Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 7 Mee
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 7 Mee 2027
Fraịdee · Izu nke 6 nke Oge Ista
Mmemme na ndị nsọ
Fraịdee nke izu nke 6 nke Oge Ista
Ụbọchị izu · Agba ofufe: ọcha
Obubu ọnụ na nchegharị
Ụbọchị nchegharị
Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
9Onyenwe anyị gwara Pọl nʼọhụ nʼotu abalị sị, “Atụla egwu, kwusie okwu ike, emechikwala ọnụ gị. 10Nʼihi na anọnyeere m gị. Ọ dịkwaghị onye ọbụla pụrụ imerụ gị ahụ. Enwekwara m ọtụtụ mmadụ nʼime obodo a.” 11Ọ nọgidere ebe ahụ otu afọ na ọkara. Ọ na-ezikwa ndị mmadụ okwu Chineke. 12Mgbe Galio malitere ịchị achị nʼobodo Akaịa, ndị Juu bidoro omume ọjọọ megide Pọl. Nʼikpeazụ, ha dupụtara ya, gaa nʼụlọikpe. 13Ha sịrị, “Nwoke a na-amanye ndị mmadụ ka ha na-ekpere Chineke nʼụzọ megidere iwu.” 14Ma mgbe Pọl chọrọ ikwu okwu, Galio sịrị ndị Juu ahụ, “Agaara m enwe ndidi gee unu ntị ma ọ bụrụ na okwu a gbasara mmejọ mmadụ mejọrọ ibe ya, maọbụ arụ mmadụ mere megide obodo. 15Ma ebe unu na-ekwu ihe banyere okwu na aha dị iche iche nakwa iwu unu, gaanụ dozie ya nʼonwe unu. Agaghị m abụ onye ikpe okwu ihe ndị dị otu a.” 16O sitere nʼime ụlọ ikpe ya chụpụ ha. 17Ha jidere Sostenis, onye bụ onyeisi ụlọ nzukọ ahụ tie ya ihe nke ukwuu nʼọnụ ụzọ ụlọ ikpe ahụ. Ma Galio emeghị dịka ọ maara ihe na-eme nʼebe ahụ. 18Mgbe ọ nọsịrị nʼebe ahụ ọtụtụ ụbọchị, Pọl sịrị ndị kwere ekwe nọ nʼebe ahụ ka ha nọdụnụ nke ọma, ma si nʼebe ahụ banye nʼụgbọ mmiri ruo Siria. Prisila na Akwila sokwaara ya gaa. Nʼobodo a na-akpọ Senkria, ọ kpụchara agịrị isi ya, nʼihi nkwa o kwere.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Abụ Ọma. Kụọnụ aka unu, unu mba niile; jiri iti mkpu ọṅụ tikuo Chineke. 2Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke kachasị ihe niile elu. Ọ dị egwu! Ọ bụ eze ukwu na-achị ụwa niile. 3O wedara mba niile mee ka ha nọọ nʼokpuru anyị; ndị mmadụ niile nọ nʼokpuru ụkwụ anyị. 4Ọ họpụtaara anyị ihe nketa anyị, ihe ịnya isi nke Jekọb, onye ọ hụrụ nʼanya. Sela 5Chineke ewerela iti mkpu ọṅụ rigoro nʼeluigwe. Onyenwe anyị ewerela olu opi ike rigoo. 6Bụkuonụ Chineke abụ otuto, bụọ abụ otuto; bụkuonụ eze anyị abụ otuto, bụọ abụ otuto.
Oziọma
20Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, unu ga-akwa akwa ma nwekwa obi mwute, ma ụwa ga-aṅụrị ọṅụ. Ma iru ụjụ unu ga-aghọrọ unu ọṅụ. 21Mgbe ime na-eme nwanyị, ọ na-anọ nʼọnọdụ ihe mgbu. Mgbe ọ mụsịrị nwa ya, ọ dịghị echetakwa ihe mgbu ya ọzọ. Nʼihi ọṅụ na a mụpụtala nwa nʼelu ụwa. 22Unu nọ nʼọnọdụ iru ụjụ ugbu a, ma aga m ahụ unu anya ọzọ, obi unu ga-ejupụta nʼọṅụ. Mmadụ ọbụla apụghịkwa ịnapụ unu ọṅụ unu. 23Ma nʼụbọchị ahụ, unu agakwaghị arịọ m ihe ọbụla. Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ihe ọbụla unu ga-arịọ Nna m nʼaha m, ọ ga-enye unu.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike