Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 14 Epreel

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 14 Epreel 2027

Wenezdee · Izu nke 3 nke Oge Ista

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke izu nke 3 nke Oge Ista

Ụbọchị izu · Agba ofufe: ọcha

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọrụ 8:1–8

1Sọl kwenyere ka e gbuo ya. Nʼụbọchị ahụ, oke mkpagbu bidoro megide nzukọ dị na Jerusalem. Ndị niile kwere ekwe, ma ewezuga ndị ozi nʼonwe ha gbasasịrị nʼala Judịa na Sameria. 2Ndị ikom, ndị na-atụ egwu Chineke, bịara buru ozu Stivin gaa lie ya. Ha ruru ụjụ nke ukwuu nʼihi ya. 3Ma Sọl bidoro ịla nzukọ nʼiyi. Ọ na-abanye site nʼụlọ ga nʼụlọ ndị kwere ekwe na-adọpụta ha, nwoke na nwanyị, tinye ha nʼụlọ mkpọrọ. 4Ndị ahụ a chụsasịrị zisara oziọma nʼebe niile ha gbagara. 5Filip gara nʼotu obodo dị na Sameria kwusaara ndị nọ nʼebe ahụ ihe banyere Kraịst. 6Igwe mmadụ gere ntị nʼihe Filip na-ekwu nʼihi na ha hụrụ ọrụ ịrịbama ọ rụrụ. 7Mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha ji iti mkpu site nʼime ọtụtụ mmadụ pụta. Ọ gwọkwara ọtụtụ ndị ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ na ndị ngwụrọ. 8Nʼihi ya, ọṅụ dị ukwuu jupụtara nʼobodo ahụ.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 66:1–7

1Abụ dịrị onyeisi abụ. Otu Abụ. Abụ Ọma. Ụwa niile, jirinụ ọṅụ tikuo Chineke! 2Bụọ abụ banyere ebube aha ya; meenụ ka otuto ya bụrụ ihe dị ebube! 3Gwa Chineke okwu sị ya, “Lee ka ọrụ gị niile si dị oke egwu! Ike gị dị nnọọ ukwu, ya mere ndị iro gị, na-ada nʼihu gị nʼihi ụjọ. 4Ndị niile bi nʼụwa na-akpọ isiala nye gị; ha na-abụku gị abụ otuto, ha na-abụ abụ otuto nye aha gị.” Sela 5Bịa lee ihe Chineke mere, ụdị ọrụ oke egwu ọ na-arụ nʼihi mmadụ! 6O mere ka osimiri ghọọ ala akọrọ, ha ji ụkwụ si nʼetiti osimiri gafee; bịanụ ka anyị ṅụrịa nʼime ya. 7Ọ na-achị ruo mgbe ebighị ebi site nʼike ya, anya ya na-elekwa mba niile, ka ndị nnupu isi ghara ịfụlị onwe ha elu megide ya. Sela

Oziọma

Jọn 6:35–40

35Jisọs sịrị ha, “Abụ m achịcha ahụ na-enye ndụ. Onye ọbụla na-abịakwute m, agụụ agaghị agụ ya. Onye ọbụla kwa kweere na m, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ. 36Ma agwa m unu, unu ahụla m ma unu ekweghịkwa. 37Onye ọbụla Nna ahụ nyere m ga-abịakwute m, onye ọbụla na-abịakwute m, agaghị m achụpụ ya. 38Nʼihi na esi m nʼeluigwe rịdata nʼụwa ime uche onye ahụ zitere m, ọ bụghị ime uche nke m. 39Nke a bụkwa uche onye ahụ zitere m, na o nweghị onye ọbụla o nyere m ga-efunarị m, kama m ga-eme ka ha site nʼọnwụ bilie nʼụbọchị ikpeazụ. 40Nke a bụ uche nke Nna m, na onye ọbụla lere Ọkpara ahụ anya, kwerekwa na ya ga-enweta ndụ ebighị ebi, m ga-emekwa ka o bilie nʼụbọchị ikpeazụ.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike