Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 22 Epreel
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 22 Epreel 2027
Tọọzdee · Izu nke 4 nke Oge Ista
Mmemme na ndị nsọ
Tọọzdee nke izu nke 4 nke Oge Ista
Ụbọchị izu · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
13Pọl na ndị otu ya ji ụgbọ mmiri site na Pafọs garuo Pega nke dị nʼala Pamfilia. Nʼebe a ka Jọn hapụrụ ha laghachi Jerusalem. 14Site na Pega ha gara ruo Antiọk obodo nke dị na Pisidia. Nʼụbọchị izuike, ha banyere nʼụlọ nzukọ ndị Juu nọdụ ala. 15Mgbe a gụpụtasịrị site nʼakwụkwọ iwu na nke ndị amụma, ndịisi ụlọ ekpere ahụ zigara ya ozi, sị, “Ụmụnna anyị, ọ bụrụ na unu nwere okwu ịgbaume nye anyị, biko kwuonụ ya.” 16Pọl guzoro ọtọ nʼetiti ha feere ha aka ya, sị, “Unu ndị Izrel na unu ụmụnna m ndị mba ọzọ na-atụ egwu Chineke. Geenụ m ntị. 17Chineke nke Izrel họpụtara nna nna anyị ha mee ha mba dị ukwu nʼoge ha nọ nʼobodo Ijipt. O ji ike aka ya dupụta ha site nʼala ahụ. 18Ọ nagidere ha iri afọ anọ nʼime ọzara. 19O bibiri mba asaa dị ukwuu nʼime ala Kenan nʼihi ha, nyekwa ndị ya obodo a ka ọ bụrụ nke ha. 20Nke a bụ ihe dị ka narị afọ anọ na iri afọ ise. “Mgbe nke a gasịrị, o nyere ha ndị ikpe dị iche iche ruo oge Samuel onye amụma. 21Mgbe ahụ ha rịọrọ ka enye ha eze, Chineke nyekwara ha Sọl, nwa Kish, onye si nʼagbụrụ Benjamin pụta, onye chịrị iri afọ anọ. 22Mgbe o wepụsịrị ya, o mere Devid ka ọ bụrụ eze ha. Ọ gbara ama banyere ya sị, ‘Achọtala m Devid nwa Jesi, nwoke nke dị ka ọchịchọ obi m nke si dị. Ọ bụkwa onye ga-eme ihe niile m chọrọ ka o mee.’ 23“Jisọs onye si nʼezinaụlọ Devid pụta ka Chineke wetaara Izrel Onye nzọpụta ahụ bụ Jisọs, dịka o kwere nkwa izite. 24Ma tupu ọbịbịa ya, Jọn ekwusala nye ndị Izrel banyere baptizim nke nchegharị. 25Nʼoge Jọn na-arụsị ọrụ ya, ọ na-asị, ‘Onye ka unu chere na m bụ? Abụkwaghị m onye ahụ. Mba! Abụghị m ya. Ma otu onye ahụ na-abịa nʼazụ m, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya.’
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ maskil nke Etan, onye Ezra. Aga m abụ abụ banyere oke ịhụnanya Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi; aga m eji ọnụ m mee ka ọgbọ niile mara maka ikwesi ntụkwasị obi gị. 2Aga m ekwupụta na ịhụnanya gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; na i mere ka ikwesi ntụkwasị obi gị, guzosie ike nʼeluigwe. 20Achọtala m Devid ohu m, were mmanụ nsọ m tee ya. 21Aka m ga-agba ya ume; nʼezie, aka m ga-eme ka ọ dị ike. 24Ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi ga-adịnyere ya, site nʼaha m, a ga-ebuli mpi ya elu. 26Ọ ga-akpọ m sị m, ‘Ị bụ Nna m, bụrụkwa Chineke m, na oke Nkume nzọpụta m.’
Oziọma
16Nʼezie, nʼezie, ohu adịghị adị ukwuu karịa nna ya ukwu, maọbụ onye e ziri ozi a karịa onye ziri ya ozi. 17Ọ bụrụ na unu a mara ihe ndị a, ngọzị ga-adịrị unu ma unu mee ha. 18“Anaghị m ekwu maka unu niile, amaara m ndị m họpụtara. Ma nke a bụ imezu ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, ‘Onye mụ na ya na-erikọ nri ebiliela megide m.’ 19“Ana m agwa unu ugbu a tupu ihe ndị a emee, ka unu kwere na mụ bụ ya mgbe ọ ga-emezu. 20Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla nabatara onye m zitere nabatara m. Onye ọbụla nabatara m nabatakwara onye zitere m.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike