Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 8 Mee
Kalenda Ọtọdọks · 25 Eprel (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 8 Mee 2027
Satọdee · Izu Ìhè · Olu 8
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee nke Izu Ìhè
Izu na-enweghị obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka Onye nsọ Mak)
1Jemis, nwaodibo Chineke na nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, Na-edegara agbụrụ iri na abụọ ndị gbasara nʼelu ụwa niile akwụkwọ ozi a: Ndeewonụ! 2Ụmụnna m, ka obi unu jupụta nʼọṅụ mgbe ọbụla ọnwụnwa dị iche iche gbara unu gburugburu. 3Nʼihi na mgbe a na-anwa okwukwe unu ọnwụnwa, ntachiobi unu na-enwe ohere ito eto. 4Ka nguzosike unu pụta ìhè, ka unu zuo oke ma nwezuokwa ihe niile, na-adịghị ihe ọbụla nke ga-akọ unu. 5Ọ bụrụ na ọ dị onye na-enweghị amamihe, ya rịọ Chineke, onye na-enye onye ọbụla rịọrọ ya amamihe nʼafọ ofufu na-ataghịkwa onye ọbụla ụta, a ga-ewerekwa ya nye ya. 6Ma rịọọ nʼokwukwe na-enweghị obi abụọ, nʼihi na onye na-enwe obi abụọ dị ka ebili mmiri oke osimiri mgbe ikuku na-ebugharị ya. 7Onye dị otu ahụ ekwesighị ile anya na ọ ga-esite nʼaka Onyenwe anyị nata ihe ọbụla. 8Nʼihi na mmadụ dị otu a bụ onye ihu abụọ, onye na-adịghị eguzo nʼotu ebe nʼihe ọbụla ọ na-eme. 9Ka nwanna ọbụla bụ ogbenye ṅụrịa ọṅụ, mgbe ọbụla e weliri ya elu. 10Ka onye bụ ọgaranya mgbe a na-eme ka ọ nọdụ ya dị ala, nʼihi na ndị bara ụba ga-akpọnwụ dị ka okoko osisi. 11Nʼihi na mgbe ọbụla anwụ waliri chasie ike, wepụta okpomọkụ, ọ na-eme ka ahịhịa kpọnwụọ, ka okoko osisi daa nʼala, mma ya agwụsịakwa. Nʼotu aka ahụ, onye ahụ bara ụba ga-akpọnwụ ọ bụladị mgbe ọ na-ejegharị nʼime ije ozi ya. 12Ngọzị na-adịrị onye ahụ nke na-anọgide na-adịghị ada mba nʼoge ọnwụnwa. Nʼihi na mgbe oge ọnwụnwa ahụ gasịrị, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ, nke bụ okpueze ndụ, nke Chineke kwere nkwa inye ndị niile hụrụ ya nʼanya.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka Onye nsọ Mak)
13Ka onye ọbụla hapụ ị sị, mgbe a na-anwa ya, “Ọ bụ Chineke na-anwa m ọnwụnwa a.” Nʼihi na ọ dịghị mgbe a pụrụ ịnwa Chineke ka o mee ihe ọjọọ, ọ dịkwaghị anwa mmadụ ọbụla ka o mee ihe ọjọọ. 14Kama ọnwụnwa na-abịara mmadụ site nʼọchịchọ nke obi ya. Ọ bụkwa ọchịchọ ọjọọ nke mmadụ na-arafu ya, dọkpụfuo ya. 15Ọchịchọ ahụ, mgbe ha bara ụba nʼime obi, na-eduba mmadụ na mmehie. Mgbe mmehie bara ụba, ọ na-eduba nʼọnwụ. 16Ekwela ka onye ọbụla duhie unu ụmụnna m. 17Onyinye ọbụla dị mma, na nke zuruoke na-esite nʼeluigwe abịa. Ọ na-esite nʼebe Nna nke ìhè niile onye na-adịghị agbanwe agbanwe, ọ naghị ezonarị ụmụ mmadụ ihu ya. 18Nʼihi imezu nzube ya, o sitere nʼokwu ya bụ eziokwu mụọ anyị. O mekwara nke a ka anyị bụrụ ụmụ mbụ nke ihe o kere eke. 19Unu aghaghị icheta nke a ụmụnna m ndị m hụrụ nʼanya. Ka onye ọbụla nwee ntị na-anụ ihe ọsịịsọ, na ire dị arọ ikwu okwu, ma bụrụkwa onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ. 20Nʼihi na iwe nke mmadụ anaghị arụpụta ezi omume nke Chineke. 21Ya mere, wezuganụ ụzọ rụrụ arụ niile na ihe ọbụla dị njọ nke fọdụrụ nʼime ndụ unu. Ma jirinụ obi umeala nabataranụ onwe unu okwu ndụ ahụ nke a kụrụ nʼobi unu, nke nwere ike ịzọpụta mkpụrụobi unu. 22Unu abụla ndị na-eji ntị ha na-anụ okwu ndụ ahụ naanị, na-arafu onwe ha, kama bụrụnụ ndị na-eme ihe okwu ahụ kwuru. 23Nʼihi na onye ọbụla na-ege ntị nʼokwu ọbụla ma hapụ iji ihe ọ nụrụ mee ihe, dị ka nwoke na-ele ihu ya nʼenyo. 24O lesịa onwe ya pụọ, o chefuo ihe ihu ya yiri ma nwa oge nta gasịa. 25Ma nwoke ahụ nọgidesịrị ike na-ele anya nʼime iwu ahụ zuruoke, nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya, ee, nwoke ahụ na-aga nʼihu ile na ime ihe iwu ahụ kwuru, hapụkwa ichefu ya, ka a ga-agọzi nʼihe niile ọ na-eme. 26Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla echee na ya bụ onye na-ekpere Chineke ma hapụ ijide ire ya aka maọbụ ịkwa ire ya nga, onye dị otu a na-arafu onwe ya, okpukpe Chineke ya bụkwa ihe na-abaghị uru. 27Ezi okpukpe Chineke, nke Chineke Nna anyị na-anabata dịka okpukpe dị ọcha, na nke na-enweghị mmerụ, bụ nke a, ilekọta ndị na-enweghị nne na nna, na ndị di ha nwụrụ nʼime nsogbu ha na idebe onwe anyị nʼenweghị ntụpọ site nʼaka ndị ụwa.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka Onye nsọ Mak)
1Ụmụnna m, dịka ndị kweere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye dị ebube, ka unu hapụ ile mmadụ anya nʼihu. 2Ọ bụrụ na onye ọgaranya yi uwe mara mma, yikwara mgbaaka ọlaedo na mkpịsịaka ya, abata nʼụlọ nzukọ unu, ọ bụrụkwa na nwa ogbenye abata nke yi uwe na-adịghị ọcha, 3ọ bụrụ na unu elee onye ọgaranya ahụ yi uwe mara mma anya sị ya, “Bịa nọdụ nʼotu oche a e debere iche nʼihi gị,” ma unu asị onye ogbenye ahụ, “Di anyị, guzo nʼebe ahụ,” maọbụ “Bịa nọdụ ala nʼakụkụ ebe a ụkwụ m dị,” 4ọ bụ na unu akpabeghị oke nʼetiti onwe unu, bụrụkwa ndị ji ile anya nʼihu na obi ọjọọ na-ekpe ikpe? 5Geenụ ntị ka m gwa unu ụmụnna m, ọ bụ na unu amataghị na Chineke ahọpụtala ndị ahụ ụwa gụrụ dịka ndị ogbenye, mee ka ha bụrụ ọgaranya site nʼokwukwe ha, ka ha ketakwa alaeze ahụ o kwere nkwa inye ndị hụrụ ya nʼanya? 6Ma gịnị ka unu na-eme? Unu na-akparị ndị ogbenye! Ọ bụghị ndị ọgaranya na-emegbu unu? Ọ bụkwaghị ha bụ ndị na-adọkpụgharị unu aga nʼụlọikpe? 7Ọ bụghị ha bụ ndị na-ekwulu aha ọma ahụ nke a gụrụ unu? 8Ọ bụrụ na unu na-edebezuo iwu nke eze anyị dịka e dere ya nʼAkwụkwọ Nsọ, “Hụnụ ndị agbataobi unu nʼanya dịka unu onwe unu,” unu na-eme ihe ziri ezi. 9Ma ọ bụrụ na unu ele mmadụ anya nʼihu, unu na-eme mmehie. Nʼebe iwu dịkwa, unu bụ ndị na-emebi iwu. 10Nʼihi na onye ọbụla nke na-edebe iwu ahụ niile ma sụọ ngọngọ nʼotu, a bụrụla onye ikpe iwu ahụ niile maara. 11Nʼihi na onye ahụ sịrị, “Akwala iko,” bụkwa onye sịrị, “Egbula mmadụ.” Ya mere, ọ bụrụ na ị kwaghị iko ma i gburu mmadụ, ị bụ onye na-emebi iwu. 12Ya mere, na-ekwunu okwu, ma na-ebikwanụ ndụ dị ka ndị a ga-ekpe ikpe site nʼiwu ahụ na-eme ka mmadụ nwere onwe ha. 13Nʼihi na agaghị emere onye ọbụla ebere nke na-adịghị emere onye ọzọ ebere. Nʼihi na ebere na-adị ukwuu karịa ikpe ọmụma ya.
Ofufe ụtụtụ: Oziọma (maka Onye nsọ Mak)
1Mgbe nke a gasịrị, Onyenwe anyị họpụtara iri mmadụ asaa na abụọ ndị ọzọ, zipụ ha mmadụ abụọ abụọ ka ha buru ya ụzọ gaa nʼobodo niile nakwa ebe niile ọ na-achọ ịga. 2Ọ sịrị ha, “Owuwe ihe ubi dị ukwuu ma ndị ọrụ dị naanị ole na ole. Ya mere, rịọọnụ Onyenwe owuwe ihe ubi ka o zite ndị ọrụ nʼowuwe ihe ubi ya. 3Gaanụ! Ma lee, ana m ezipu unu dị ka ụmụ atụrụ nʼetiti agụ. 4Unu ewerekwala ego maọbụ akpa maọbụ akpụkpọụkwụ. Unu ekelekwala onye ọbụla nʼụzọ. 5“Mgbe unu banyere nʼụlọ ọbụla, burunu ụzọ sị, ‘Udo dịrị nʼụlọ a.’ 6Ọ bụrụ na mmadụ udo bi nʼụlọ ahụ, udo unu ga-adịnyekwara ya. Ọ bụrụkwanụ na onye bi nʼụlọ ahụ abụghị onye udo, udo unu ji bịa ga-alọghachitekwara unu. 7Nọgidenụ nʼebe ahụ, na-erinụ ma na-aṅụkwanụ ihe ọbụla ha nyere unu, nʼihi na onye ọrụ kwesiri ịnata ụgwọ ọrụ ya. Unu esitela nʼotu ụlọ gaa nʼụlọ ọzọ. 8“Ọ bụrụ na ndị bi nʼobodo unu batara anabata unu, rienụ ihe ọbụla ha nyere unu. 9Gwọọnụ ndị ọrịa nọ nʼebe ahụ, gwakwanụ ha sị, ‘Alaeze Chineke adịla unu nso.’ 10Ma mgbe unu banyere nʼobodo ọbụla ha jụ ịnabata unu, pụọnụ gaa nʼokporoụzọ ya kwuo sị, 11‘Ọ bụladị aja si nʼobodo a nke nyapagidere nʼụkwụ anyị, anyị na-ehichapụ ya ka ọ bụrụ ihe ịdọ aka ntị nye gị. Otu ọ dị, matakwanụ nke a, na alaeze Chineke dị nso.’ 12Ana m agwa unu na nʼụbọchị ahụ, ga-akara Sọdọm mma karịa obodo ahụ. 13“Ahụhụ ga-adịrị gị Korazin. Ahụhụ ga-adịrị gị Betsaida. Nʼihi na ọ bụrụ na ọrụ ebube a rụrụ nʼime unu ka a rụrụ na Taịa na Saịdọn ha gaara echegharị ogologo oge, nọdụ nʼakwa mkpe na ntụ. 14Ọ ga-akara Taịa na Saịdọn mma nʼụbọchị ikpe karịa unu. 15Ma gị Kapanọm! Ị na-eche na a ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Mba! Ị ga-arịda nʼala mmụọ!
Akwụkwọ ozi
11Ma dị ka o jidere Pita na Jọn aka, ndị mmadụ niile jiri mgbagwoju anya gbara ọsọ bịakwute ha nʼakụkụ ụlọnsọ ahụ ebe a na-akpọ mgbe ụlọ Solomọn. 12Mgbe Pita hụrụ nke a, ọ gwara igwe mmadụ ahụ, “Ndị Izrel, gịnị mere ihe a ji eju unu anya? Gịnị mere unu ji ele anyị anya dịka a ga-asị na ọ bụ site nʼike nke anyị maọbụ nʼịdị nsọ anyị ka anyị jiri mee ka nwoke a gawa ije? 13Chineke nke Ebraham, nke Aịzik na nke Jekọb, Chineke nke nna anyị ha, ebuliela onye na-ejere ya ozi, bụ Jisọs elu, onye unu nyefere ka e gbuo, ma gọnarịkwa ya nʼihu Pailet, nʼagbanyeghị na o kpebiri ịhapụ ya ka ọ laa. 14Unu gọnarịrị onye ahụ dị nsọ bụrụkwa onye ezi omume, ma rịọ ka a hapụrụ unu ogbu mmadụ. 15Unu gburu onye ahụ na-enye ndụ, ma Chineke akpọlitela ya site nʼọnwụ. Anyị bụ ndị akaebe ihe ndị a. 16Ọ bụ site nʼokwukwe nʼaha ya, ọ bụ aha ya naanị mere nwoke a ka ọ dị ike onye nke unu na-ahụ ma marakwa. Okwukwe nʼime Jisọs mere ka ahụ ya zuo oke nʼihu unu niile.
Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Mak)
6Ya mere, wedanụ onwe unu nʼokpuru aka dị ike nke Chineke, ka o bulie unu elu nʼoge ya. 7Hapụrụnụ ya nsogbu unu na nchegbu unu, nʼihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nʼobi. 8Nọọnụ na njikere, na-echekwanụ nche nʼihi na onye iro unu bụ ekwensu ji oke ịgbọ ụja na-awagharị dịka ọdụm, na-achọ onye ọ ga-ala nʼiyi. 9Guzosienụ ike nʼokwukwe unu. Unu ekwela ka o merie unu, kama tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Chetanụ na e nwere ọtụtụ ndị kwere ekwe dị ka unu ndị nọkwa nʼụdị ahụhụ a unu na-ahụ nʼụwa niile. 10Chineke onye nwe amara niile, onye kpọbatara unu na ebube ebighị ebi ya nʼime Kraịst, mgbe unu hụrụ ahụhụ ndị a nwa oge, ya onwe ya ga-eweghachi unu nʼọnọdụ unu, mee ka unu dị nnọọ ike, ndị guzo chịm ma kwesikwa ntụkwasị obi. 11Ọ bụ ya nwe ike niile ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. 12Ọ bụ site nʼinyeaka Saịlas onye m hụtara dị ka nwanna kwesiri ntụkwasị obi ka m ji deere unu mkpụrụ okwu ole na ole ndị a nke m ji agbaa unu ume na-ekwupụtakwa na nke a bụ eziokwu dị nʼamara Chineke. Guzosienụ ike nʼime ya. 13Nwanyị ahụ nọ na Babilọn, nke a họpụtara unu na ya, na-ekele unu. Mak, ezi nwa m nwoke na-ekelekwa unu. 14Jirinụ isurita ọnụ ịhụnanya kelerịta onwe unu. Ka udo dịnyere unu niile nọ nʼime Kraịst.
Oziọma
22Emesịa, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼime obodo Judịa, ebe ọ nọtụrụ nwa oge, meekwa baptizim. 23Nʼotu aka ahụ, Jọn nọkwa nʼọnụ mmiri Enọn dị nso na Salim na-eme baptizim nʼihi na mmiri buru ibu nʼebe ahụ, ndị mmadụ gakwara nʼihu na-abịakwute ya, ọ na-emekwa ha baptizim. 24E tinyebeghị Jọn nʼụlọ mkpọrọ mgbe ahụ. 25Nʼoge a, ịrụrịta ụka malitere nʼetiti ndị na-eso ụzọ Jọn na otu onye Juu banyere mmemme ịdị ọcha. 26Ha bịakwutere Jọn sị ya, “Onye ozizi, onye ahụ ị gbara ama banyere ya nọ nʼofe Jọdan na-eme baptizim, mmadụ niile na-agakwukwara ya.” 27Jọn zaghachiri sị, “Ihe mmadụ nwere ike ịnata bụ naanị ihe ahụ e nyere ya site nʼeluigwe. 28Unu onwe unu ga-agbara m akaebe na m sịrị, na abụghị m Kraịst ahụ, kama e zitere m ka m buru ụzọ bịa. 29Nwanyị a na-alụ ọhụrụ bụ nke di ya. Enyi onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-eche ma na-egekwa ntị ịnụ olu ya, ọṅụ na-ejupụtakwa ya obi mgbe ọ nụrụ olu onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ. Ya mere, ọṅụ m e zuola oke ugbu a. 30Ọ ghaghị ịdị elu, ma mụ onwe m aghaghị ịdịkwa ala. 31“Onye ahụ si nʼelu bịa dị elu karịa ihe niile, onye ahụ si nʼụwa bụkwa nke ụwa ma na-ekwukwa okwu dị ka onye si nʼụwa. Onye ahụ si nʼeluigwe dị elu karịa ihe niile. 32Ọ na-agba ama banyere ihe ọ hụrụ nakwa nke ọ nụrụ, ma o nweghị onye na-anabata ama ya. 33Onye ọbụla nabatara akaebe ya ji nke a mere akara, na Chineke bụ eziokwu.
Oziọma (maka Onye nsọ Mak)
7Ọ kpọrọ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ya, nye ha ikike zipụ ha, abụọ abụọ. O nyere ha ikike ịchụpụ mmụọ na-adịghị ọcha. 8Ndị a bụ iwu o nyere: “Unu ewerekwala ihe ọbụla maka njem a, karịkwa mkpanaka. Unu ewela achịcha, maọbụ akpa, unu etinyela ego ọbụla nʼime belịt unu. 9Yirinụ akpụkpọụkwụ unu, unu eyikwala karịa otu uwe. 10Mgbe ọbụla unu banyere nʼụlọ ọbụla, nọgidenụ nʼebe ahụ ruo mgbe unu hapụrụ obodo ahụ. 11Ma ọ bụrụ na obodo ọbụla anabataghị unu maọbụ egeghị unu ntị, kụchapụnụ aja dị nʼụkwụ unu mgbe unu na-apụ, ka ọ bụrụ ihe ama megide ha.” 12Ha pụrụ kwusara ndị mmadụ ka ha chegharịa. 13Ha chụpụrụ ọtụtụ mmụọ ọjọọ, teekwa ọtụtụ ndị ahụ na-esighị ike mmanụ, gwọọ ha.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 25 Epreel na kalenda nzukọ bụ 8 Mee na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike