Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 6 Mee

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 6 Mee 2027

Tọọzdee · Izu nke 6 nke Oge Ista

Mmemme na ndị nsọ

Mrigo Eluigwe nke Onyenwe anyị

Mmemme ukwu · Agba ofufe: ọcha

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọrụ 1:1–11

1Ezigbo enyi m Tiofilọs, nʼakwụkwọ m nke mbụ m dere gị banyere ihe niile Jisọs malitere ime nakwa ikuzi, 2ruo nʼụbọchị e mere ka ọ laghachi nʼeluigwe mgbe o sitere nʼike Mmụọ nsọ nyesịa ndị na-eso ụzọ ya iwu, bụ ndị ọ họpụtara. 3Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ nke ọnwụ, o gosiri ha onwe ya nʼụzọ dị iche iche nʼebe o doro anya na ya dị ndụ. O mere ka ha hụ ya anya nʼime iri ụbọchị anọ, na-akụziri ha banyere alaeze Chineke. 4Nʼotu oge, ọ nọnyeere ha na nri, o nyere ha iwu a, “Unu esila na Jerusalem pụọ, kama cherenụ nkwa nke Nna m, nke unu nụrụ site nʼọnụ m. 5Nʼihi na Jọn jiri mmiri mee unu baptizim, ma nʼoge na-adịghị anya, a ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.” 6Mgbe ha gbakọrọ, ha jụrụ ya, “Onyenwe anyị, ọ bụ ugbu a ka i ga-enyeghachi Izrel alaeze ahụ?” 7Ma ọ sịrị ha, “Ọ bụghị ọrụ unu ịmata oge na mgbe Nna m na-akwado ihe o zubere ime nʼikike nke onwe ya. 8Ma mgbe Mmụọ Nsọ bịakwasịrị unu, unu ga-anata ike. Mgbe ahụ, unu ga-agbara m ama na Jerusalem, na Judịa niile ya na Sameria ruokwa ebe niile ụwa sọtụrụ.” 9Mgbe o kwusiri nke a, e weliri ya elu mgbe ha na-ele anya, igwe ojii kpuchikwara ya, zopu ya nʼanya ha. 10Mgbe ha na-elegidesi anya ike nʼeluigwe dịka ọ na-ala, na mberede, ụmụ nwoke abụọ yi uwe ọcha guzooro ha nso. 11Ha sịrị, “Ndị ikom Galili, gịnị mere unu jiri guzoro ebe a na-ele anya nʼeluigwe? Jisọs a onye e sitere nʼetiti unu kpọrọ laa nʼeluigwe ga-alọghachikwa otu ahụ unu si hụ ya o siri laa nʼeluigwe.”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 47:1–2, 5–8

1Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Abụ Ọma. Kụọnụ aka unu, unu mba niile; jiri iti mkpu ọṅụ tikuo Chineke. 2Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke kachasị ihe niile elu. Ọ dị egwu! Ọ bụ eze ukwu na-achị ụwa niile. 5Chineke ewerela iti mkpu ọṅụ rigoro nʼeluigwe. Onyenwe anyị ewerela olu opi ike rigoo. 6Bụkuonụ Chineke abụ otuto, bụọ abụ otuto; bụkuonụ eze anyị abụ otuto, bụọ abụ otuto. 7Nʼihi na Chineke anyị bụ eze ụwa niile. Jirinụ abụ too ya. 8Chineke bụ eze mba niile; ọ na-anọkwasị nʼocheeze ya dị nsọ na-achị mba niile.

Ihe ọgụgụ nke abụọ

Efe 4:1–13

1Ya mere, mụ onwe m bụ onye mkpọrọ nke Onyenwe anyị, na-arịọ unu ka unu bie ndụ kwesiri ọkpụkpọ nke a kpọrọ unu. 2Werekwanụ obi dị umeala niile na ịdị nwayọọ, na ndidi na-anagide ibe unu nʼịhụnanya. 3Nọọnụ nʼudo nʼetiti onwe unu gbalịakwanụ ime ka ịdị nʼotu unu dịgide nʼime Mmụọ Nsọ. 4E nwere otu ahụ na otu Mmụọ, dị ka e siri kpọọ unu nʼotu olileanya nke dịịrị ọkpụkpọ a kpọrọ unu. 5Otu Onyenwe anyị dị, otu okwukwe na otu baptizim. 6Ọ bụkwa naanị otu Chineke dị onye bụ Nna ihe niile na onye na-achị ihe niile, na onye na-arụ ọrụ ya nʼime ihe niile, na-ebikwa nʼime ihe niile. 7Ma e nyere onye ọbụla amara dịka oke onyinye nke Kraịst siri dị. 8Nʼihi nke a, e kwuru, “Mgbe ọ rigoro gaa nʼelu, o duuru igwe ndị a dọtara nʼagha, nyekwa ụmụ mmadụ onyinye dị iche iche.” 9(E kwuru, “Ọ rigoro,” gịnị ka ọ pụtara ma ọ bụghị na o buru ụzọ rịdaa nʼime ala mmụọ? 10Onye ahụ si nʼelu rịdata bụkwa otu onye ahụ rigoro nʼeluigwe, ka o nwee ike mejuo ihe niile.) 11O nyekwara ụfọdụ onyinye ị bụ ndị ozi, ụfọdụ ndị amụma, ụfọdụ ndị nkwusa oziọma, ụfọdụ ndị ụkọchukwu na ndị nkuzi. 12Nke a bụ maka ikwadobe ndị nsọ maka ọrụ nke ije ozi, iji wulite ahụ nke Kraịst; 13tutu anyị niile abịa na nkwekọta banyere okwukwe anyị, na ọmụma ihe banyere ọkpara Chineke, bụrụ onye tozuru oke, ruo ọtụtụ nke ogogo na ozuzu oke nke Kraịst.

Oziọma

Mak 16:15–20

15Ọ gwara ha sị, “Gaanụ nʼime ụwa niile kwusaara ihe niile e kere eke oziọma. 16Onye ọbụla kweerenụ na onye e mekwara baptizim ka a ga-azọpụta. Ma a ga-ama onye ọbụla na-ekwereghị ikpe. 17Ihe ịrịbama ndị a ga-esokwa ndị kwerenụ. Site nʼaha m, ha ga-achụpụ mmụọ ọjọọ; kwuokwa okwu nʼasụsụ ọhụrụ dị iche iche. 18Ha ga-eji aka ha abụọ atụtụlie agwọ, ṅụọkwa nsi ma ọ gaghị emerụ ha ahụ ma otu. Ha ga-ebikwasị ndị ọrịa aka, ahụ ga-adịkwa ha mma.” 19Mgbe Onyenwe anyị Jisọs gwasịrị ha okwu ndị a, e weliri ya elu, baa nʼeluigwe, ebe ọ nọdụ ala nʼakụkụ aka nri Chineke. 20Ha pụrụ kwusaa oziọma nʼebe niile. Onyenwe anyị nọnyekwaara ha, mee ka okwu ya guzosie ike site nʼihe ịrịbama dị iche iche nke na-eso ya.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike