Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 8 Epreel
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 8 Epreel 2027
Tọọzdee · Izu nke 2 nke Oge Ista
Mmemme na ndị nsọ
Tọọzdee nke izu nke 2 nke Oge Ista
Ụbọchị izu · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
27Mgbe a kpụtara ha, e mere ka ha guzoro nʼihu ọgbakọ ndị Sanhedrin, onyeisi nchụaja jụrụ ha ajụjụ, 28sị, “Ọ bụ anyị adọghị unu aka na ntị ka unu kwụsị ikuzi ihe nʼaha a; ma unu emeela ka ozizi unu jupụta Jerusalem niile kpebiekwa ime ka ọbara nwoke a dịrị anyị nʼisi.” 29Pita na ndị ozi ndị ọzọ zara sị, “Anyị ga-erubere Chineke isi ọ bụghị mmadụ. 30Chineke nna nna anyị a kpọlitela Jisọs site nʼọnwụ bụ onye ahụ unu gburu site nʼịkpọgide ya nʼelu osisi. 31Chineke ebuliela ya elu nʼaka nri nke ya onwe ya dị ka Ọkpara eze na Onye nzọpụta, ka o nwee ike inye ndị Izrel niile nchegharị na mgbaghara mmehie. 32Anyị bụ ndị ama nke ihe ndị a, Mmụọ Nsọ onye Chineke nyere ndị na-erubere ya isi bụkwa onyeama.” 33Mgbe ha nụrụ nke a, ọ gbawara ha obi, ha chọọ igbu ha.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma Devid. Mgbe ọ gbanwere omume ya mee ka onye na-ayị ara nʼihu Abimelek, onye nke chụpụrụ ya, ya a pụọ. Aga m eto Onyenwe anyị mgbe niile. Mgbe niile ka otuto ya ga-adị nʼọnụ m. 8Jiri aka gị tulee ma hụkwa na Onyenwe anyị dị mma; onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye nke na-agbaba nʼime ya. 16ma ihu Onyenwe anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ, ime ka a hapụ ichetakwa ihe banyere ha nʼụwa. 17Onyenwe anyị na-anụ olu ndị ezi omume, mgbe ha na-akpọku ya ka o nyere ha aka; ọ na-azọpụtakwa ha site na nsogbu ha niile. 18Onyenwe anyị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso, ọ na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ. 19Nsogbu na-adakwasị ndị ezi omume na-adị ukwuu, ma Onyenwe anyị na-anapụta ha site na nsogbu ndị ahụ niile.
Oziọma
31“Onye ahụ si nʼelu bịa dị elu karịa ihe niile, onye ahụ si nʼụwa bụkwa nke ụwa ma na-ekwukwa okwu dị ka onye si nʼụwa. Onye ahụ si nʼeluigwe dị elu karịa ihe niile. 32Ọ na-agba ama banyere ihe ọ hụrụ nakwa nke ọ nụrụ, ma o nweghị onye na-anabata ama ya. 33Onye ọbụla nabatara akaebe ya ji nke a mere akara, na Chineke bụ eziokwu. 34Nʼihi na onye Chineke zitere na-ekwu okwu Chineke. Nʼihi na ọ na-enye Mmụọ ya nʼuju. 35Nna hụrụ Ọkpara ya nʼanya, o tinyekwala ihe niile nʼaka ya. 36Onye ọbụla kwere nʼỌkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi, ma onye ọbụla jụrụ Ọkpara ahụ agaghị ahụ ndụ nʼihi na iwe Chineke ga-adịrị ya.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike