Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 17 Epreel

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 17 Epreel 2027

Satọdee · Izu nke 3 nke Oge Ista

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee nke izu nke 3 nke Oge Ista

Ụbọchị izu · Agba ofufe: ọcha

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọrụ 9:31–42

31Mgbe ahụ, nzukọ niile ndị nọ na Judịa, Galili na Sameria, nọọrọ nʼudo, guzosiekwa ike. Ha na-amụba nʼọnụọgụgụ site nʼịtụ egwu nke Onyenwe anyị na ịgbaume nke Mmụọ Nsọ. 32Pita na-ejegharị nʼetiti ndị kwere ekwe, ọ gakwara leta ndị nsọ nọ nʼobodo Lida. 33Nʼebe ahụ, ọ hụrụ otu nwoke aha ya bụ Ainias. Nwoke a anọọla nʼute ọrịa afọ asatọ. Ọ bụ onye ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. 34Pita sịrị ya, “Ainias, Jisọs Kraịst agwọọla gị. Bilie mezie ute gị.” Ngwangwa, Ainias biliri ọtọ. 35Ndị niile bi na Lida na Sharọn hụrụ ya. Nʼihi ya, ha nabatara Onyenwe anyị. 36Nʼobodo Jopa, e nwere otu onye nwanyị na-eso ụzọ ya, nke aha ya bụ Tabita nke pụtakwara Dọkas na asụsụ Griik. O jupụtara nʼọrụ ọma, na ọrụ obi ebere nʼebe ụmụ ogbenye nọ. 37Nʼoge a, ọ rịara ọrịa, nwụọ. Mgbe ha sachara ya ahụ, ha nibere ya nʼotu ime ụlọ dị nʼụlọ elu. 38Jopa dịkwa nso na Lida. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ na Pita nọ nʼebe ahụ, ha ziri ụmụ nwoke abụọ ozi ka a rịọọ ya, sị, “Biko, ahapụla ịbịakwute anyị ngwangwa.” 39Pita biliri soro ha gawa, mgbe o ruru, ha duuru ya gbago nʼụlọ elu nʼime ụlọ ahụ. Ụmụ nwanyị niile di ha nwụrụ anwụ nọ nʼebe ahụ na-ebe akwa, na-egosi uwe Dọkas dụụrụ ha mgbe ọ dị ndụ. 40Pita chụpụrụ ha niile nʼezi, gbuo ikpere nʼala, kpee ekpere. Ọ tụgharịrị chee ozu ahụ ihu sị, “Tabita, bilie.” O meghere anya ya, ma mgbe ọ hụrụ Pita, o biliri, nọdụ ala. 41O nyeere ya aka ka ọ kwụrụ ọtọ. Ọ kpọrọ ndị nsọ niile nọ nʼebe ahụ, ha na ụmụ nwanyị ahụ di ha nwụrụ gosi ha na ọ dị ndụ. 42A nụrụ akụkọ ihe a mere nʼebe niile na Jopa, nke mere ka ọtụtụ kwere nʼOnyenwe anyị.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 116:12–17

12Gịnị ka m ga-enyeghachi Onyenwe anyị nʼihi mmeso ọma niile o mesoro m? 13Aga m eweli iko nke nzọpụta m elu kpọkuokwa aha Onyenwe anyị. 14Nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ mezuo nkwa m kwere Onyenwe anyị. 15Ọnwụ nke ndị nsọ ya dị oke ọnụahịa nʼanya Onyenwe anyị. 16O Onyenwe anyị, nʼezie, abụ m ohu gị; abụ m ohu gị, nwa nwoke nke ohu gị nwanyị; ị zọpụtala m site na agbụ e kere m. 17Aga m achụrụ gị aja ekele kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.

Oziọma

Jọn 6:60–69

60Mgbe ọtụtụ nʼime ndị na-eso ụzọ ya ha nụrụ nke a, ha sịrị, “Nke a bụ ozizi siri ike, onye nwere ike ịnabata ya?” 61Ebe Jisọs matara na ndị na-eso ụzọ ya na-atamu ntamu maka nke a ọ sịrị ha, “Nke a ọ na-ewute unu? 62Gịnị ka unu ga-ekwu ma ọ bụrụ na unu ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-arịgo ebe ọ nọrịị na mbụ. 63Ọ bụ Mmụọ ahụ na-enye ndụ; anụ ahụ abaghị uru ọbụla, okwu ndị m gwara unu bụ mmụọ bụrụkwa ndụ. 64Ma nʼetiti unu, ọ dị ụfọdụ na-ekwenyeghị.” Nʼihi na Jisọs maara site na mmalite ndị ahụ nʼime ha na-ekwenyeghị, matakwa onye ahụ nke ga-arara ya nye. 65Ọ sịrị, “Ọ bụ nke a mere m jiri gwa unu na o nweghị onye ọbụla nwere ike ịbịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m enyeghị ya ike.” 66Nʼihi nke a, ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya laghachiri azụ, kwụsị iso ya. 67Jisọs sịrị mmadụ iri na abụọ ahụ, “Unu chọkwara iso ha pụọ?” 68Saimọn Pita zara ya sị, “Onyenwe anyị, onye ka anyị ga-agakwuru? Ọ bụ gị ji okwu nke ndụ ebighị ebi. 69Anyị kweere marakwa na ị bụ Onye Nsọ nke Chineke.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike