Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 11 Epreel

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 11 Epreel 2027

Sọnde · Izu nke 3 nke Oge Ista

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 3 nke Oge Ista

Sọnde · Agba ofufe: ọcha

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọrụ 3:13–15, 17–19

13Chineke nke Ebraham, nke Aịzik na nke Jekọb, Chineke nke nna anyị ha, ebuliela onye na-ejere ya ozi, bụ Jisọs elu, onye unu nyefere ka e gbuo, ma gọnarịkwa ya nʼihu Pailet, nʼagbanyeghị na o kpebiri ịhapụ ya ka ọ laa. 14Unu gọnarịrị onye ahụ dị nsọ bụrụkwa onye ezi omume, ma rịọ ka a hapụrụ unu ogbu mmadụ. 15Unu gburu onye ahụ na-enye ndụ, ma Chineke akpọlitela ya site nʼọnwụ. Anyị bụ ndị akaebe ihe ndị a. 17“Ugbu a ụmụnna m, amaara m na unu kpara agwa na-amaghị ama, dịka ndị ndu unu sikwara kpaa. 18Ma Chineke siri otu a mezuo ihe o kwuru site nʼọnụ ndị amụma niile na Kraịst ya aghaghị ịhụ ahụhụ. 19Ya mere, chegharịanụ ugbu a ma lọghachikwutekwanụ Chineke, ka e nwee ike ihichapụ mmehie unu,

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 4:1, 6, 8

1Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid nke a na-eji ụbọ akwara akpọ. Zaa m mgbe m na-akpọku gị Chineke m, gị onye ezi omume; Napụta m site nʼihe mgbu m, meere m ebere, nụrụkwa ekpere m. 6Ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ, “Onye pụrụ imere anyị ihe ọma?” Ma Onyenwe anyị, biko mee ka ìhè nke ihu gị mụkwasị anyị. 8Aga m edina ala ma rahụ ụra nʼudo, nʼihi na ọ bụ naanị gị Onyenwe anyị, na-eme ka m nọrọ na-enweghị ihe egwu ọbụla.

Ihe ọgụgụ nke abụọ

1Jọn 2:1–5

1Ezi ụmụntakịrị m, ana m edere unu ihe ndị a ka unu ghara imehie. Ma ọ bụrụ na onye ọbụla emehie, anyị nwere onye na-ekwuchite ọnụ anyị nʼihu Nna ahụ. Ọ bụ Jisọs Kraịst, Onye ezi omume ahụ. 2Ọ bụ onye jiri onwe ya chụọ aja nʼihi ikpuchiri anyị mmehie anyị, ma ọ bụghị naanị nʼihi mmehie anyị, ọ bụkwa nʼihi mmehie ụwa niile. 3Otu a ka anyị si amata na anyị maara onye ọ bụ, ma ọ bụrụ na anyị erube isi nye iwu ya niile. 4Onye ahụ na-ekwu sị, “Amaara m ya,” ma ọ dịghị eme ihe o nyere nʼiwu bụ onye okwu ụgha, eziokwu ahụ adịghịkwa nʼime ya. 5Ma ọ bụrụ na onye ọbụla na-erube isi nʼokwu ya, nʼezie, ịhụnanya Chineke bụ ihe emere ka o zuo oke nʼime ya. Ọ bụ otu a ka anyị si amata na anyị nọ nʼime ya.

Oziọma

Luk 24:35–48

35Mgbe ahụ, ha kọọrọ ha ihe mere nʼụzọ, ya na otu ha siri mata ya mgbe ọ nyawara achịcha. 36Mgbe ha ka na-ekwu banyere nke a, ya onwe ya guzooro nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.” 37Oke egwu tụrụ ha, obi lọkwara ha mmiri nʼihi na ha chere na ha ahụla mmụọ. 38Ma ọ sịrị ha, “Gịnị mere ụjọ ji atụ unu, gịnị mere unu ji nwee obi abụọ? 39Leenụ m anya nʼaka na nʼụkwụ. Ọ bụ mụ onwe m! Metụnụ m aka ka unu hụrụ, nʼihi na mmụọ adịghị enwe anụ ahụ na ọkpụkpụ dị ka unu hụrụ m nwere.” 40Mgbe o kwuchara nke a, o gosiri ha aka ya na ụkwụ ya. 41Ma dị ka o siiri ha ike ikwere nʼihi ọṅụ na oke mgbagwoju anya, ọ sịrị ha, “Ọ dị ihe oriri unu nwere ebe a?” 42Ha nyere ya otu ntakịrị azụ a mịkpọrọ amịkpọ. 43Ma ọ naara ya rie ya nʼihu ha. 44Mgbe ahụ, ọ sịrị ha, “Okwu ndị a ka m gwara unu mgbe mụ na unu nọ, na ihe niile e dere nʼiwu Mosis na ndị Amụma na nʼAbụ Ọma banyere m ga-emezucha.” 45Mgbe ahụ, o meghere akọnuche ha ka ha ghọta akwụkwọ nsọ. 46Ọ sịrị ha, “Nke a bụ ihe e dere na, Kraịst ahụ ga-ahụ ahụhụ ma sitekwa nʼọnwụ bilie nʼụbọchị nke atọ. 47Na a ga-ekwusa nchegharị na mgbaghara mmehie site nʼaha ya nye mba niile, malite na Jerusalem. 48Unu bụ ndị akaebe nke ihe ndị a.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike