Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 11 Epreel
Kalenda Ọtọdọks · 29 Maachị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 11 Epreel 2027
Sọnde · Olu 4
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 4 nke Lent Ukwu
Oge Lent Ukwu
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 1
16Ma ndị ikom iri na otu ahụ bụ ndị na-eso ụzọ ya gara Galili, nʼelu ugwu ebe Jisọs gwara ha gaa. 17Mgbe ha hụrụ ya, ha kpọrọ isiala nye ya. Ma ụfọdụ nʼime ha nwere obi abụọ. 18Jisọs bịara ha nso, gwa ha sị, “E werela ikike niile dị nʼeluigwe na nke dị nʼelu ụwa nye m. 19Ya mere, gaanụ mee ka mba niile bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-emenụ ha baptizim nʼaha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ. 20Ziekwanụ ha ka ha na-eme ihe niile m nyere unu nʼiwu. Ma chetanụ na m na-anọnyere unu mgbe niile, ruo ọgwụgwụ oge.”
Akwụkwọ ozi
13Mgbe Chineke kwere Ebraham nkwa, o ji onwe ya ṅụọ iyi, nʼihi na ọ dịghị onye ọzọ dị ukwuu karịa ya, 14na-asị, “Nʼezie aga m agọzi gị, nyekwa gị ọtụtụ ụmụ ụmụ.” 15Ebraham nwere ndidi, natakwa ihe e kwere ya na nkwa. 16Ụmụ mmadụ na-eji ndị ka ha ukwuu ṅụọ iyi, iyi aṅụrụ nʼụzọ dị otu a na-eme ka ihe e kwuru guzosie ike ma wezugakwa ịrụ ụka niile nʼetiti mmadụ. 17Ya mere, mgbe Chineke chọrọ igosi ndị ahụ ga-eketa nkwa ahụ, ụdịdị izuzu ya, o jiri ịṅụ iyi mee ka o doo ha anya na izuzu ya adịghị agbanwe agbanwe. 18Ka ọ ga-abụ site nʼihe abụọ na-enweghị mgbanwe, nke na-agaghị ekwe omume izi Chineke dịka onye ụgha, anyị bụ ndị gbara ọsọ ndụ ga-enweta agbamume siri ike iji jide olileanya e dobeere anyị. 19Anyị nwere olileanya a dị ka arịlịka nke mkpụrụobi nke guzosiri ike ma bụrụkwa nke e chekwara. Ọ na-abanye nʼime ime ebe nchụaja ahụ nʼazụ akwa mgbochi 20ebe Jisọs onye buru anyị ụzọ, abanyela nʼihi anyị; ọ ghọlara anyị onyeisi nchụaja ruo mgbe ebighị ebi dị ka usoro Melkizedek si dị.
Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Jọn)
8Nʼihi nʼoge gara aga, unu bụ ọchịchịrị, ma ugbu a, unu bụ ìhè nʼime Onyenwe anyị. Na-ebinụ ndụ ka ụmụ nke ìhè 9(nʼihi na a na-ahụ mkpụrụ nke ìhè nʼihe niile dị mma, na ihe ziri ezi, na eziokwu). 10Gbalịanụ ịchọpụta ihe na-amasị Onyenwe anyị. 11Unu etinyela aka nʼọrụ ọchịchịrị nke na-adịghị amị mkpụrụ ọbụla, kama gbaanụ ha nʼanwụ. 12Ọ bụ ihe ihere ikwu okwu banyere ihe ndị a na-eme na nzuzo. 13Mgbe a gbara ihe ọbụla nʼanwụ, ọ na-apụta ìhè nke ọma. Nʼihi na ihe ọbụla e mere ka ọ pụta ìhè nke ọma bụ ìhè. 14Nke a mere na e kwuru, “Bilie gị onye na-arahụ ụra. Site nʼọnwụ bilie. Kraịst ga-emekwa ka ihe ya mụkwasị gị.” 15Kpachapụnụ anya otu unu si ebi ndụ unu. Unu ebila ndụ dị ka ndị nzuzu, kama bienụ ndụ dị ka ndị maara ihe. 16Jirinụ ohere niile unu nwere rụọ ọrụ ọma, nʼihi na ụbọchị ndị a dị njọ. 17Unu emela dị ka ndị na-enweghị uche, kama gbalịanụ ịchọpụta ihe Onyenwe anyị chọrọ ka unu mee, 18Unu aṅụbigala mmanya oke nʼihi na ọ na-eduba na ndụ ịla nʼiyi. Kama jupụtanụ na Mmụọ Nsọ, 19werenụ abụ ọma, na abụ nke ime mmụọ na-ekwe ukwe nʼetiti onwe unu. Werekwanụ obi unu niile na-abụrụ Onyenwe anyị abụ dị ụtọ.
Oziọma
17Otu onye nʼime igwe mmadụ ahụ zara ya sị, “Onye ozizi akpọtaara m gị nwa m nwoke, nke mmụọ ọjọọ bi nʼime ya, nke mekwara ka ọ daa ogbi. 18Mgbe ọbụla mmụọ ọjọọ ahụ malitere isogbu ya, ọ na-atụda ya nʼala. Mgbe ahụ, ọ na-agbọ ụfụfụ nʼọnụ ya, na-ata ikikere eze, anụ ahụ ya na-esikwa ike. Arịọrọ m ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ mmụọ ọjọọ a, ma ha enweghị ike.” 19Ọ zaghachiri ha sị, “Unu ọgbọ na-enweghị okwukwe. Ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga-anagide unu? Kpọtaranụ m ya!” 20Ya mere, ha kpọtaara ya nwata ahụ. Mgbe mmụọ ọjọọ ahụ hụrụ ya, ngwangwa, o nugharịrị nwata ahụ nke ukwuu, ọ daa nʼala na-atụrụ onwe ya nʼala, na-agbọkwa ụfụfụ nʼọnụ ya. 21Jisọs jụrụ nna nwata ahụ sị, “Olee mgbe ihe a bidoro?” Ọ zara sị, “Site na mgbe ọ bụ nwata nta. 22Ọ na-eme ya ka ọ daba nʼọkụ, maọbụ na mmiri, ka ọ laa ya nʼiyi. Ọ bụrụ na ọ dị ihe i nwere ike ime, biko meere anyị ebere, nyere anyị aka.” 23Jisọs sịrị ya, “ ‘Ọ bụrụ na i nwere ike’? Ihe niile pụrụ ime nʼebe onye kwere ekwe nọ.” 24Ngwangwa, nna nwata ahụ tiri mkpu sị, “Ekweere m, biko nyere ekweghị ekwe m aka!” 25Mgbe Jisọs hụrụ na igwe mmadụ na-agba ọsọ na-abịa nʼebe ahụ, ọ baara mmụọ ahụ na-adịghị ọcha mba sị, “Gị mmụọ ọjọọ ntị ike na ịda ogbi, ana m enye gị iwu, site nʼime nwata a pụta! Abanyekwala nʼime ya ọzọ!” 26O tiri mkpu nʼoke olu, nugharịa nwata ahụ nke ukwuu ma site nʼime ya pụta. Nwata ahụ tọgbọrọ nʼala dị ka onye nwụrụ anwụ nke mere na ndị niile nọ nʼebe ahụ sịrị, “Ọ nwụọla!” 27Ma Jisọs jidere ya nʼaka selite ya elu, mee ka o guzo nʼụkwụ ya. O guzokwara. 28Ma mgbe ọ banyere nʼime ụlọ ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya na nzuzo sị, “Gịnị mere o jiri siere anyị ike ịchụpụ ya?” 29Ọ sịrị ha, “Ọ bụ naanị site nʼike ekpere ka a pụrụ ịchụpụ ụdị a.” 30Ha siri nʼebe ahụ pụọ gafee Galili. Ọ chọghị ka onye ọbụla mata maka ya, 31nʼihi na ọ na-ezi ndị na-eso ụzọ ya ihe. Ọ sịrị ha, “A ga-arara Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ụmụ mmadụ, ha ga-egbukwa ya ma ọ ga-ebili nʼọnwụ mgbe mkpụrụ ụbọchị atọ gasịrị.”
Oziọma (maka Onye nsọ Jọn)
25Ọtụtụ mmadụ sitere na Galili, Dekapọlịs, Jerusalem, Judịa na nʼofe osimiri Jọdan, soro ya. 5:1Mgbe Jisọs hụrụ igwe mmadụ ahụ, ọ rigooro nʼelu ugwu. Mgbe ọ nọdụrụ ala, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya, 2o bido ikuziri ha ihe. Ọ sịrị: 3“Ngọzị na-adịrị ndị bụ ogbenye nʼime mmụọ, nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. 4Ngọzị na-adịrị ndị na-eru ụjụ, nʼihi na a ga-akasị ha obi. 5Ngọzị na-adịrị ndị dị nwayọọ nʼobi, nʼihi na ha ga-eketa ụwa. 6Ngọzị na-adịrị ndị agụụ ezi omume na-agụ, nʼihi na ndị ahụ ka afọ ga-eju. 7Ngọzị na-adịrị ndị na-eme obi ebere, nʼihi na ha ka a ga-emere ebere. 8Ngọzị na-adịrị ndị dị ọcha nʼobi, nʼihi na ha ga-ahụ Chineke anya. 9Ngọzị na-adịrị ndị na-eme ka udo dị nʼetiti mmadụ na ibe ya, nʼihi na a ga-akpọ ha ụmụ Chineke. 10Ngọzị na-adịrị ndị a na-emegbu nʼihi ezi omume, nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. 11“Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu, na-emegbu unu, ma na-ekwukwa okwu ọjọọ na ụgha niile dị iche iche megide unu nʼihi m. 12Ṅụrịanụ ọnụ, nwekwanụ obi ụtọ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na nʼụzọ dị otu a ka ha sogburu ndị amụma ndị buru unu ụzọ.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 29 Maachị na kalenda nzukọ bụ 11 Epreel na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike