Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 10 Epreel
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 10 Epreel 2027
Satọdee · Izu nke 2 nke Oge Ista
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee nke izu nke 2 nke Oge Ista
Ụbọchị izu · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Nʼoge ahụ mgbe ọnụọgụgụ ndị na-eso ụzọ ya bidoro ịmụba, ndị Juu na-asụ asụsụ Griik mere mkpesa megide ndị Juu na-asụ asụsụ Hibru nʼihi na a na-elefuru ndị inyom ha, ndị di ha nwụrụ anwụ anya na nri a na-eke kwa ụbọchị. 2Nʼihi nke a, ndị ozi iri na abụọ ahụ kpọrọ ọgbakọ ndị niile na-eso ụzọ ya sị, “O zighị ezi na anyị ga-ahapụ ikwusa oziọma Chineke bido na-eke nri. 3Ụmụnna anyị, sitenụ nʼetiti unu họpụta ndị ikom asaa ndị a na-agbara ezi ama na ha jupụtara na Mmụọ Nsọ na amamihe. Anyị ga-enyefe ha ọrụ a nʼaka. 4Ebe anyị onwe anyị, ga-enyefe onwe anyị nʼọrụ ikpe ekpere, na ọrụ niile metụtara izisa oziọma.” 5Mmadụ niile nabatara atụmatụ a nke ọma. Ha họpụtara Stivin, nwoke jupụtara nʼokwukwe na Mmụọ Nsọ. Ha họpụtakwara Filip, Prokorọs, Nikanọ, Timọn, Pamenas na Nikolas, onye Antiọk na-eso ụzọ ofufe ndị Juu. 6Ha chere mmadụ ndị a nʼihu ndị ozi, ndị kpeere ha ekpere, bikwasịkwa ha aka nʼisi. 7Okwu Chineke gbasara nnọọ. Ọnụọgụgụ ndị na-eso ụzọ ya na Jerusalem bakwara ụba. Nʼoge a, ọtụtụ ndị nchụaja nabatara na-erubekwa isi nʼokwukwe.
Abụ Ọma nzaghachi
1Tienụ mkpu ọṅụ nye Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume; nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi ka ndị obi ha ziri ezi too ya. 2Werenụ ụbọ akwara too Onyenwe anyị; werenụ une nke nwere akwara iri kpọọrọ ya egwu. 4Nʼihi na okwu Onyenwe anyị niile ziri ezi bụrụkwa eziokwu; o kwesiri ntụkwasị obi nʼọrụ ya niile. 5Onyenwe anyị na-ahụ ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya; ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya ya nke na-enweghị ọgwụgwụ. 18Ma Onyenwe anyị ji anya ya na-eche ndị niile na-atụ ya egwu nche, ya bụ ndị niile na-atụkwasị obi ha nʼịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ. 19Ọ ga-anapụta ha site nʼaka ọnwụ. Ọ ga-echebekwa ha ọ bụladị nʼoge ụnwụ.
Oziọma
16Mgbe o ruru nʼuhuruchi, ndị na-eso ụzọ ya rịdara gaa nʼọnụ mmiri, 17ebe ha banyere nʼotu ụgbọ mmiri, malite ịgabiga osimiri gawa nʼofe Kapanọm. Nʼoge a ọchịchịrị agbaala ma Jisọs alọghachikwutebeghị ha. 18Ebili mmiri maliri elu nʼihi nʼoke ifufe bidoro na-efe. 19Ha akwọọla ụgbọ ihe dịka kilomita ise maọbụ isii, mgbe ha hụrụ Jisọs ka ọ na-aga ije nʼelu mmiri ahụ na-abịa nso nʼụgbọ mmiri ha. Oke egwu tụkwara ha. 20Ma ọ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Ọ bụ m.” 21Mgbe ahụ, ha nabatara ya nʼime ụgbọ ahụ, ọ dịkwaghị anya ụgbọ ha bịaruru nʼelu ala ebe ha na-aga.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike