Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 8 Mee
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 8 Mee 2027
Satọdee · Izu nke 6 nke Oge Ista
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee nke izu nke 6 nke Oge Ista
Ụbọchị izu · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
23Mgbe ọ nọsịrị nwa oge nta nʼebe ahụ, ọ sitere nʼebe ahụ pụọ jegharịa nʼakụkụ obodo Galeshịa na Frigia na-agba ndị na-eso ụzọ ahụ ume. 24Ma otu nwoke onye Juu, aha ya bụ Apọlọs, onye Alegzandria bịara na Efesọs. Ọ bụ onye ọka okwu, bụrụkwa onye maara ihe edere nʼAkwụkwọ Nsọ nke ọma. 25Nwoke a natara ozizi banyere ụzọ Onyenwe anyị. O sitekwara nʼịnụ ọkụ nke obi kuzie nnọọ ihe ziri ezi banyere Jisọs. Ma ihe ọ maara bụ naanị ihe gbasara baptizim Jọn mere. 26Ma ọ nọgidesịrị ike na-ekwuwa okwu nʼụlọ nzukọ. Mgbe Prisila na Akwila nụrụ okwu ya, ha jekwuru ya, duru ya gaa nʼụlọ, were nwayọọ kọwaara ya ihe niile banyere ụzọ Chineke. 27Mgbe o zubere ịga obodo Akaịa, ndị ụmụnna gbara ya ume. Ha degaara ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ akwụkwọ ka ha nabata ya. Mgbe ọ bịaruru, Onyenwe anyị sitere nʼaka ya mee ka amara ya baa ụba nʼebe ndị kwere ekwe nọ. 28Nʼihi na nʼihu ndị mmadụ niile, o guzoro kwuo okwu megide ozizi ọjọọ na ịrụ ụka niile nke ndị Juu. O gosiri ha site nʼakwụkwọ nsọ na Jisọs bụ Kraịst ahụ.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Abụ Ọma. Kụọnụ aka unu, unu mba niile; jiri iti mkpu ọṅụ tikuo Chineke. 2Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke kachasị ihe niile elu. Ọ dị egwu! Ọ bụ eze ukwu na-achị ụwa niile. 7Nʼihi na Chineke anyị bụ eze ụwa niile. Jirinụ abụ too ya. 8Chineke bụ eze mba niile; ọ na-anọkwasị nʼocheeze ya dị nsọ na-achị mba niile. 9Ndị niile a ma ama na mba niile ezukọtaala, dịka ndị Chineke nke Ebraham, nʼihi na ndị eze niile dị nʼụwa bụ nke Chineke; ọ bụ onye e buliri elu nʼebe ọ dị ukwuu.
Oziọma
23Ma nʼụbọchị ahụ, unu agakwaghị arịọ m ihe ọbụla. Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ihe ọbụla unu ga-arịọ Nna m nʼaha m, ọ ga-enye unu. 24Ruo ugbu a, ọ dịbeghị ihe unu rịọrọ nʼaha m. Rịọọnụ, unu ga-arịọta, ka ọṅụ unu zukwaa oke. 25“Eji m ilu na-agwa unu okwu ugbu a, ma oge na-abịa mgbe m na-agaghị ejikwa ilu gwa unu okwu. Mgbe ahụ ka m ga-akọwara unu niile ihe banyere Nna m nʼụzọ unu ga-aghọta ya. 26Nʼụbọchị ahụ, unu ga-arịọ ihe nʼaha m. Asịghị m unu na m ga-arịọ Nna ihe nʼihi unu. 27Nʼihi na Nna m nʼonwe ya hụrụ unu nʼanya, nʼihi na unu hụrụ m nʼanya kwerekwa na m si nʼebe Chineke nọ bịa. 28Esi m nʼebe Nna nọ pụta, bịa nʼime ụwa. Ana m ahapụkwa ụwa ịlaghachikwuru Nna.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike