Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 10 Epreel

Kalenda Ọtọdọks · 28 Maachị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 10 Epreel 2027

Satọdee · Izu nke 4 nke Lent Ukwu · Olu 3

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee ncheta ndị nwụrụ anwụ

Oge Lent Ukwu

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi (maka ndị nwụrụ anwụ)

1Kọ 15:47–57

47Mmadụ nke nwoke sitere nʼala, ejikwa aja kpụọ ya; mmadụ nke abụọ si nʼeluigwe bịa. 48Dị ka mmadụ nke mbụ ahụ e jiri aja kpụọ dị, otu a ka ndị niile si nʼaja pụta dịkwa. Ma dị ka mmadụ nke eluigwe ahụ dị, otu a ka ndị niile bụ ụmụ eluigwe dịkwa. 49Dịka anyị niile yikwasịrị onyinyo nke nwoke e jiri aja kpụọ, otu ahụkwa ka anyị ga-esi yikwasị onyinyo nke nwoke nke eluigwe. 50Ihe m na-ekwu, ụmụnna m, bụ na anụ ahụ na ọbara enweghị ike iketa alaeze Chineke. Ihe na-ere ure agaghịkwa eketa ereghị ure. 51Ma geenụ ntị ka m gwa unu ihe omimi a! Ọ bụghị anyị niile na-aga ịnwụ, kama, a ga-enye anyị anụ ahụ ọhụrụ nke pụrụ iche. 52Nʼotu mgbe, nʼotu ntabi anya, mgbe a ga-afụ opi ike ikpeazụ. Nʼihi na opi ga-ada, a ga-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilite na-ereghị ure. A ga-agbanwekwa anyị. 53Nʼihi na a ghaghị ịgbanwe anụ ahụ anyị a nke na-anwụ anwụ, nyekwa anyị ahụ nke na-agaghị anwụ ọzọ. 54Mgbe ahụ nke a pụrụ ire ure ga-eyikwasị ereghị ure, nke a pụrụ ịnwụ anwụ ga-eyikwasị anwụghị anwụ. Mgbe ahụ, okwu ahụ e dere nʼakwụkwọ nsọ ga-emezu, okwu ahụ sịrị, “Elomiela ọnwụ, meriekwa ike ya niile.” 55“Ọnwụ, olee ebe mmeri gị dị? Ọnwụ, olee ebe ihe ụfụ gị dị?” 56Nʼihi na ihe ahụ ọnwụ ji agbata mmadụ bụ mmehie, ma ihe na-enye mmehie ike bụ iwu. 57Ka ekele dịrị Chineke onye na-enye anyị mmeri site nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.

Akwụkwọ ozi

Hib 6:9–12

9Ma ọ bụ ezie na anyị na-ekwu otu a, ezi ndị enyi m, anyị nwere ntụkwasị obi maka ihe dị ezi mma banyere unu, bụ ihe ndị ha na nzọpụta so bịa. 10Chineke abụghị onye na-ekpe ikpe nʼezighị ezi. Ọ gaghị echefu ọrụ niile unu rụrụ ya. Ọ gaghị echefu ịhụnanya niile unu gosiri nʼihi ya site nʼịgara ndị nsọ ozi, dịka unu na-aga nʼihu na-emekwa. 11Anyị chọrọ ka onye ọbụla nʼime unu nọgidesie ike nʼotu ịnụ ọkụ nʼobi ahụ ruo ọgwụgwụ ihe niile, ka unu nwee olileanya inwezu ihe niile unu na-atụ anya ya mgbe oge ruru. 12Anyị achọghị ka unu bụrụ ndị umengwụ, kama ka unu bụrụ ndị na-eṅomi ndụ ahụ jiri okwukwe na ntachiobi nweta ihe ahụ e kwere na nkwa.

Oziọma (maka ndị nwụrụ anwụ)

Jọn 5:24–30

24“Nʼezie, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla na-anụ okwu m ma kwerekwa nʼonye zitere m nwere ndụ ebighị ebi, a gaghị amakwa ya ikpe, ọ gafeela site nʼọnwụ banye na ndụ. 25Nʼezie, nʼezie agwa m unu, oge na-abịa, ọ bịakwala ugbu a mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-anụ olu Ọkpara Chineke, ndị ahụ nụrụ ya ga-adịkwa ndụ. 26Dị ka Nna ahụ nwere ndụ nʼime onwe ya, otu a ka o nyekwara Ọkpara ahụ ike inwe ndụ nʼime onwe ya. 27O nyekwala ya ikike ikpe ikpe nʼihi na ọ bụ Nwa nke Mmadụ. 28“Ka nke a hapụ iju unu anya, nʼihi na oge na-abịa, mgbe ndị niile nọ nʼili ha ga-anụ olu ya 29ma pụta, ndị mere ihe dị mma ga-ebili dịrị ndụ. Ma ndị mere ihe ọjọọ ga-ebili bụrụ ndị a ga-ama ikpe. 30Enweghị m ike ime ihe ọbụla nʼonwe m, ikpe m na-ekpe bụ naanị dị ka m nụrụ, ikpe m bụkwa nke ziri ezi, nʼihi na anaghị m eme ihe ga-amasị m, kama ọ bụ ihe ga-amasị onye ahụ zitere m.

Oziọma

Mak 7:31–37

31Emesịa, ọ hapụrụ akụkụ Taịa gabiga Saịdọn bịaruo nʼosimiri Galili ruo nʼobodo ndị dị na Dekapọlịs. 32Ha duteere ya otu nwoke ntị chịrị, nke na-asụkwa oke nsụ. Ha rịọrọ ya ka o bikwasị ya aka. 33O duuru ya pụọ nʼebe igwe mmadụ ahụ nọ, rụnye ya mkpịsịaka nʼime ntị ya abụọ. Mgbe ahụ ọ gbụpụkwara ọnụ mmiri metụkwa ya aka nʼire. 34O leliri anya nʼeluigwe sụọ ude sị ya, “Ef fata,” nke pụtara “Meghee!” 35Ngwangwa, ntị ya meghere, a tọpụkwara ire ya, ọ malite ikwu okwu nke ọma. 36Jisọs nyere ha iwu ka ha ghara ịgwa onye ọbụla, ma mgbe ọ na-eme nke a ha gara nʼihu na-akọsa ya ebe niile. 37Ọ tụrụ ha nʼanya nke ukwuu, ha kwuo sị, “O meela ihe niile nke ọma. Ọ na-eme ka ọ bụladị ndị ntị chiri nụ ihe, ma mee ka ndị ogbi kwuo okwu.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 28 Maachị na kalenda nzukọ bụ 10 Epreel na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike