Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 18 Epreel
Kalenda Ọtọdọks · 5 Eprel (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 18 Epreel 2027
Sọnde · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 5 nke Lent Ukwu
Oge Lent Ukwu
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 2
1Mgbe ụbọchị izuike gafere, Meri Magdalin na Meri nne Jemis na Salomi zụtara ụda dị iche iche ha ga-eji tee ahụ ya mmanụ. 2Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu, mgbe anyanwụ wara, ha biliri gawa nʼili ahụ. 3Ha jụrịtara onwe ha na-asị, “Onye ga-enupuru anyị nkume ahụ dị nʼọnụ ụzọ ili ahụ?” 4Ma mgbe ha leliri anya, ha hụrụ na e nupụla nkume ukwu ahụ. 5Mgbe ha banyere nʼime ili ahụ, ha hụrụ otu nwokorobịa yi uwe ọcha ka ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ aka nri nke ili ahụ. Ha tụrụ oke egwu. 6Ma ọ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Unu na-achọ Jisọs onye Nazaret a kpọgidere nʼobe. E meela ka o site nʼọnwụ bilie! Ọ nọkwaghị nʼebe a. Lee ebe e nibere ya. 7Ma gaanụ gwa ndị na-eso ụzọ ya nakwa Pita, ‘O burula unu ụzọ gawa Galili. Ebe ahụ ka unu ga-ahụ ya dị ka ọ gwararịị unu.’ ” 8Ha gbapụtara site nʼili ahụ, nʼọnọdụ mgbagwoju anya na ahụ ịma jijiji. Ha akọrọghị onye ọbụla ihe ọbụla, nʼihi na egwu jupụtara ha obi.
Akwụkwọ ozi
11Mgbe Kraịst bịara dị ka onyeisi nchụaja nke ezi ihe ahụ dị ugbu a, site nʼụlọ ikwu dị ukwuu zuruoke nke a na-ejighị aka mee, nke na-esoghị nʼihe e kere eke, 12o jighị ọbara ụmụ ewu na nke ụmụ ehi banye nʼebe ahụ, kama o ji ọbara nke ya onwe ya banye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ naanị otu mgbe, jiri ya wetara anyị niile mgbapụta ebighị ebi. 13Ma ọ bụrụ na ọbara ewu na nke oke ehi dị iche iche, ya na ntụ nwa agbọghọ ehi, nke e fekwasịrị ndị rụrụ arụ, pụrụ ido ha nsọ, meekwa ka ha dị ọcha nʼelu ahụ. 14Ọbara Kraịst onye sitere na Mmụọ dị ebighị ebi were onwe ya chụọrọ Chineke aja nʼenweghị ntụpọ ọbụla, ọ ga-esi aṅaa ghara ịsachapụ omume ruru unyi nke akọnuche anyị, ka anyị nwee ike ife Chineke dị ndụ.
Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Meri)
23Ma tupu okwukwe abịa, e ji iwu na-eche anyị nche. Iwu nọ ọnọdụ dị ka ụlọ mkpọrọ ebe e tinyere anyị tutu ruo mgbe a ga-eme ka okwukwe pụta ìhè. 24Ya mere, iwu bụ onye nlekọta anyị, ruo mgbe Kraịst bịara, ka a gụọ anyị na ndị ezi omume site nʼokwukwe. 25Ma ebe ọ bụ na okwukwe abịala, anyị anọkwaghị nʼokpuru onye nlekọta ọzọ. 26Unu niile bụ ụmụ Chineke site nʼokwukwe nʼime Kraịst Jisọs. 27Nʼihi na ka unu niile ha, bụ ndị e mere baptizim nʼime Kraịst, abụrụla ndị yikwasịrị onwe ha Kraịst. 28E nwekwaghị onye Juu, maọbụ onye Griik, maọbụ ohu maọbụ onye nwe onwe ya; nwoke maọbụ nwanyị, nʼihi na unu niile bụ otu nʼime Kraịst Jisọs. 29Ọ bụrụ na unu bụ ndị nke Kraịst, mgbe ahụ unu bụkwa mkpụrụ Ebraham, ndị nketa dị ka nkwa ahụ si dị.
Oziọma
32Ha nọ nʼụzọ na-aga Jerusalem, ma Jisọs nọ nʼihu ha, nke a juru ndị na-eso ụzọ ya nʼanya. Otu a kwa, ndị mmadụ niile na-abịa ha nʼazụ tụkwara egwu. Ọzọkwa, ọ kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ nʼakụkụ, malite ịgwa ha ihe gaje ịdakwasị ya. 33Ọ sịrị, “Leenụ, anyị na-aga Jerusalem, ebe a ga-arara Nwa nke Mmadụ nyefee nʼaka ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu. Ha ga-ama ya ikpe ọnwụ, nyefekwa ya nʼaka ndị mba ọzọ. 34Ha ga-akwa ya emo, gbụsakwa ya ọnụ mmiri asụ, pịa ya ihe ma gbukwaa ya. Ma mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ọ ga-esite nʼọnwụ bilie.” 35Jemis na Jọn ụmụ Zebedi bịakwutere ya. Ha sịrị ya, “Onye ozizi, anyị chọrọ ka i meere anyị ihe ọbụla anyị rịọrọ.” 36Ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?” 37Ha sịrị ya, “Kwere ka otu onye nʼime anyị nọrọ nʼaka nri gị, onye nke ọzọ nʼaka ekpe gị nʼime ebube gị.” 38Ma Jisọs sịrị ha, “Unu amataghị ihe unu na-arịọ. Unu pụrụ ịṅụ iko ahụ mụ onwe m ga-aṅụ maọbụ bụrụ ndị a ga-eme ụdị baptizim a ga-eme m?” 39Ha zaghachiri ya, “Anyị pụrụ.” Jisọs sịrị ha, “Unu ga-aṅụ iko m ga-aṅụ, a ga-emekwa unu baptizim nke a ga-eme m. 40Ma ịnọdụ nʼaka nri m maọbụ nʼaka ekpe m abụghị ihe dịrị m inye, kama ọnọdụ ndị a dịịrị ndị a kwadooro ha.” 41Mgbe mmadụ iri ndị ọzọ nụrụ nke a, iwe jupụtara ha obi nʼihi Jemis na Jọn. 42Ma Jisọs kpọkọtara ha niile sị ha, “Dị ka unu onwe unu maara, ndị eze nke ndị mba ọzọ, na ndị a maara aha ha, na-eji aka ike na-achị ndị nọ nʼokpuru ha. 43Ma nʼetiti unu ọ gaghị adị otu a. Kama onye ọbụla chọrọ ịdị ukwuu nʼetiti unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi. 44Onye ọbụla nke chọrọ ịbụ onye mbụ nʼetiti unu, ga-abụ ohu mmadụ niile. 45Nʼihi na Nwa nke Mmadụ abịaghị ka e jeere ya ozi. Kama ka o jee ozi ma nyekwa ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta nke ọtụtụ mmadụ.”
Oziọma (maka Onye nsọ Meri)
36Otu onye nʼime ndị Farisii kpọrọ ya oriri. Ọ gara nʼụlọ onye Farisii ahụ, ma nọdụ ala nʼoche nri. 37Ma otu nwanyị nke bi nʼobodo ahụ, onye birila ndụ mmehie, mgbe ọ matara na ọ nọ nʼụlọ onye Farisii ahụ na-eri nri, o jiri otu karama alabasta mmanụ otite bata nʼụlọ ahụ. 38Ka o guzoro nʼazụ ụkwụ ya na-ebe akwa, ọ malitere iji anya mmiri ya na-awụsa nʼụkwụ ya. O jiri agịrị isi ya hichaa anya mmiri ahụ, sutu ụkwụ ya ọnụ, ma wụsa mmanụ otite isi ụtọ ahụ na ha. 39Mgbe onye Farisii ahụ kpọrọ ya oriri hụrụ ihe nke a, o kwuru nʼobi ya sị, “A sị na nwoke a bụ onye amụma, ọ gaara amata ụdị mmadụ nwanyị a na-emetụ ya aka bụ, na ọ bụ onye mmehie.” 40Jisọs zara ya sị, “Saimọn, e nwere m ihe m chọrọ ịgwa gị.” Ọ sịrị ya, “Onye ozizi gwa m ya.” 41“Ndị ikom abụọ ji onye na-ebinye ndị mmadụ ego nʼọmụrụnwa ụgwọ. Otu onye ji ya narị ego ise, onye nke ọzọ ji ya iri ego ise. 42Mgbe ha na-enweghị ike ịkwụghachi ụgwọ ha ji ya, ọ gbaghara ha ụgwọ ahụ. Ugbu a, onye nʼime ha ga-ahụ ya nʼanya karịa?” 43Saimọn zara sị, “Ọ dị m ka ọ bụ onye nke ọ gbaghara ụgwọ dị ukwuu.” Ọ sịrị ya, “Ị kpeziri.” 44Mgbe ahụ ọ tụgharịrị nʼebe nwanyị ahụ nọ gwa Saimọn sị, “Ị hụrụ nwanyị a? A batara nʼụlọ gị, i kunyeghị m mmiri ka m saa ụkwụ m, ma nwanyị a ejirila anya mmiri ya sachaa ụkwụ m, jirikwa agịrị isi ya hichaa ha. 45Ị sutughị m ọnụ, ma kemgbe m batara nʼụlọ a, o zubeghị ike isutu ụkwụ m ọnụ. 46Ị teghị m mmanụ ọbụla nʼisi, ma lee, o werela mmanụ otite isi ụtọ wụkwasị m nʼụkwụ. 47Ya mere, ana m agwa gị sị, a gbagharala ya mmehie ya niile o mehiere, nʼihi na ọ nwere ịhụnanya dị ukwuu. Ma onye nwetara mgbaghara dị nta, na-enwe ịhụnanya dị nta.” 48Mgbe ahụ ọ gwara ya sị, “A gbagharala gị mmehie gị.” 49Ma ndị ọzọ soro ya nọdụ na-eri nri bidoro ikwu nʼetiti onwe ha na-asị, “Onye bụ onye a nwere ike ọ bụladị ịgbaghara mmehie?” 50Ọ sịrị nwanyị ahụ, “Okwukwe gị azọpụtala gị, laa nʼudo.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 5 Epreel na kalenda nzukọ bụ 18 Epreel na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike