Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 9 Epreel
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 9 Epreel 2027
Fraịdee · Izu nke 2 nke Oge Ista
Mmemme na ndị nsọ
Fraịdee nke izu nke 2 nke Oge Ista
Ụbọchị izu · Agba ofufe: ọcha
Obubu ọnụ na nchegharị
Ụbọchị nchegharị
Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
34Ma otu onye nʼime ha bụ onye Farisii, bụrụkwa onye ozizi iwu a na-asọpụrụ, aha ya bụ Gamaliel, biliri ọtọ nʼetiti ọgbakọ ahụ, nye iwu ka a kpọpụ ndị ozi ahụ nʼezi nwa oge nta. 35Ọ sịrị ha, “Ndị Izrel, leziekwanụ anya nke ọma ihe unu na-achọ ime ndị a. 36Nʼoge gara aga Teodas pụtara na-egosi na ya bụ onye pụrụ iche, ihe dịka narị mmadụ anọ sokwara ya, mgbe e gburu ya, ndị niile sooro ya gbasasịrị ihe niile a kwụsịkwa. 37Mgbe nke ya gasịrị, Judas onye Galili pụtakwara gosi onwe ya nʼoge a na-agụ ọnụọgụgụ mmadụ, o nwetakwara ndị sooro ya. Mgbe e gbukwara ya, ndị niile na-eso ya gbasasịrị. 38Ya mere, agwa m unu, hapụnụ ndị a ka ha laara onwe ha. Nʼihi na ọ bụrụ na ọrụ ha bụ ọrụ mmadụ, ọ ga-akwụsị mgbe na-adịghị anya. 39Ma ọ bụrụ na o sitere nʼaka Chineke, unu agaghị enwe ike ịkwụsị ndị ikom ndị a, unu ga-achọpụta naanị na unu na-alụso Chineke ọgụ.” 40Ọgbakọ ahụ nabatara ndụmọdụ ya. Ha kpọrọ ndị ozi ahụ pịa ha ihe, nyekwa ha iwu ka ha kwụsị ikwu okwu nʼaha Jisọs, hapụkwa ha ka ha laa. 41Mgbe ha hapụrụ ọgbakọ ahụ, ha na-aṅụrị ọṅụ nʼihi na-agụnyere ha na ndị kwesiri ịnara mkparị nʼihi aha ya. 42Ụbọchị niile, nʼime ụlọnsọ ukwu ma nʼụlọ ndị mmadụ ha na-akụzi ma na-ekwusa oziọma na Jisọs bụ Kraịst ahụ.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị bụ ìhè m na nzọpụta m, onye ka m ga-atụ egwu ya? Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m, ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu? 4Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị, nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike; ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị ụbọchị niile nke ndụ m, na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị, na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya. 13Olileanya m bụ nke a: Aga m ahụ ịdị mma Onyenwe anyị nʼala ndị dị ndụ. 14Chere Onyenwe anyị; dịrị ike, nwekwaa ume, ma chere Onyenwe anyị.
Oziọma
1Mgbe nke a gasịrị, Jisọs gafere nʼofe nke ọzọ nke osimiri Galili (nke a na-akpọkwa osimiri Tiberịas). 2Oke igwe mmadụ sooro ya, nʼihi na ha hụrụ ọrụ ebube ọ na-arụ nʼahụ ndị ọrịa. 3Jisọs rigooro nʼelu ugwu nọdụ ala ya na ndị na-eso ụzọ ya. 4Nʼoge a, mmemme oriri Ngabiga ndị Juu na-abịa nso. 5Mgbe Jisọs leliri anya elu hụ oke igwe mmadụ na-abịakwute ya, ọ sịrị Filip, “Olee ebe anyị ga-azụta achịcha ndị a ga-ata?” 6Ọ jụrụ nke a naanị iji nwalee ya, ya onwe ya mararị ihe ọ ga-eme. 7Filip zara ya, “Ụgwọ ọrụ ọnwa isii agaghị ezu ịzụta achịcha nke onye ọbụla nʼime ha ga-atatụ naanị ihe ntakịrị.” 8Onye ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya bụ Andru, nwanne Saimọn Pita, kwupụtara, 9“Otu nwantakịrị nwoke nọ nʼebe a nwere ogbe achịcha balị ise, na azụ abụọ, ma gịnị ka ha bụ nʼetiti igwe mmadụ ha otu a?” 10Jisọs sịrị, “Meenụ ka ndị mmadụ ndị a nọdụ ala.” E nwere ọtụtụ ahịhịa nʼebe ahụ, ụmụ nwoke nọdụrụ ala, ha dị ihe ruru puku mmadụ ise. 11Ya mere, Jisọs weere achịcha ahụ nye ekele, kee ha ndị niile nọdụrụ ala dị ka ha sịrị chọọ. O jikwa azụ ahụ mee otu ihe ahụ. 12Mgbe ha niile rijuchara afọ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Tụtụkọtanụ iberibe niile fọdụrụ, ka ihe ọbụla hapụ ịla nʼiyi.” 13Ya mere, ha tụtụkọtara ha, kpojuo nkata iri na abụọ, bụ iberibe si nʼogbe achịcha balị ise nke ndị ahụ rifọrọ. 14Mgbe ndị mmadụ ahụ hụrụ ihe ịrịbama ahụ, o mere ha bidoro na-asị, “Nʼeziokwu, onye a bụ onye amụma ahụ nke ga-abịa nʼime ụwa.” 15Mgbe Jisọs matara na ha chọrọ ịbịa dọkpụrụ ya nʼike chie ya eze, ọ hapụrụ ha ga nʼugwu naanị ya, nʼonwe ya.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike