Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 12 Epreel
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 12 Epreel 2027
Mọnde · Izu nke 3 nke Oge Ista
Mmemme na ndị nsọ
Mọnde nke izu nke 3 nke Oge Ista
Ụbọchị izu · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
8Ugbu a, Stivin, nwoke jupụtara nʼamara na nʼike Chineke rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị ukwuu nʼetiti ndị mmadụ. 9Mgbe ahụ ụfọdụ ndị Juu si nʼụlọ nzukọ nke ndị nweere onwe ha (dị ka e si akpọ ya), na nke ndị Sirini na Alegzandria nakwa ndị ọzọ sitere na mpaghara Silisia na Eshịa. Ha na Stivin malitere ịrụgharị ụka. 10Ma ha enweghị ike iguzogide amamihe na ike nke Mmụọ Nsọ nke o ji ekwu okwu. 11Mgbe ahụ, ha ji ụzọ nzuzo kpalie ụfọdụ ndị ikom ka ha sị, “Anyị nụrụ ka ọ na-ekwujọ Mosis na Chineke.” 12Ha kpasuru ndị mmadụ, ma ndị okenye ma ndị ozizi iwu. Ha bịakwutere ya jide ya, kpụrụ ya gaa na nnọkọ ụlọ ikpe. 13Ha kpọtakwara ndị bịara gbaa ama ụgha megide ya sị, “Oge niile ka nwoke a na-ekwu okwu ọjọọ banyere ebe a dị nsọ na iwu anyị. 14Anyị nụrụ ka o kwuru, na Jisọs onye Nazaret a ga-akwatu ụlọ a, gbanwekwa omenaala Mosis nyere anyị.” 15Ndị niile nọ nʼụlọikpe ahụ legidere ya anya. Ha hụrụ ihu ya ka ọ na-enwu dị ka ihu mmụọ ozi.
Abụ Ọma nzaghachi
23Nʼagbanyeghị na ndịisi nọkọrọ na-ekwulu m, ohu gị ga-atụgharị uche nʼiwu gị. 24Ụkpụrụ gị niile bụ ihe na-amasị m; ha bụ ndị ndụmọdụ m. 26Akọwaara m gị ụzọ m niile, ị zakwara m; ugbu a, kuziere m iwu gị. 27Mee ka m ghọta ozizi ụkpụrụ gị; ka m nwe ike tụgharịa uche nʼọrụ ebube gị niile. 29Chebe m pụọ nʼụzọ aghụghọ niile; site nʼiwu gị meere m amara. 30Ahọrọla m ụzọ ikwesi ntụkwasị obi; e kpebiela m idebe obi m nʼiwu gị niile.
Oziọma
22Nʼechi ya, igwe mmadụ ahụ nọdụrụ nʼofe ọzọ nke ọnụ mmiri ahụ chọpụtara na ọ bụ naanị otu ụgbọ mmiri nta bịara nʼebe ahụ, na Jisọs esoghị ndị na-eso ụzọ ya banye nʼime ya, kama na ọ bụ naanị ndị na-eso ụzọ ya ka ụgbọ mmiri ahụ buuru pụọ. 23Mgbe ahụ ụfọdụ ụgbọ mmiri si Tiberịas bịara kwụsị nso nso ebe ahụ ndị mmadụ nọ rie achịcha mgbe Onyenwe anyị nyechara ekele maka ya. 24Ma mgbe igwe mmadụ ahụ ghọtara na Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya anọghị nʼebe ahụ, ha banyere nʼụgbọ mmiri nta ndị ahụ kwọfee gawa Kapanọm ịchọ Jisọs. 25Mgbe ha hụrụ ya nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ, ha sịrị ya, “Onye ozizi, olee mgbe i jiri bịa nʼebe a?” 26Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ihe unu ji na-achọ m abụghị nʼihi na unu hụrụ ihe ịrịbama m mere, kama na unu riri achịcha rijuokwa afọ. 27Unu adọgbula onwe unu maka nri nke na-emebi emebi, kama maka nri nke na-adịgide ruo ndụ ebighị ebi, bụ nke Nwa nke Mmadụ ga-enye unu. Nʼihi na Chineke Nna akakwasịla ya akara nkwado ya.” 28Mgbe ahụ, ha sịrị, “Gịnị ka anyị ga-eme iji rụọ ọrụ Chineke?” 29Jisọs zara sị ha, “Ọrụ Chineke bụ nke a, ikwere nʼonye ahụ o zitere.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike