Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 7 Mee

Kalenda Ọtọdọks · 24 Eprel (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 7 Mee 2027

Fraịdee · Izu Ìhè · Olu 6

Mmemme na ndị nsọ

Fraịdee nke Izu Ìhè

Isi iyi na-enye ndụ nke Nne Chineke Kachasị Nsọ

Izu na-enweghị obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Ọrụ 3:1–8

1Otu ụbọchị Pita na Jọn na-aga nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere nʼoge ekpere nʼelekere atọ nke ehihie. 2Ma otu nwoke dara ngwụrọ site nʼafọ nne ya ka a na-ebute nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọnsọ ukwu ahụ ụbọchị niile ka ọ na-arịọ ndị na-aba nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ arịrịọ. Aha ọnụ ụzọ ama ahụ bụ ọnụ ụzọ ama ọma. 3Mgbe ọ hụrụ Pita na Jọn ka ha na-achọ ịba nʼụlọnsọ ukwu ahụ, o bidoro ịrịọ ha arịrịọ. 4Ma Pita na Jọn legidere ya anya, Pita sịrị, “Lee anyị anya.” 5O legidere ha anya chee na ha ga-enye ya onyinye. 6Ma Pita sịrị, “Enweghị m ọlaọcha maọbụ ọlaedo ma ihe m nwere ka m na-enye gị. Nʼaha Jisọs Kraịst onye Nazaret bilie ọtọ gawa ije.” 7O jidere ya aka nʼaka nri ya, nyere ya aka selite ya elu, ngwangwa, ụkwụ ya na nkwonkwo nke akwara ụkwụ ya nwetara ike. 8Ọ wụliri elu nʼụkwụ ya, bido ịga ije. O soro ha baa nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ya na-aga, ya ana-awụlị elu, na-etokwa Chineke.

Akwụkwọ ozi (maka Nne Chineke)

Fil 2:5–11

5Na mmekọrịta unu na ibe unu, nweenụ ụdị uche ahụ nke dị nʼime Jisọs Kraịst: 6Onye ọ bụ ezie na o nwere ụdịdị Chineke site na mmalite ma ọ gụghị ụdịdị ya dị ka Chineke dị ka ihe ọ ga-ejidesi aka ike. 7Kama, ọ gụrụ onwe ya dị ka ihe efu, site na ịnara ụdịdị nke onye bụ ohu, onye nke a mụrụ dị ka mmadụ. 8Ebe ahụrụ ya ka ọ dịka mmadụ nʼoyiyi, o wedakwara onwe ya ala, site nʼirube isi ruo ọnwụ, bụ ọnwụ nke obe. 9Ọ bụ nʼihi nke a ka Chineke ji bulie ya elu nʼebe kachasị elu, nyekwa ya aha kachasị aha niile elu. 10Ka ọ ga-abụ mgbe ọbụla a kpọrọ aha Jisọs ka ikpere niile ọbụla gbuo nʼala, ihe niile dị nʼeluigwe, ndị niile bi nʼụwa, na ndị bi nʼokpuru ụwa. 11Ka ire niile ọbụla kwupụta na Jisọs Kraịst bụ Onyenwe anyị, maka inye Chineke bụ Nna, otuto.

Oziọma

Jọn 2:12–22

12Mgbe nke a gasịrị, ọ gara Kapanọm, ya na nne ya na ụmụnne ya, nakwa ndị na-eso ụzọ ya. Ha nọrọ ụbọchị ole na ole nʼebe ahụ. 13Mgbe mmemme oriri Ngabiga nke ndị Juu na-abịaru nso, Jisọs gara Jerusalem. 14Nʼime ụlọnsọ ukwu, ọ hụrụ ndị na-ere ehi, na atụrụ na nduru. Hụkwa ndị nọdụrụ na tebul na-agbanwe ego. 15Ya mere, o jiri eriri mere ụtarị chụpụsịa ndị niile nọ na-ere ahịa nʼụlọnsọ ukwu ahụ, tinyekwara ehi na atụrụ ha. Ọ kwafusịrị mkpụrụ ego ndị ahụ na-agbanwe ego, kpugharịakwa tebul ha ihu. 16Ọ sịrị ndị ahụ na-ere nduru, “Wepụnụ ihe ndị a nʼebe a. Kwụsịnụ ime ụlọ Nna m ka ọ bụrụ ebe a na-azụ ahịa.” 17Ndị na-eso ụzọ ya chetara na e dere ya rịị nʼakwụkwọ nsọ, “Ihe banyere ụlọ gị na-anụ m ọkụ nʼobi.” 18Ma ndị Juu sịrị ya, “Olee ihe ịrịbama ị pụrụ igosi anyị na ikike i ji eme ihe ndị a.” 19Jisọs zara sị, “Kwatuonụ ụlọnsọ ukwu a, aga m ewughachikwa ya nʼabalị atọ.” 20Ndị Juu kwuru, “Ụlọnsọ ukwu a were anyị iri afọ anọ na isii ịrụ ya, ị ga-ewughachi ya nʼabalị atọ?” 21Ma ụlọnsọ o kwuru maka ya bụ ahụ ya. 22Ndị na-eso ụzọ ya chetara okwu ya a mgbe o siri nʼọnwụ bilie. Mgbe ahụkwa, ha kweere akwụkwọ nsọ ya na okwu niile Jisọs kwuru.

Oziọma (maka Nne Chineke)

Luk 10:38–42; 11:27–28

38Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ọ banyere nʼotu obodo nta ebe nwanyị a na-akpọ Mata nabatara ya nʼụlọ ya. 39O nwere nwanne nwanyị a na-akpọ Meri nke nọdụrụ ala nʼụkwụ Onyenwe anyị na-ege ntị nʼihe ọ na-ekwu. 40Ma uche Mata gbasasịrị agbasa ebe ọ na-akwado maka ile ọbịa. Ọ bịakwutere ya sị ya, “Onyenwe anyị, ọ bụ na o metụghị gị nʼobi na nwanne m nwanyị hapụrụ naanị m ije ozi niile? Gwa ya ka ọ bịa nyere m aka.” 41Ma Onyenwe anyị zara ya sị, “Mata, Mata, ị na-echegbu onwe gị ma na-adọgbukwa onwe gị banyere ọtụtụ ihe, 42maọbụ naanị otu ihe dị mkpa, Meri ahọrọla nke ka mma, nke a na-agaghị anapụkwa ya.” 11:27Mgbe ọ kpụ okwu a nʼọnụ, otu nwanyị sitere nʼime igwe mmadụ ahụ tie mkpu sị, “Ngọzị na-adịrị afọ mụrụ gị na ara nke e jiri zụọ gị.” 28Ma ọ sịrị, kama, “Ngọzị na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke, na-emekwa ha.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 24 Epreel na kalenda nzukọ bụ 7 Mee na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike