Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 23 Maachị
Kalenda Ọtọdọks · 10 Maachị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 23 Maachị 2027
Tiuzdee · Izu nke 2 nke Lent Ukwu · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
Martyr Quadratus and those with him at Corinth († 250-258): Cyprian, Dionysius, Anectus, Paul, Criscentus, another Dionysius, Victorinus, Victor, Niciphorus, Claudius, Diodorus, Serapion, Papius, Leonidus, and the holy women Chariessa, Nunechia, Basilissa, Nica, Calisa, Gala, Galina, Theodora, and many others
Oge Lent Ukwu
Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Elekere nke 6
7Ubi vaịnị nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ mba Izrel na ndị Juda, ha bụ vaịnị ahụ nke nʼatọ obi ya ụtọ. Ma o lere anya ikpe ziri ezi, ma ihe ọ hụrụ bụ iwusi ọbara. O lere anya ezi omume, ma ihe ọ nụrụ bụ mkpu akwa ndị a na-emegbu emegbu. 8Ahụhụ dịrị unu ndị na-azụkọta ala ma ndị ọzọ ahụghị ebe ha ga-ebi, unu ndị na-ewu ụlọ na-ewukwasị ụlọ nʼala buru ibu, ime ka ọ bụrụ naanị unu bi nʼụwa. 9Ma Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ihe banyere unu, na ọnọdụ unu. Eji m ntị m abụọ nụ mgbe ọ na-asị, “Nʼezie, ọtụtụ ụlọ mara mma ga-atọgbọrọ nʼefu, ụlọ ukwu mara mma ndị nwe ha agaghị anọkwa. 10Ubi vaịnị ahụ a ga-eji ehi abụọ kọọ ụbọchị iri ga-ewepụta naanị ihe nwere ike iru galọọnụ mmanya isii, ma ọka a kọrọ, nke ruru akpa ọka atọ ga-amịpụta ihe ruru otu akpa nʼọkara.” 11Ahụhụ ga-adịrị unu niile ndị na-ebili nʼisi ụtụtụ ịgbaso mmanya. Ndị na-amụgide anya abalị tutu ruo mgbe ha ṅụbigara mmanya oke. 12Unu na-eji ụbọ akwara dị iche iche na une, na ihe iti egwu na opi, na mmanya na-eme onwe unu obi ụtọ nʼoge mmemme oriri unu, ma unu na-elelị Onyenwe anyị anya; unu adịghịkwa asọpụrụ akaọrụ ya. 13Nʼihi ya, ndị m ga-eje biri na mba ọzọ, nʼihi amaghị ihe; ndị ọkwa ha dị elu ga-anwụ nʼihi agụụ, ndị mmadụ efu ga-abụ ndị akpịrị ga-akpọ nkụ nʼihi agụụ mmiri. 14Nʼihi ya, ala mmụọ na-eme ka ọchịchọ ya saa mbara, ọ na-asaghebigakwa ọnụ ya oke; ndị ukwu na ndị nta bi nʼime ala a ka ọ ga-elo, tinyere ndị na-emebiga mkpọtụ oke, na ndị na-egwuribiga egwu ọṅụ oke. 15Nʼụbọchị ahụ, a ga-eweda nʼala ndị dị elu, na ndị dị ala, ndị mpako ka a ga-eweda nʼala. 16Ma Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee ọnọdụ dịkarịsịrị elu, nʼihi ikpe ikpe ziri ezi ya, Chineke onye dị nsọ na-egosikwa onwe ya na ọ dị nsọ site nʼezi omume ya.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
8Ken gwara nwanne ya Ebel sị, “Bịa soro m ka anyị banye ọhịa.” Mgbe ha nọ nʼebe ahụ, Ken jidere nwanne ya gbuo ya. 9Emesịa, Onyenwe anyị jụrụ Ken ajụjụ sị, “Ebee ka Ebel nwanne gị nwoke nọ?” Ọ zaghachiri, “Amaghị m. Abụ m onye nche nwanne m?” 10Ma Onyenwe anyị zara sị ya, “Gịnị ka i mere? Gee ntị, ọbara nwanne gị na-akpọku m site nʼala. 11Site ugbu a gaa nʼihu ị bụrụla onye a bụrụ ọnụ, na onye e si nʼala chụpụ, ala ahụ meghepụrụ ọnụ ya nabata ọbara nwanne gị, site nʼaka gị. 12Mgbe ị kụrụ ihe ọbụla nʼime ya, ala agaghị enye gị mkpụrụ ya nʼuju. Site ugbu a gaa nʼihu, ị ga-abụ onye na-awagharị awagharị na onye na-abaghị nʼihe nʼụwa.” 13Ken zara Onyenwe anyị, “Ntaramahụhụ i nyere m dị ukwuu karịa nke m nwere ike ibu. 14Ugbu a, abụ m onye i si nʼala ubi ya chụpụ. Abụkwa m onye i si nʼihu gị chụpụ. Bido taa aga m abụ onye na-awagharị awagharị nʼime ụwa. Onye ọbụla hụkwara m ga-egbu m.” 15Onyenwe anyị zara sị ya, “O nweghị onye ga-egbu gị, nʼihi na aga m atụkwasịrị onye ọbụla metụrụ gị aka ntaramahụhụ okpukpu asaa karịa nke m nyere gị.” Ya mere, Onyenwe anyị kara Ken akara iji gbochie onye ọbụla hụrụ ya igbu ya.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
1Nwa m, ṅaa ntị nʼokwu amamihe m, gee ntị nʼokwu nghọta m ndị a. 2Lezie anya, ka i debe izuzu dị iche iche, ka egbugbere ọnụ gị na-echebekwa ihe ọmụma. 3Nʼihi na egbugbere ọnụ nwanyị na-akwa iko na-atọ ka mmanụ aṅụ, okwu ọnụ ya na-akwọ mụrụmụrụ karịa mmanụ. 4Ma nʼikpeazụ, ọ na-elu ilu dịka oluilu dịkwa nkọ ka mma agha ihu abụọ. 5Ụkwụ ya abụọ na-arịdaru nʼọnwụ, nzọ ụkwụ ya abụọ na-eje nʼụzọ ọkụ ala mmụọ. 6Nʼihi na ọ dịghị agbaso ụzọ kwesiri ndụ; ụzọ ya gbagọrọ agbagọ, ma ọ maghị nke a. 7Ugbu a ụmụ m, geenụ m ntị, unu esikwala nʼokwu niile nke ọnụ m wezuga onwe unu. 8Gbaara nwanyị dị otu a ọsọ! Ejekwala ọnụ ụzọ ụlọ ya nso, 9ka ị ghara ire ugwu gị nʼebe ndị ọzọ nọ, maọbụ were ndụ gị tinye nʼaka ndị na-enweghị obi ebere. 10Ka ndị ọbịa ghara inwe oke oriri nʼelu akụ gị, ka ihe niile ị dọgburu onwe gị nʼọrụ ịkpata gharakwa imejupụta ụlọ onye ọzọ. 11Ka ị gharakwa ịsụ ude nʼikpeazụ mgbe ọrịa ga-eripịa ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị. 12Mgbe ị ga-asị, Lee ka m si kpọọ ịdọ aka na ntị asị! “Leekwa ka obi m si lelịa iba mba anya! 13Egeghị m ntị nʼozizi nke ndị nkuzi m maọbụ nabata ndụmọdụ nke ndị ndụmọdụ m. 14Nʼihi na ugbu a, abịaruola m na mbibi nʼihu ọha mmadụ niile.” 15Ṅụọ naanị mmiri nke si nʼite mmiri gị; mmiri dị mma nke si nʼolulu mmiri gị.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 10 Maachị na kalenda nzukọ bụ 23 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike