Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 9 Mee

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 9 Mee 2027

Sọnde · Izu nke 7 nke Oge Ista

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 7 nke Oge Ista

Sọnde · Agba ofufe: ọcha

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọrụ 1:15–17, 20–26

15Nʼoge ahụ, Pita bilitere nʼetiti ndị kwere ekwe ọnụọgụgụ ha dị ihe dị ka narị na iri abụọ, sị, 16“Ụmụnna m, ọ dị mkpa ka ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ mezuo banyere Judas onye duuru ndị jidere Jisọs bịa. Mmụọ Nsọ kwuru na nke a ga-eme mgbe o sitere nʼọnụ Devid kwuo okwu nʼoge gara aga. 17Ọ bụ otu nʼime anyị. O nwere oke nʼime ọrụ a.” 20Pita sịrị, “Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ Abụ Ọma: “ ‘Ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ya,’ na, “ ‘Ka onye ọzọ nọchiekwa ọnọdụ ya ka onyeisi.’ 21Ya mere, otu onye nʼime ndị anyị na ha nọ nʼoge niile Onyenwe anyị Jisọs nọ nʼetiti anyị, 22bido nʼoge Jọn na-eme baptizim ruo nʼụbọchị Jisọs si nʼetiti anyị rigoro nʼeluigwe. Otu onye nʼime ndị a ga-eso anyị bụrụ onye akaebe nke mbilite nʼọnwụ ya.” 23Ya mere, ha họpụtara mmadụ abụọ, Josef onye a na-akpọ Basabas (aha ya ọzọ bụkwa Jọstus) na Mataias. 24Ha kpere ekpere sị, “Onyenwe anyị, ị maara obi mmadụ niile. Gosi anyị onye ị họpụtara nʼime mmadụ abụọ ndị a. 25Ka ọ bụrụ onyeozi na onyendu nke ga-anọchi anya Judas onye nke hapụrụ ma gawa ebe o kwesiri ka ọ gaa.” 26Ha fere ha nza. Nza ahụ makwara Mataias, ha gụnyere ya dị ka otu nʼime ndị ozi iri na otu ahụ.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 103:1–2, 11–12, 19–20

1Abụ Ọma Devid. Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị; ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya. 2Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị; echefukwala mmeso ọma ya niile, 11Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ịhụnanya ya si dị ukwuu nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ. 12Dịka ọwụwa anyanwụ si dị anya, site nʼọdịda anyanwụ, otu a ka o sirila mee ka mmehie anyị niile dịrị anya site nʼebe anyị nọ. 19Onyenwe anyị emeela ka ocheeze ya guzosie ike nʼeluigwe, alaeze ya na-achị ihe niile. 20Toonu Onyenwe anyị, unu ndị mmụọ ozi ya, unu ndị dị ike ndị na-eme ihe ọ chọrọ, na-erubere okwu ya isi.

Ihe ọgụgụ nke abụọ

1Jọn 4:11–16

11Ndị m hụrụ nʼanya, ebe ọ bụ na Chineke si otu a hụ anyị nʼanya, anyị kwesiri ịhụrịta onwe anyị nʼanya. 12O nwebeghị mgbe ọbụla anyị ji anya anyị hụ Chineke anya, ma ọ bụrụ na anyị ahụ ibe anyị nʼanya, Chineke na-ebi nʼime anyị. A na-emekwa ka ịhụnanya ya zuo oke nʼime anyị. 13O tinyekwala Mmụọ Nsọ ya nʼime anyị igosi anyị na o bi nʼime anyị, na anyị bikwa nʼime ya. 14Ma anyị onwe anyị ahụla ma na-agbakwa ama na Nna ahụ zitere Ọkpara ya ka ọ bụrụ Onye nzọpụta nke ụwa. 15Chineke bi nʼime onye ọbụla nke na-ekwupụta na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Onye dị otu a bikwa nʼime Chineke. 16Anyị maara ma kwerekwa nʼịhụnanya Chineke nwere nʼebe anyị nọ. Chineke bụ ịhụnanya. Onye ọ bụlakwa na-ebi ndụ ịhụnanya na-anọgide nʼime Chineke. Chineke nʼonwe ya na-ebinyekwara onye dị otu a.

Oziọma

Jọn 17:11–19

11Ugbu a, anọghịkwa nʼime ụwa, ma ha ka nọ nʼime ụwa, ana m alaghachikwute gị. Ya mere, Nna dị nsọ, chebe ha nke ọma site nʼike nke aha gị, bụ aha nke ahụ i nyere m, ka ha bụrụ otu dịka anyị onwe anyị si bụrụ otu. 12Mgbe mụ na ha nọ nʼụwa, echebere m ha site nʼaha gị nke i nyere m. Echebekwara m ha, o nwekwaghị onye ọbụla nʼime ha lara nʼiyi, karịakwa onye ahụ bụ nwa nke ịla nʼiyi, ka e mezuo ihe akwụkwọ nsọ kwuru. 13“Ma ugbu a, ana m alọghachikwute gị, ma ana m ekwu ihe ndị a nʼụwa ugbu a ka ha nwee nʼọṅụ m, nʼebe o zuruoke nʼime ha. 14Enyela m ha okwu gị. Ma nʼihi ya, ụwa akpọọla ha asị. Nʼihi na ha abụghị ndị nke ụwa dị ka mụ onwe m na-abụghị onye nke ụwa. 15Ekpeghị m ekpere ka iwepụ ha nʼụwa, kama ka ịnapụta ha site nʼaka ajọ onye ahụ. 16Ha onwe ha abụghị ndị nke ụwa dị ka mụ onwe m na-abụkwaghị onye nke ụwa. 17Were eziokwu doo ha nsọ, okwu gị bụ eziokwu. 18Dị ka i siri zite m nʼụwa, otu a ka m na-ezipụkwa ha nʼụwa. 19Ọ bụkwa nʼihi ha ka m jiri debe onwe m nsọ, ka ha onwe ha bụrụkwa ndị e doro nsọ nʼeziokwu.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike