nke ndị amụma, nakwa nke ọgbụgba ndụ ahụ Chineke na nna nna unu gbara, mgbe ọ gwara Ebraham, ‘Site na mkpụrụ gị ka a ga-agọzi mba niile nke ụwa.’ 26Mgbe Chineke kpọlitere onyeozi ya, o buuru ụzọ zitere unu ya, ka ọ gọzie unu site nʼime ka onye ọbụla nʼime unu chegharịa site nʼụzọ ọjọọ ya.”
Oziọma
1Nʼụbọchị nke atọ, o nwere mmemme agbamakwụkwọ na Kena nke Galili, nne Jisọs bịakwara ebe ahụ. 2A kpọkwara Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya oku na mmemme agbamakwụkwọ a. 3Mgbe mmanya ha gwụrụ, nne Jisọs sịrị ya, “Ha enweghị mmanya.” 4Jisọs sịrị ya, “Nwanyị, gịnị gbasara mụ na gị na nke a? Oge awa m erubeghị.” 5Nne ya gwara ndị na-eje ozi, “Ihe ọbụla ọ gwara unu, meenụ ya.” 6A dọbara ite mmiri nkume isii buru ibu nʼakụkụ ebe ahụ, nke a na-eji agbanye mmiri ndị Juu na-eji asachasị onwe ha ma ha chọọ ikpe ekpere. Otu nʼime ha na-eri ihe dị ka galọọnụ iri abụọ ma ihe ruru iri atọ. 7Jisọs gwara ha, “Gbajuonụ ite ndị a mmiri.” Ya mere, ha gbajupụtara ha mmiri. 8Mgbe ahụ, ọ gwara ha, “Ugbu a, gbapụtanụ ụfọdụ bugara onyeisi oche.” Ha mekwara nke a. 9Mgbe ahụ onyeisi oche ahụ detụrụ mmiri ahụ e mere ka ọ ghọọ mmanya ọnụ. Ọ mataghị ebe o siri pụta (ma ndị na-eje ozi, ndị kutere mmiri ahụ matara), onyeisi oche ahụ kpọpụtara onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ iche 10sị ya, “Nʼoge mmemme ọbụla, a na-ebu ụzọ buputa mmanya dị ụtọ, ma bupụtakwa nke na-adịghị ụtọ nʼikpeazụ, mgbe ndị mmadụ ṅụjuchara afọ, ma i chebere mmanya dị ụtọ buputa ya ugbu a.” 11Nke a bụ mmalite ihe ama Jisọs mere na Kena nke Galili, o sitere na nke a kpughee ebube ya, ndị na-eso ụzọ ya kwenyekwara na ya.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 27 Epreel na kalenda nzukọ bụ 10 Mee na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike