Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 6 Mee
Kalenda Ọtọdọks · 23 Eprel (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 6 Mee 2027
Tọọzdee · Izu Ìhè · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Tọọzdee nke Izu Ìhè
Izu na-enweghị obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka Onye nsọ Joj)
9Mba niile dị iche iche ezukọtala, mmadụ niile agbakọtakwala. Onye nʼime chi ha kwuru na ihe dị otu a ga-eme, onye kwa kwuru ihe ndị a mere nʼoge gara aga? Ka ha kpọbata ndị akaebe ha izipụta na ihe ha kwuru ziri ezi, ka ndị ọzọ nụ ya ma sị na, “Ọ bụ eziokwu.” 10“Unu bụ ndị akaebe m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “bụrụkwa ndị ohu m họpụtara, ka unu mara m, ma kwerekwa na m, ghọtakwa na Mụ onwe m bụ onye ahụ. Ọ dịghị chi a kpụrụ tupu m dịrị, ọ dịkwaghị nke ga-eso m nʼazụ. 11Mụ, ọ bụ na naanị m, bụ Onyenwe anyị, ọ dịkwaghị onye nzọpụta ọzọ dị ma ewezuga m. 12Mụ onwe m egosila, zọpụta ma kwupụtakwa ya, mee ka unu nụrụ ya, mụ onwe m, ọ bụghị chi ndị mba ọzọ nọ nʼetiti unu. Unu bụkwa ndị akaebe m, na mụ onwe bụ Chineke,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 13“E, site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi, mụ onwe m bụ Chineke. Ọ dịghị onye pụrụ ịnapụta m ihe m ji nʼaka. Mgbe m rụrụ ọrụ, onye pụrụ ịgbanwe ya?” 14Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, Onye mgbapụta unu na Onye nsọ nke Izrel. “Nʼihi unu, aga m eziga ozi na Babilọn budata ndị Kaldịa niile dịka ndị gbapụrụ agbapụ, nʼime ụgbọ mmiri ahụ niile ha ji anya isi.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka Onye nsọ Joj)
Ọ dịghị na nsụgharị a
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka Onye nsọ Joj)
Ọ dịghị na nsụgharị a
Ofufe ụtụtụ: Oziọma (maka Onye nsọ Joj)
2Nʼihi na ọ dịghị ihe ọbụla zoro ezo nke na-agaghị apụta ìhè, ọ dịkwaghị ihe e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị ekpughe. 3Ihe ọbụla unu kwuru nʼọchịchịrị, a ga-anụ ya nʼihe, ihe ọbụla unu gbara nʼizu nʼime ụlọ ka a ga-ekwusa nʼelu ụlọ. 4“Ana m agwa unu, ndị enyi m, unu atụla egwu maka ndị na-egbu anụ ahụ ma e mesịa, ha apụghị ime ihe ọzọ. 5Ma aga m ezi unu onye unu ga-atụ egwu. Tụọnụ egwu Onye ahụ nwere ikike igbu anụ ahụ ma tụbakwa ya nʼọkụ ala mmụọ. E, asị m unu tụọnụ ya egwu. 6Ọ bụghị mkpụrụ ego abụọ ka a na-ere ụmụ nza ise? Ma o nweghị nke ọbụla nʼime ha Chineke chefuru. 7Nʼezie a gụrụ ọ bụladị agịrị isi dị nʼisi unu ọnụ. Unu atụla egwu, nʼihi na unu dị oke ọnụ karịa ọtụtụ ụmụ nza. 8“Ma asị m unu, na onye ọbụla kwupụtara m nʼihu ụmụ mmadụ, onye ahụ ka Nwa nke Mmadụ ga-ekwupụta nʼihu ndị mmụọ ozi nke Chineke. 9Onye ọbụla na-agọnarị m nʼihu ndị mmadụ, a ga-agọnarịkwa ya nʼihu ndị mmụọ ozi nke Chineke. 10Onye ọbụla nke ga-ekwu okwu megide Nwa nke Mmadụ, a ga-agbaghara ya, ma onye ọbụla na-ekwulu Mmụọ Nsọ, agaghị agbaghara ya. 11“Mgbe ha ga-akpọbata unu nʼihu ụlọ nzukọ, ndị ọchịchị na ndịisi, unu echegbula onwe unu otu unu ga-esi zaghachi, maọbụ ihe unu ga-aza, maọbụ ihe unu ga-ekwu. 12Nʼihi na Mmụọ Nsọ ga-ezi unu nʼoge awa ahụ, ihe unu kwesiri ikwu.”
Akwụkwọ ozi
38Ma Pita sịrị ha, “Chegharịanụ unu niile. Ka e mekwa unu baptizim nʼaha Jisọs Kraịst, maka mgbaghara mmehie unu. Unu ga-anatakwa onyinye nke Mmụọ Nsọ. 39Nkwa a dịrị unu na ụmụ ụmụ unu na mmadụ niile nọ nʼebe dị anya, dịkwara ndị niile Onyenwe anyị Chineke ga-akpọ ka ha bịakwute ya.” 40O jiri ọtụtụ okwu ndị ọzọ gbaa ama, ma dụọkwa ha ọdụ sị, “Sitenụ nʼetiti ọgbọ a jọrọ njọ zọpụta onwe unu.” 41E mere ndị nabatara okwu ya baptizim, ha dị ihe ruru puku mmadụ atọ, a gụnyere nʼọnụọgụgụ ha. 42Ha nyefere onwe ha nʼozizi nke ndị ozi, ya na ife ofufe na ịnyawa achịcha nakwa ikpe ekpere. 43Onye ọbụla nʼime ha jupụtara na egwu, nʼihi na ndị ozi na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube, na ihe ịrịbama dị iche iche.
Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Joj)
1Nʼoge ahụ, eze Herọd jidere ụfọdụ ndị so na chọọchị buru nʼobi ịkpagbu ha. 2O jiri mma agha gbuo Jemis nwanne Jọn. 3Mgbe ọ chọpụtara na omume ya tọrọ ndị Juu ụtọ, ọ gara nʼihu jidekwa Pita. Nke a mere nʼoge mmemme Achịcha Ekoghị eko. 4Mgbe o jidere ya, o tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ ebe o mere ka ndị agha chee ya nche, ndị agha anọ nʼotu oge, ndị agha anọ ọzọ nʼoge nke ọzọ. Ebumnobi ya bụ ịkpọpụta ya nʼihu ọha mmadụ kpee ya ikpe mgbe Mmemme Ngabiga gasịrị. 5Mgbe e debere Pita nʼụlọ mkpọrọ, nzukọ esepụghị aka nʼikpe ekpere nʼihi ya nye Chineke. 6Ma nʼabalị na-esota ụbọchị ahụ Herọd ga-akpụpụta ya, Pita nọ nʼụra nʼetiti ndị agha abụọ, e jiri eriri igwe kee ya nʼụkwụ nʼaka, ma ndị nche ọzọ nọkwa nʼọnụ ụzọ na-eche ya nche. 7Na mberede mmụọ ozi Onyenwe anyị bịara guzoro nʼebe ahụ, ìhè nwukwara nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ. Ọ kutụrụ Pita aka nʼakụkụ sị, “Ngwangwa, bilie ọtọ!” Eriri igwe ahụ dapụrụ nʼaka ya. 8Mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Yiri uwe gị na akpụkpọụkwụ gị.” O mere otu ahụ, Mmụọ ozi ahụ gwakwara ya, “Yirikwa akwa mgbokwasị gị soro m.” 9Pita sooro ya nʼazụ, o chere na ọ na-ahụ ọhụ, ma ọ mataghị na ihe mmụọ ozi ahụ na-eme bụ ezie. 10Ha gafere ndị nche nke mbụ na nke abụọ rute nʼọnụ ụzọ e si abanye nʼime obodo, nke bụ ọnụ ụzọ igwe. Ọnụ ụzọ igwe ahụ meghekwara nʼonwe ya, ha esite na ya gafee. Mgbe ha gara ije ruo ebe tere anya nʼama nke ọzọ, ngwangwa mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya. 11Mgbe ahụ kwa ka Pita ghọtara ihe niile mere. O kwuru, “Ugbu a, amatala m nʼezie, na Onyenwe anyị ezitela mmụọ ozi ya, ka ọ bịa zọpụta m site nʼaka eze Herọd na ihe niile ndị Juu na-atụ anya ya. Ugbu a ọ napụtakwala m site nʼọchịchọ ọjọọ niile nke ndị Juu.”
Oziọma
1O nwere otu nwoke onyeisi ndị Juu nke so nʼotu ndị Farisii aha ya bụ Nikọdimọs. 2Ọ bịakwutere ya nʼabalị sị ya, “Onye ozizi, anyị maara na ị bụ onye ozizi sitere na Chineke, nʼihi na o nweghị onye ọbụla pụrụ ịrụ ọrụ ebube dị otu a ma ọ bụrụ na Chineke anọnyereghị ya.” 3Jisọs zara sị ya, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na amụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ alaeze Chineke anya.” 4Nikọdimọs sịrị ya, “Olee otu a ga-esi mụgharịa mmadụ mgbe o mere okenye? Ọ ga-aba nʼafọ nne ya nke ugboro abụọ?” 5Ma Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na amụghị mmadụ site na mmiri na Mmụọ Nsọ, o nweghị ike ịba nʼalaeze Chineke. 6Ihe e si nʼanụ ahụ mụọ bụ anụ ahụ, ma ihe a mụrụ site na Mmụọ bụ mmụọ. 7Ya ejula gị anya na m sịrị gị, ‘Agaghị ịmụ unu ọzọ.’ 8Ifufe na-efe nʼebe ọbụla masịrị ya. I nwere ike nụ ụzụ ya ma ịmataghị ebe o si abịa maọbụ ebe ọ na-aga. Otu a ka ọ dịkwara onye ọbụla a mụrụ site na Mmụọ.” 9Nikọdimọs zara sị ya, “Olee otu ihe ndị a ga-esi mee?” 10Jisọs zara sị ya, “Ị bụ onye ozizi ndị Izrel, ma ị ghọtaghị ihe ndị a? 11Nʼezie, nʼezie agwa m unu. Anyị na-ekwu banyere ihe anyị maara, na-akọwapụtakwa ihe anyị hụrụ, ma unu onwe unu adịghị anabata akaebe anyị. 12Ekwuola m banyere ihe dị nʼụwa ma unu ekweghị ya, oleekwanụ otu unu ga-esi kwere, ma ọ bụrụ na mụ agwa unu banyere ihe ndị dị nʼeluigwe? 13O nwebeghị onye ọbụla rigooro nʼeluigwe ewezuga Nwa nke Mmadụ bụ onye siri nʼeluigwe rịdata. 14Dị ka Mosis weliri agwọ elu nʼime ọzara, otu a ka a ga-ewelikwa Nwa nke Mmadụ elu. 15Ka onye ọbụla kwere na ya nwee ndụ ebighị ebi.”
Oziọma (maka Onye nsọ Joj)
17Ihe ndị a ka m na-enye unu nʼiwu, hụrịtanụ onwe unu nʼanya. 18“Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, chetanụ na o buru ụzọ kpọọ m asị. 19A sị na unu bụ nke ụwa, ụwa ga-ahụ unu nʼanya dịka ndị nke ya. Ma otu ọ dị unu abụghị nke ụwa. Kama, esi m nʼime ụwa họrọ unu. Ọ bụkwa nʼihi ya ka ụwa ji akpọ unu asị. 20Chetakwanụ ihe m gwara unu, ‘Ohu adịghị adị ukwuu karịa Onyenwe ya.’ Ya mere, ebe ha kpagburu m, ha ga-akpagbukwa unu. Ọ bụrụ na ha debere okwu m, ha ga-edebekwa nke unu. 21Ee, ha ga-eme unu ihe niile ndị a nʼihi aha m, na nʼihi na ha amaghị onye ahụ zitere m. 22Ọ bụrụ na abịaghị m, gwa ha okwu, ikpe mmehie agaraghị ama ha. Ma ugbu a, ha enweghị ngọpụ ọbụla banyere mmehie ha. 23Onye ọbụla kpọrọ m asị kpọkwara Nna m asị. 24A sị na ọrụ niile m rụrụ nʼetiti ha akarịghị ọrụ nke onye ọbụla ọzọ rụrụ, ha agaraghị abụ ndị ikpe mmehie mara. Ma ugbu a ha ahụzuola ọrụ ebube ndị a niile, ma ha nọgidekwara na-akpọ mụ na Nna m asị. 25Nke a bụ imezu ihe e dere nʼakwụkwọ iwu ha. ‘Ha kpọrọ m asị na-enweghị ihe m mere.’ 26“Mgbe Onye Ndụmọdụ ahụ ga-abịa, onye m ga-ezitere unu site nʼaka Nna, bụ Mmụọ eziokwu ahụ sitere na Nna pụta, ọ ga-agba ama banyere m. 27Ma unu onwe unu aghaghị ịgba ama, nʼihi na mụ na unu anọọla site na mmalite. 16:1“Ihe ndị a niile ka m gwara unu ka unu ghara ịda. 2Ha ga-esite nʼụlọ ekpere ha chụpụ unu. Nʼezie, oge na-abịa mgbe onye ọbụla ga-egbu unu ga-echekwa na ọ na-efe Chineke mgbe ha na-eme nke a.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 23 Epreel na kalenda nzukọ bụ 6 Mee na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike