Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 17 Epreel
Kalenda Ọtọdọks · 4 Eprel (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 17 Epreel 2027
Satọdee · Izu nke 5 nke Lent Ukwu · Olu 4
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee Akathist nye Nne Chineke Kachasị Nsọ
Oge Lent Ukwu
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
24Nʼihi na ọ bụghị nʼebe nsọ nke mmadụ jiri aka wuo, nke yiri nke dị nʼeluigwe, ka Kraịst banyere, kama ọ banyere nʼime eluigwe nʼonwe ya, bụ ebe ọ na-anọchite anya anyị ugbu a nʼihu Chineke. 25Ọ banyeghị na ya ka o were onwe ya chụọ aja ọtụtụ ugboro, dị ka onyeisi nchụaja na-eji ọbara na-abụghị nke ya na-abanye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ kwa afọ. 26Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ gaara abụ onye na-ahụ ahụhụ mgbe kemgbe e kere ụwa. Ma, dị ka o si dị, ọ bịara naanị otu ugboro nʼọgwụgwụ oge ndị a, iwezuga mmehie site nʼiji onwe ya chụọ aja. 27Dị ka ọ bụ ihe a kwadooro mmadụ ọbụla ịnwụ naanị otu ugboro, ma e mesịa ikpe esochie, 28otu a ka e si chụọ Kraịst dị ka aja naanị otu ugboro iwepụ mmehie ọtụtụ mmadụ. Ọ ga-abịaghachi nke ugboro abụọ, ma ọ bụghị nʼihi ibu mmehie, kama ọ bụ nʼihi iweta nzọpụta nye ndị ahụ niile na-eche ọbịbịa ya.
Akwụkwọ ozi (maka Nne Chineke)
1Ọgbụgba ndụ nke mbụ nwere usoro ofufe na ebe nsọ nke ụwa nke a e jiri aka wuo. 2E guzobere ụlọ ikwu. Nʼọnụụlọ nke mbụ nʼụlọ ikwu ahụ, e nwere ihe ịdọba iheọkụ, na tebul, na achịcha e doro nsọ. Aha ọnụụlọ nke mbụ a bụ Ebe Nsọ. 3Nʼazụ akwa mgbochi nke abụọ ka e nwere ọnụụlọ a na-akpọ Ebe Kachasị Nsọ, 4nke nwere ebe ịchụ aja mgbaisiọma e ji ọlaedo wuo, na igbe ọgbụgba ndụ ahụ nke e jiri ọlaedo machie ahụ ya niile. Ihe dị nʼime ite ahụ bụ mánà na mkpanaka Erọn nke ahụ puputara ahịhịa, ya na mbadamba nkume e dekwasịrị iwu ọgbụgba ndụ. 5Ihe dị nʼelu igbe a bụ cherubim nke ebube ya, na-ekpuchite oche amara ahụ. Ma anyị enweghị ike ịkọwacha ihe niile ndị a nʼozuzu oke ugbu a. 6Mgbe e doro ihe niile ndị a nʼusoro, onye nchụaja na-abata mgbe ọbụla nʼime ọnụụlọ nke mbụ nke ụlọ ikwu a. Nʼebe a ka ọ na-arụ ọrụ o ketara ịrụ. 7Ma ọ bụ naanị onyeisi nchụaja na-abanye nʼime ọnụụlọ nsọ nke abụọ, naanị otu ugboro nʼafọ. Ọ na-ejikwa ọbara na-aba nʼebe ahụ, iji chụọ aja maka onwe ya na nʼihi mmehie ndị mmadụ mere na-amaghị ama.
Oziọma
27Mgbe ahụ Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya gara nʼobodo nta ndị ọzọ dị gburugburu Sizaria Filipai. Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye ka ndị mmadụ na-asị na m bụ?” 28Ha zara ya sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ndị ọzọkwa sị na ị bụ Ịlaịja maọbụ otu nʼime ndị amụma.” 29Ma ọ jụrụ ha sị, “Ma unu onwe unu, ọ bụ onye ka unu na-asị na m bụ?” Pita zara sị, “Ị bụ Kraịst ahụ.” 30Ọ dọrọ ha aka na ntị sị ha agwakwala onye ọbụla ihe banyere ya. 31Emesịa, o bidoro izi ha ihe na Nwa nke Mmadụ aghaghị ịhụ ọtụtụ ahụhụ dị iche iche, ndị okenye, na ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu ga-ajụ ya, na aghaghị igbu ya, ma ọ ga-ebili nʼọnwụ mgbe ụbọchị nke atọ gasịrị.
Oziọma (maka Nne Chineke)
38Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ọ banyere nʼotu obodo nta ebe nwanyị a na-akpọ Mata nabatara ya nʼụlọ ya. 39O nwere nwanne nwanyị a na-akpọ Meri nke nọdụrụ ala nʼụkwụ Onyenwe anyị na-ege ntị nʼihe ọ na-ekwu. 40Ma uche Mata gbasasịrị agbasa ebe ọ na-akwado maka ile ọbịa. Ọ bịakwutere ya sị ya, “Onyenwe anyị, ọ bụ na o metụghị gị nʼobi na nwanne m nwanyị hapụrụ naanị m ije ozi niile? Gwa ya ka ọ bịa nyere m aka.” 41Ma Onyenwe anyị zara ya sị, “Mata, Mata, ị na-echegbu onwe gị ma na-adọgbukwa onwe gị banyere ọtụtụ ihe, 42maọbụ naanị otu ihe dị mkpa, Meri ahọrọla nke ka mma, nke a na-agaghị anapụkwa ya.” 11:27Mgbe ọ kpụ okwu a nʼọnụ, otu nwanyị sitere nʼime igwe mmadụ ahụ tie mkpu sị, “Ngọzị na-adịrị afọ mụrụ gị na ara nke e jiri zụọ gị.” 28Ma ọ sịrị, kama, “Ngọzị na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke, na-emekwa ha.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 4 Epreel na kalenda nzukọ bụ 17 Epreel na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike