Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 16 Epreel

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 16 Epreel 2027

Fraịdee · Izu nke 3 nke Oge Ista

Mmemme na ndị nsọ

Fraịdee nke izu nke 3 nke Oge Ista

Ụbọchị izu · Agba ofufe: ọcha

Obubu ọnụ na nchegharị

Ụbọchị nchegharị

Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọrụ 9:1–20

1Ma ugbu a, Sọl, onye ume niile ọ na-ekupụta bụ naanị ịba mba na igbu ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị, gakwuuru onyeisi nchụaja, 2rịọ ya ka o nye ya akwụkwọ ozi nke ọ ga-eji jekwuru ndị ụlọ nzukọ ndị Juu dị na Damaskọs, nke ọ ga-abụ ọ hụ onye ọbụla na-eso Ụzọ ahụ ma ha bụ nwoke ma ha bụ nwanyị, ka ọdọkpụrụ ha nʼagbụ, kpụgaa Jerusalem. 3Mgbe ọ na-aga nʼụzọ, ọ bịaruru ebe dị Damaskọs nso. Na mberede, ihe ìhè nke sitere nʼeluigwe chara ya gburugburu. 4Ọ dara nʼala, nụ olu na-akpọ ya oku, “Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?” 5Ọ sịrị, “Ị bụ onye, Onyenwe anyị?” Olu ahụ zaghachiri, “Abụ m Jisọs onye ị na-akpagbu. 6Ugbu a, bilie, baa nʼime obodo, a ga-agwa gị ihe ị na-aghaghị imezu.” 7Ndị ikom ha na ya so aga guzoro nʼebe ahụ, ma ha enweghị ike ikwu okwu. Ha nụrụ olu ahụ, ma ha ahụghị onye ọbụla. 8Sọl si nʼala bilie, ma nʼagbanyeghị nʼanya ya meghere emeghe, ọ dịghị ihe o nwere ike ịhụ. Nke a mere na ha sekpụrụ ya nʼaka dubata ya na Damaskọs. 9Ọ hụghị ụzọ ụbọchị atọ, o nweghị ike iri nri maọbụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ. 10Otu onye nke na-eso ụzọ ya nọ na Damaskọs, a na-akpọ Ananayas. Onyenwe anyị gwara ya nʼọhụ, “Ananayas!” Ọ sịrị, “Lee m, Onyenwe anyị.” 11Onyenwe anyị gwara ya, “Gaa nʼụlọ Judas nke dị nʼokporoụzọ Guzoziri Eguzo, jụọ ajụjụ banyere onye a na-akpọ Sọl, onye si Tasọs, ọ nọ ugbu a na-ekpe ekpere. 12Ọ hụla ọhụ na otu nwoke a na-akpọ Ananayas na-abịakwute ya, ibikwasị ya aka nʼisi ka ọ hụ ụzọ.” 13Ma Ananayas zara, “Onyenwe anyị, anụla m akụkọ ihe ọjọọ niile nwoke a mere ndị nsọ gị bi na Jerusalem. 14Ugbu a, ọ natara ikike nʼaka ndịisi nchụaja bịa nʼebe a ka o jide ndị niile na-akpọku aha gị.” 15Ma Onyenwe anyị gwara ya, “Gaa, nʼihi na ahọpụtala m nwoke a ka ọ bụrụ ngwa ọrụ m, onye ga-ewegara mba ndị ọzọ, ndị eze na ụmụ Izrel aha m. 16Mụ onwe m ga-egosi ya ụdị ahụhụ ọ na-aghaghị ịta nʼihi aha m.” 17Ya mere, Ananayas garuru nʼụlọ ahụ, banyekwa nʼime ya. Ọ bikwasịrị aka ya nʼisi Sọl, sị, “Nwanna Sọl, Onyenwe anyị Jisọs, onye gosiri gị onwe ya nʼụzọ, zitere m ka ị hụkwa ụzọ ọzọ, ka ị jupụtakwa na Mmụọ Nsọ.” 18Otu mgbe ahụ, ihe dịka akpịrịkpa sitere nʼanya ya dapụta, o bidokwara ịhụ ụzọ ọzọ. O biliri ọtọ, e mee ya baptizim. 19Mgbe o richara nri, ọ nwetakwara ike ya. Ya na ndị na-eso ụzọ Jisọs nọrọ na Damaskọs ọtụtụ ụbọchị. 20Ngwangwa, o bidoro ikwusa Jisọs nʼụlọ nzukọ na-asị, Ọ bụ Ọkpara Chineke.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 117:1–2

1Toonu Onyenwe anyị, unu mba niile dị iche iche. Jaakwa ya mma, unu ndị niile dị iche iche. 2Nʼihi na ịhụnanya ya nʼebe anyị nọ dị ukwuu. Ikwesi ntụkwasị obi Onyenwe anyị na-adịkwa ruo mgbe ebighị ebi. Toonu Onyenwe anyị!

Oziọma

Jọn 6:52–59

52Mgbe ahụ, ndị Juu bidoro na-arụrịta ụka ike nʼetiti onwe ha sị, “Olee otu nwoke a ga-esi nye anyị anụ ahụ ya ka anyị rie?” 53Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, naanị ma unu riri anụ ahụ Nwa nke Mmadụ ma ṅụọkwa ọbara ya, unu agaghị enwe ndụ nʼime onwe unu. 54Onye ọbụla riri anụ ahụ m, ṅụọkwa ọbara m nwere ndụ ebighị ebi. A ga m akpọlitekwa ya nʼụbọchị ikpeazụ ahụ. 55Nʼihi na anụ ahụ m bụ ezigbo nri, ọbara m bụkwa ezigbo ihe ọṅụṅụ. 56Onye ọbụla na-eri anụ ahụ m na-aṅụkwa ọbara m na-anọgide nʼime m mụ onwe m kwa nʼime ya. 57Dị ka Nna ahụ dị ndụ zitere m, ana m adịkwa ndụ nʼihi Nna ahụ, otu a ka onye na-eri m ga-adịkwa ndụ site na m. 58Nke a bụ achịcha ahụ si nʼeluigwe bịa. Nna nna unu ha riri mánà ma nwụkwaa, ma onye ọbụla na-eri achịcha a ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.” 59O kwuru ihe ndị a mgbe ọ na-akụzi ihe nʼụlọ ekpere dị na Kapanọm.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike