Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 31 Maachị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 31 Maachị 2027

Wenezdee · Ụbọchị asatọ nke Ista

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nʼime ụbọchị asatọ nke Ista

Mmemme ukwu · Agba ofufe: ọcha

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọrụ 3:1–10

1Otu ụbọchị Pita na Jọn na-aga nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere nʼoge ekpere nʼelekere atọ nke ehihie. 2Ma otu nwoke dara ngwụrọ site nʼafọ nne ya ka a na-ebute nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọnsọ ukwu ahụ ụbọchị niile ka ọ na-arịọ ndị na-aba nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ arịrịọ. Aha ọnụ ụzọ ama ahụ bụ ọnụ ụzọ ama ọma. 3Mgbe ọ hụrụ Pita na Jọn ka ha na-achọ ịba nʼụlọnsọ ukwu ahụ, o bidoro ịrịọ ha arịrịọ. 4Ma Pita na Jọn legidere ya anya, Pita sịrị, “Lee anyị anya.” 5O legidere ha anya chee na ha ga-enye ya onyinye. 6Ma Pita sịrị, “Enweghị m ọlaọcha maọbụ ọlaedo ma ihe m nwere ka m na-enye gị. Nʼaha Jisọs Kraịst onye Nazaret bilie ọtọ gawa ije.” 7O jidere ya aka nʼaka nri ya, nyere ya aka selite ya elu, ngwangwa, ụkwụ ya na nkwonkwo nke akwara ụkwụ ya nwetara ike. 8Ọ wụliri elu nʼụkwụ ya, bido ịga ije. O soro ha baa nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ya na-aga, ya ana-awụlị elu, na-etokwa Chineke. 9Mmadụ niile hụrụ ya ka ọ na-agagharị na-eto Chineke, 10ha ghọtara na ọ bụ ya bụ onye ahụ na-anọ nʼọnụ ụzọ ama ụlọnsọ ukwu ahụ, nke a na-akpọ ọnụ ụzọ ama ọma na-arịọ arịrịọ. Ọ gbagwojuru ha anya nke ukwuu, gbakwa ha gharịị ihe mere ya.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 105:1–4, 6–9

1Nyenụ Onyenwe anyị otuto, kwupụtakwa aha ya. Meenụ ka amata nʼetiti mba niile banyere ihe niile ọ rụrụ. 2Bụkuo ya abụ, bụkuo ya abụ otuto; kwupụtanụ ọrụ ihe ịrịbama ya niile. 3Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya; ka obi ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ṅụrịa. 4Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya, chọọnụ ihu ya mgbe niile. 6unu ụmụ ụmụ Ebraham, bụ ohu ya, unu ụmụ ụmụ Jekọb, ndị ọ họpụtara. 7Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị Chineke anyị; ikpe ya dị nʼụwa niile. 8Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi, bụ nkwa o kwere nye puku ọgbọ, 9ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbara na iyi ọ ṅụrụ nye Aịzik.

Oziọma

Luk 24:13–35

13Nʼotu ụbọchị ahụ, mmadụ abụọ nʼime ha gaje nʼobodo nta a na-akpọ Emaus, nke dị ihe ruru kilomita iri na abụọ site na Jerusalem. 14Ha na-ekwurịta nʼetiti onwe ha banyere ihe niile mere. 15Dị ka ha na-ekwu na-akparịta ụka banyere ihe ndị a, Jisọs nʼonwe ya bịara soro ha na-aga ije. 16Ma e mechiri anya ha ịmata na ọ bụ ya. 17Ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu na-ekwurịta nʼetiti onwe unu dị ka unu na-aga nʼụzọ.” Ha kwụsịrị ebe ahụ, gbarụọ ihu ha. 18Otu onye nʼime ha a na-akpọ Kleopas, sịrị ya, “Ị bụ onye ọbịa na Jerusalem nke mere na ị maghị ihe mere nʼime ya nʼụbọchị ndị a?” 19Ọ sịrị ha, “Gịnị bụ ihe mere?” Ha sịrị ya, “Banyere Jisọs onye Nazaret! Ọ bụ onye amụma bụrụkwa onye dị ike, ma nʼokwu ma nʼomume nʼihu Chineke na mmadụ niile. 20Na otu ndịisi nchụaja na ndị ọchịchị anyị nyefere ya ka a maa ya ikpe ọnwụ, ma kpọgbukwaa ya nʼobe. 21Anyị nwererịị olileanya na ọ bụ ya ga-agbapụta Izrel. Nke ka nke, taa mere ya abalị atọ kemgbe ihe ndị a mere. 22Tụkwasị ihe ndị a, ụfọdụ ụmụ nwanyị anyị mere ka anyị nwee ihe ịtụnanya. Ha gara nʼili ahụ nʼisi ụtụtụ a. 23Ma ha ahụghị ahụ ya. Ha bịara kọrọ anyị na ha hụrụ ọhụ nke ndị mmụọ ozi, bụ ndị gwara ha na ọ dị ndụ. 24Ya mere ụfọdụ nʼime ndị otu anyị gara nʼili ahụ chọpụta na ihe niile ụmụ nwanyị a kwuru mere otu ahụ ha siri kwuo ya. Ma ha ahụkwaghị ya.” 25Ọ sịrị ha, “Unu bụ nnọọ ndị nzuzu! Leenụ ka o si siere unu ike ikwere ihe niile ndị amụma kwuru. 26Ọ bụ na o kwesighị ka Kraịst taa ahụhụ ndị a tupu ọ banye nʼebube ya?” 27Ya mere, ọ kọwaara ha ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ banyere ya onwe ya malite na nke Mosis ruo na ndị amụma niile. 28Mgbe ha na-eru obodo nta ahụ ha na-aga, o mere dị ka ọ na-aga nʼihu na njem ya. 29Ma ha rịọ ya nʼebe ọ dị ukwuu sị, “Nọnyerenụ anyị nʼihi na chi ebidola iji, ụbọchị agamiekwala ugbu a.” Nʼihi ya ọ banyere ịga nọnyere ha. 30Mgbe ya na ha nọdụrụ na tebul iri nri, o were achịcha, kelee Chineke ekele, nyawaa ya were ya nye ha. 31Mgbe ahụ, e meghere anya ha, ha amata onye ọ bụ, ha ahụkwaghị ya anya ọzọ. 32Mgbe ahụ, ha gwara onwe ha sị, “Ọ bụ na ọ dịghị ka ọkụ ọ na-enwu nʼobi anyị mgbe anyị na ya nọ nʼụzọ, ya na-ekpughere anyị akwụkwọ nsọ?” 33Ha biliri ngwangwa laghachi Jerusalem. Ebe ahụ, ha hụrụ mmadụ iri na otu ahụ na ndị so ha ka ha nọkọtara nʼotu ebe, 34na-asị, “Ọ bụ eziokwu, Onyenwe anyị ebiliela, o gosila Saimọn onwe ya.” 35Mgbe ahụ, ha kọọrọ ha ihe mere nʼụzọ, ya na otu ha siri mata ya mgbe ọ nyawara achịcha.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike