Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 24 Epreel

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 24 Epreel 2027

Satọdee · Izu nke 4 nke Oge Ista

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee nke izu nke 4 nke Oge Ista

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: ọcha

Onye nsọ Fidelis nke Sigmaringen, Onye ụkọchukwu na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọrụ 13:44–52

44Nʼụbọchị izuike ọzọ ahụ, ọtụtụ ndị bi nʼobodo ahụ pụtara ịnụrụ okwu Onyenwe anyị. 45Mgbe ndị Juu hụrụ igwe mmadụ ndị a, obi ha jupụtara nʼekworo, ha bidokwara ikwu okwu ọjọọ megide okwu niile Pọl na-ekwu. 46Ma Pọl na Banabas kwuru okwu na-asọghị anya sị, “Ọ dị mkpa na anyị buuru ụzọ gwa unu okwu nke Chineke, ma ebe ọ bụ na unu jụrụ ịnabata ya, na-echekwa na unu ekwesighị inweta ndụ ebighị ebi, lee, anyị ga-agakwuru ndị mba ọzọ. 47Nʼihi na nke a bụ ihe Onyenwe anyị nyere anyị nʼiwu, “ ‘Emeela m ka unu bụrụ ìhè nye ndị mba ọzọ, ka ị nwee ike weruo nzọpụta nʼebe niile ụwa sọtụrụ.’” 48Mgbe ndị mba ọzọ nụrụ ihe ndị a, obi tọrọ ha ụtọ, ha sọpụkwara okwu nke Onyenwe anyị. Ya mere ndị niile a họpụtara inweta ndụ ebighị ebi bụ ndị kwenyerenụ. 49Ya mere okwu Onyenwe anyị gbasara ruo ebe niile nʼobodo ahụ. 50Mgbe ahụ, ndị Juu kpaliri obi ọtụtụ ụmụ nwanyị na-atụ egwu Chineke ndị ọnọdụ ha dị elu, na ndị ikom ndị nke ndu obodo ahụ. Ha kpasuru mkpagbu megide Pọl na Banabas si otu a, chụpụ ha site nʼobodo ahụ. 51Ha tichapụrụ aja dị nʼụkwụ ha ka ọ bụrụ ihe ịdọ aka na ntị mmegide ha. Ha hapụrụ obodo ahụ gaa Aikoniọm. 52Ma ndị na-eso ụzọ ya jupụtakwara nʼọṅụ na nʼike nke Mmụọ Nsọ.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 98:1–4

1Abụ Ọma. Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ, nʼihi na ọ rụọla ọtụtụ ọrụ dị ebube; aka nri ya na aka nsọ ya arụpụtarala ya nzọpụta. 2Onyenwe anyị emeela ka a mata nzọpụta ya o kpugheela ezi omume ya nye mba niile. 3O chetala ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya nʼebe ụlọ Izrel dị; nsọtụ nke ụwa niile ahụla nzọpụta Chineke anyị. 4Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile jirinụ iti egwu tiwaa mkpu abụ ọṅụ;

Oziọma

Jọn 14:7–14

7Ọ bụrụ na unu maara onye m bụ, unu gaara amatakwa Nna m. Site ugbu a, unu amatala ya. Ma hụkwa ya.” 8Filip sịrị ya, “Onyenwe anyị, zi anyị Nna ahụ, afọ ga-ejukwa anyị.” 9Jisọs sịrị ya, “Ọtụtụ oge ndị a mụ na unu nọrọ ọ bụ na ị matabeghị onye m bụ, Filip? Onye ọbụla hụrụ m ahụla Nna. Olee otu i si asị, ‘zi anyị Nna ahụ?’ 10Ọ bụ na i kweghị na m nọ nʼime Nna, na Nna nọkwa nʼime m? Okwu niile m na-agwa unu esitekwaghị nʼebe m nọ pụta, kama ọ bụ Nna bi nʼime m na-arụ ọrụ ya. 11Kwere ihe m kwuru na anọ m nʼime Nna, na Nna nọkwa nʼime m. Ma ọ bụghị otu a, kwerenụ nʼihi ọrụ ebube ndị a. 12Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla kwere na m ga-arụ ọrụ ndị m rụrụ, rụọkwa ọrụ karịrị ndị a, nʼihi na m na-alakwuru Nna m. 13Ihe ọbụla unu ga-arịọ site nʼaha m, aga m enye unu ya, ka e nwe ike nye Nna ahụ otuto site nʼỌkpara ya. 14Ihe ọbụla unu rịọrọ nʼaha m, aga m eme ya.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike