Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 9 Epreel

Kalenda Ọtọdọks · 27 Maachị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 9 Epreel 2027

Fraịdee · Izu nke 4 nke Lent Ukwu · Olu 3

Mmemme na ndị nsọ

Martyr Matrona of Thessalonica (3rd-4th C)

Oge Lent Ukwu

Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Elekere nke 6

Aịz 29:13–23

13Onyenwe anyị sịrị, “Ndị a ji ọnụ ha na-abịa m nso, ha ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya nʼebe m nọ. Ofufe ha na-efe m, bụ nke gbadoro ụkwụ nʼihe mmadụ nyere nʼiwu, bụkwa nke a kuziiri ha. 14Ya mere, otu ugboro ọzọ, aga m eme ndị a ihe oke iju anya jiri ihe ịtụnanya tụkwasị nʼelu ihe ịtụnanya, amamihe nke ndị maara ihe ga-ala nʼiyi, nghọta nke ndị nwere nghọta ga-agba barịị.” 15Ahụhụ ga-adịrị ndị na-eche na ha na-ezonarị Onyenwe anyị nzube ha, ndị na-agbalịsị ike ime ihe ha zubere na nzuzo, ma na-asịrịta onwe ha, “Chineke agaghị ahụ anyị. Ọ maghị ihe anyị na-eme!” 16Lee ka unu si ekpu ihe ihu nʼala, ka a ga-asị na ọkpụ ite dị ka ụrọ e ji akpụ ite. Ihe mmadụ kpụrụ o nwere ike ịtụgharị gwa onye kpụrụ ya, sị, “Ị kpụghị m”? Ka ite o nwere ike ị sị ọkpụ ite, “Ị ghọtaghị ihe ọbụla”? 17Mgbe na-adịghị anya ọ bụ na Lebanọn agaghị aghọ ala ubi na-emepụta ihe, ala ubi ahụ na-emepụta ihe ga-adịkwa ka oke ọhịa? 18Nʼụbọchị ahụ, ndị ntị chiri ga-anụ ihe a na-agụpụta site nʼakwụkwọ ahụ, ndị ìsì, ndị ahụ naara ejegharị nʼọchịchịrị ga-emeghe anya ha, hụkwa ụzọ ọzọ. 19Ndị dị umeala nʼobi, na ndị ogbenye nʼetiti ndị mmadụ ga-achọta ọṅụ na obi ụtọ nke Onyenwe anyị Onye dị nsọ nke Izrel na-enye. 20Ndị na-adịghị enwe obi ebere agaghị adịkwa; ndị niile na-akwa emo agaghị adịkwa, ndị niile echiche ha bụ ime ajọ ihe ka a ga-ebipụ ndụ ha, 21bụ ndị ahụ na-eme ka e site nʼokwu ọnụ ha mee onye ọzọ onye ikpe mara, ndị na-eme ka onye na-ekpechite ọnụ onye a na-emegbu emegbu maa nʼọnya, ndị na-eji ịgba akaebe ụgha mee ka ikpe ziri ezi hapụ irute ndị ezi omume aka. 22Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị onye gbapụtara Ebraham na-agwa ụlọ Jekọb, “Ndị m, a gaghị emekwa ka ihere mee unu ọzọ. Ihu unu agaghị agbarụkwa ọzọ. 23Mgbe ha hụrụ ụmụ ha, bụ ọrụ aka m abụọ, nʼetiti ha, ha ga-edo aha m nsọ, ha ga-ekwupụta, nabatakwa ịdị nsọ nke Onye nsọ Jekọb, ha ga-eguzokwa nʼihu Chineke Izrel nʼegwu na nʼịma jijiji.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jen 12:1–7

1Onyenwe anyị gwara Ebram okwu sị, “Site nʼobodo gị, sikwa na ụmụnna gị na ezinaụlọ nna gị, gaa nʼala m ga-egosi gị. 2“Aga m eme gị mba ukwu, aga m agọzi gị, aga m eme ka aha gị dị ukwuu, ị ga-abụ ngọzị. 3Aga m agọzi ndị na-agọzi gị, ma onye ọbụla kọchara gị ka m ga-akọcha; a ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na gị.” 4Ya mere, Ebram hapụrụ gaa dịka Onyenwe anyị gwara ya. Lọt sokwa ya. Ebram agbaala iri afọ asaa na ise mgbe o si na Haran bulie ije. 5O duru nwunye ya Serai na Lọt nwa nwanne ya, chịkọtakwa akụ niile ha kpakọbara, na ndị ohu niile ha nwetara nʼala Haran, chee ihu ịga nʼala Kenan. Emesịa ha rutere nʼebe ahụ. 6Ebram jere ije nʼime ala Kenan jeruo nʼebe osisi ukwu More, nke dị nʼobodo Shekem. Ndị Kenan bi nʼala ahụ nʼoge ahụ. 7Onyenwe anyị mere ka Ebram hụ ya anya, ọ sịrị, “Aga m enye mkpụrụ gị ala a.” Ya mere, Ebram wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ nye Onyenwe anyị onye gosiri ya onwe ya.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ilu 14:15–26

15Onye na-enweghị uche na-ekwenye ihe niile a gwara ya; ma onye nwere uche na-atule mara ebe ọ na-eje. 16Onye mara ihe na-atụ egwu Onyenwe anyị na-ewezugakwa onwe ya nʼihe ọjọọ, ma onye nzuzu na-ewebiga iwe oke ma na-eche na ọ ka bụ onye kwesiri ntụkwasị obi. 17Onye iwe ọkụ na-eme ihe nzuzu, ma onye na-echepụta nzube ọjọọ ka a na-akpọ asị. 18Ndị na-enweghị uche na-enweta ụgwọ ọrụ nke uche gbagọrọ agbagọ, ma onye nwere uche na-enweta ihe ọmụma. 19Ndị ọjọọ ga-akpọ isiala nʼihu ndị ezi mmadụ, ndị ajọ omume ga-ada nʼọnụ ụzọ ama ndị ezi omume. 20Ọ bụladị ndị agbataobi onye ogbenye na-akpọ ya asị, ma ọgaranya na-enwe ọtụtụ ndị enyi. 21Onye na-eleda onye agbataobi ya anya na-emehie, ma onye na-emere ndị ogbenye ebere ka ihe ga-agara nke ọma. 22Ndị na-ezube ihe ọjọọ, ha ọ naghị akpafu? Ma ndị na-ezube ihe ọma na-achọta ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi. 23Ịrụsị ọrụ ike na-eweta uru; ma oke okwu na-eweta ụkpa. 24Okpueze nke ndị maara ihe bụ akụnụba ha, ma enweghị uche nke ndị nzuzu na-emepụta naanị ihe na-abaghị uru. 25Onye na-agba akaebe eziokwu na-anapụta ndụ mmadụ, ma onye akaebe ụgha bụ onye aghụghọ. 26Onye ọbụla na-atụ egwu Onyenwe anyị nwere ebe mgbaba; nye ụmụ ya ọ ga-abụkwa ebe ize ndụ.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 27 Maachị na kalenda nzukọ bụ 9 Epreel na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike