Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 22 Maachị

Kalenda Ọtọdọks · 9 Maachị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 22 Maachị 2027

Mọnde · Izu nke 2 nke Lent Ukwu · Olu 1

Mmemme na ndị nsọ

The Holy Forty Martyrs of Sebaste († c.320): Cyrion, Candidus, Domnus, Hesychius, Iraclius, Smaragdus, Eunoicus, Valentus, Vivian, Claudius, Priskus, Theodulus, Eutichius, John, Xanthus, Ilian, Sisinius, Angius, Aetius, Flavius, Dometian, Gaius, Leontius, Athanasius, Cyrill, Sakerdonus, Nicholas, Valerius, Philoctimon, Seberian, Chudionus, Aglaius, and Meliton

Oge Lent Ukwu

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ofufe ụtụtụ: Oziọma (maka ndị nwụrụ nʼihi okwukwe)

Luk 21:12–19

12“Ma tupu ihe ndị a niile emezuo, ha ga-ejide unu, kpagbukwaa unu. Ha ga-enyefe unu nʼaka ọtụtụ ụlọ ekpere. Ha ga-atụkwa unu mkpọrọ. Ha ga-akpọpụkwa unu nʼihu ndị eze na ndị ọchịchị nʼihi aha m. 13Nke a ga-abụrụ unu ohere iji gbaa akaebe. 14Ma burunu ụzọ kpebie nʼobi unu na unu agaghị echegbu onwe unu maka ihe unu ga-aza. 15Nʼihi na aga m enye unu ụdị okwu na amamihe nke ndị na-ebo unu ebubo na-enweghị ike iguzogide maọbụ kwuo okwu megide. 16Ọ bụladị ndị mụrụ unu, ụmụnne unu ndị nwoke na ndị nwanyị, ndị ikwu unu na ndị enyi unu, ha ga-arara unu nye nʼaka ndị ọchịchị, ndị ga-egbukwa ụfọdụ nʼime unu. 17Mmadụ niile ga-akpọ unu asị nʼihi m. 18Ma otu agịrị isi dị nʼisi unu agaghị ala nʼiyi. 19Unu ga-azọpụta ndụ unu site na ntachiobi unu.

Elekere nke 6

Aịz 4:2–5:7

2Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eme ka Alaka Onyenwe anyị mabiga mma oke, ma nwekwa ebube dị ukwuu. Ndị fọdụrụ ndụ nʼIzrel ga-enweta ihe ubi ga-enye ha ọṅụ, na nke ga-ewetara ha obi nganga na mmụọ ịnya isi. 3Ndị ahapụrụ na Zayọn, ndị nọ na Jerusalem ka a ga-akpọ ndị dị nsọ, bụ ndị ahụ niile e dere aha ha nʼetiti ndị bi nʼime Jerusalem. 4Onyenwe anyị ga-asachapụ unyi niile nke ndị inyom Zayọn, ọ ga-asachapụkwa ọbara niile dị na Jerusalem site na mmụọ nke ikpe, na mmụọ nke ọkụ. 5Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-ewuru ugwu Zayọn niile na ndị niile zukọrọ nʼebe ahụ ndo ga-ekpuchi ha niile. Ihe ọ ga-eji mee ndo a bụ igwe ojii na anwụrụ ọkụ nke ga-adịrị ha nʼehihie, na ọkụ na-enwu enwu, nke ga-adịrị ha nʼabalị. Ebube ahụ ga-abụ ihe mkpuchi nye ha. 6Ọ ga-abụrụ ha ebe mgbaba na ndo ime ka okpomọkụ nke ehihie hapụ ịchagbu ha. Ọ ga-abụkwara ha ebe izere ndụ, na ebe nzuzo pụọ nʼoke ifufe na mmiri. 5:1Aga m abụ abụ nye onye m hụrụ nʼanya, abụ banyere ubi vaịnị ya. Onye m hụrụ nʼanya nwere ubi ya nʼelu ugwu nta nke bụ ezi ala. 2O gwuzere ya, wepụsịa okwute niile dị nʼime ya, werekwa mkpụrụ vaịnị mara mma kụọ nʼime ya. O wuru ụlọ nche nʼetiti ya, sitekwa na nkume wapụtakwa ebe ịzọcha mmanya. Emesịa, ọ nọdụrụ chere oge owuwe ihe ubi. Mgbe oge ahụ ruru, ọ chọpụtara na nʼọnọdụ mkpụrụ vaịnị mara mma, ọ bụ ndị jọrọ njọ mịrị. 3“Ugbu a, ndị ikom Jerusalem na Juda, unu anụla ihe mere. Kpebienụ ikpe a dị nʼetiti mụ na ubi vaịnị m. 4Olee ihe ọzọ m gaara emere ya karịa ihe m mere? Gịnị mere ubi vaịnị m ji mịara m mkpụrụ jọrọ njọ nʼọnọdụ mkpụrụ na-atọ ụtọ? 5Ugbu a, lee, ihe m na-aga ime ubi vaịnị m a. Aga m ewepụ ihe mgbochi a gbara ya, hapụ ya ka ọ ghọọ ebe anụ ụlọ na-ata nri. Aga m etida mgbidi ya hapụ ya ka ọ bụrụ ebe a na-azọtọ ụkwụ. 6Agaghị m akwachakwa ya ọzọ. Agakwaghị m egwuru ya ala, aga m ahapụ ya ka ogwu na uke too nʼime ya. Aga m enyekwa igwe ojii iwu ka mmiri ghara izokwasị ya ọzọ.” 7Ubi vaịnị nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ mba Izrel na ndị Juda, ha bụ vaịnị ahụ nke nʼatọ obi ya ụtọ. Ma o lere anya ikpe ziri ezi, ma ihe ọ hụrụ bụ iwusi ọbara. O lere anya ezi omume, ma ihe ọ nụrụ bụ mkpu akwa ndị a na-emegbu emegbu.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jen 3:21–4:7

21Emesịa, Onyenwe anyị Chineke weere akpụkpọ anụ meere Adam na nwunye ya uwe oyiyi. 22Onyenwe anyị Chineke sịrị, “Lee, mmadụ adịla ka onye ọbụla nʼime anyị site nʼịmata ihe ọma na ihe ọjọọ. Ugbu a, ka ọ gharakwa ị setịpụ aka ya ghọrọ mkpụrụ osisi ahụ na-enye ndụ rie, si otu a dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.” 23Nʼihi nke a, Onyenwe anyị Chineke chụpụrụ ya site nʼogige Iden ka ọ gaa na-arụ ọrụ nʼala e si wepụta ya. 24Mgbe ọ chụpụrụ mmadụ, o dochiri nʼọwụwa anyanwụ nke ogige Iden ndị mmụọ ozi dị ike a na-akpọ Cherubim, na mma agha na-acha ọkụ, ka ha na-eche ọnụ ụzọ e si aba nʼebe osisi ahụ na-enye ndụ dị nche. 4:1Emesịa, Adam na nwunye ya Iiv dinakọrọ dịka di na nwunye. Iiv tụụrụ ime mụọ nwa nwoke, onye ha gụrụ Ken. Iiv sịrị, “Site nʼinyeaka Onyenwe anyị, amụtala m nwa nwoke!” 2Emesịa Iiv mụtara nwanne ya nwoke Ebel. Ebel ghọrọ onye na-azụ igwe atụrụ. Ma Ken ghọrọ onye ọrụ ubi. 3Mgbe ụfọdụ oge gasịrị, Ken wetaara Onyenwe anyị ụfọdụ ihe ubi ya dịka onyinye. 4Ma Ebel, ya onwe ya nyekwara onyinye site nʼigwe ewu na atụrụ ya e bụ ụzọ mụọ, nke mara abụba. Onyenwe anyị nabatara Ebel na onyinye ya, 5ma ọ nabataghị Ken na onyinye ya. Nke a wutere Ken, mee ka o wee iwe dị ukwuu. Ihu ya agbarụọ. 6Ma Onyenwe anyị jụrụ ya sị, “Gịnị mere i ji ewe iwe? Gịnị mere ihu gị ji gbarụọ? 7Ọ bụrụ na i mee ihe ziri ezi, agaghị anabata gị? Ọ bụrụkwanụ na ị jụ ime ihe ziri ezi, mmehie nọ nʼọnụ ụzọ na-eche gị ịla gị nʼiyi. Lezie anya hụ na i meriri ya.”

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ilu 3:34–4:22

34Ndị mpako na-akwa emo ka ya onwe ya na-akwakwa emo, ma ndị dị umeala nʼobi ka ọ na-enye amara. 35Ndị maara ihe na-enweta nsọpụrụ, ma ndị nzuzu na-enweta ihere. 4:1Ụmụ m ndị ikom, geenụ ntị na ndụmọdụ nke nna unu, lezienụ anya ka unu nwee nghọta. 2Ṅaanụ ntị, nwee uche, nʼihi na ọ bụ ezi ozizi ka m na-ezi unu; ya mere, unu ahapụkwala iwu m. 3Mgbe m bụ nwantakịrị nʼụlọ nna m, mgbe m ka dị ntakịrị, bụrụkwa naanị otu nwa nne m ji, 4ọ ziri m ihe, sịkwa m, “Ka obi gị jidesie okwu m niile ike, debe nʼiwu niile, ị ga-adịkwa ndụ. 5Nweta amamihe, nwetakwa nghọta, echezọkwala okwu m, maọbụ site na ya wezuga onwe gị. 6Ahapụla amamihe, ọ ga-echebe gị, hụ ya nʼanya, nʼihi na ọ ga-eduzi gị. 7Mmalite amamihe bụ nke a, nweta amamihe, ihe ọbụla o ga-efu gị, nweta nghọta. 8Ọ bụrụ na i bulie amamihe elu, o ga-ebulikwa gị elu. Jidesie ya ike, ọ ga-ewetara gị oke nsọpụrụ. 9Ọ ga-eji okpueze okoko osisi chọọ isi gị mma nyekwa gị okpueze mara mma nʼisi gị.” 10Nwa m, ṅaa m ntị, meekwa ihe m gwara gị; ị ga-enwekwa ndụ ogologo. 11M ga-edu gị nʼụzọ nke amamihe, duokwa gị nʼụzọ ziri ezi. 12Ọ bụrụ na i bie ụdị ndụ dị otu a, ihe agaghị akpọ gị nʼụkwụ nʼije gị, ị gaghị asụkwa ngọngọ mgbe ị na-agba ọsọ. 13Mee ihe niile m gwara gị, echefukwala ha, nʼihi na ọ ga-eduba gị na ndụ zuruoke. 14Emela dịka ndị na-emebi iwu. Esokwala ụzọ ha. 15Zeere ha, ejekwala nʼụzọ ha; chepu ihu gị nʼụzọ ahụ, 16nʼihi na ndị na-emebi iwu adịghị arahụ ụra tutu ha emee arụ nke ụbọchị ahụ. Ha anaghị ezu ike tutu ha emee ka otu onye maa nʼọnya. 17Ha na-eri ihe oriri nke mmebi iwu, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ nke ọgbaaghara. 18Ma ụzọ ndị ezi omume dị ka anyanwụ na-awa nʼisi ụtụtụ, nke na-enwuwakwa dịka ìhè nʼetiti ehihie ụbọchị. 19Ma ụzọ onye na-emebi iwu dị ka itiri nke ọchịchịrị, ha anaghị ama ihe na-eme ka ha sụọ ngọngọ. 20Gee ntị nwa m, nʼihe m na-ekwu. Gee ntị nke ọma. 21Doo ihe ndị a nʼuche gị mgbe niile; ka ha bamiekwa nʼime obi gị, 22nʼihi na ha bụ ndụ nye ndị chọtara ha, bụrụkwa ahụ ike nye mmadụ.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka ndị nwụrụ nʼihi okwukwe)

Aịz 43:9–14

9Mba niile dị iche iche ezukọtala, mmadụ niile agbakọtakwala. Onye nʼime chi ha kwuru na ihe dị otu a ga-eme, onye kwa kwuru ihe ndị a mere nʼoge gara aga? Ka ha kpọbata ndị akaebe ha izipụta na ihe ha kwuru ziri ezi, ka ndị ọzọ nụ ya ma sị na, “Ọ bụ eziokwu.” 10“Unu bụ ndị akaebe m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “bụrụkwa ndị ohu m họpụtara, ka unu mara m, ma kwerekwa na m, ghọtakwa na Mụ onwe m bụ onye ahụ. Ọ dịghị chi a kpụrụ tupu m dịrị, ọ dịkwaghị nke ga-eso m nʼazụ. 11Mụ, ọ bụ na naanị m, bụ Onyenwe anyị, ọ dịkwaghị onye nzọpụta ọzọ dị ma ewezuga m. 12Mụ onwe m egosila, zọpụta ma kwupụtakwa ya, mee ka unu nụrụ ya, mụ onwe m, ọ bụghị chi ndị mba ọzọ nọ nʼetiti unu. Unu bụkwa ndị akaebe m, na mụ onwe bụ Chineke,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 13“E, site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi, mụ onwe m bụ Chineke. Ọ dịghị onye pụrụ ịnapụta m ihe m ji nʼaka. Mgbe m rụrụ ọrụ, onye pụrụ ịgbanwe ya?” 14Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, Onye mgbapụta unu na Onye nsọ nke Izrel. “Nʼihi unu, aga m eziga ozi na Babilọn budata ndị Kaldịa niile dịka ndị gbapụrụ agbapụ, nʼime ụgbọ mmiri ahụ niile ha ji anya isi.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka ndị nwụrụ nʼihi okwukwe)

Ọ dịghị na nsụgharị a

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka ndị nwụrụ nʼihi okwukwe)

Ọ dịghị na nsụgharị a

Akwụkwọ ozi (maka ndị nwụrụ nʼihi okwukwe)

Hib 12:1–10

1Ya mere, anyị nwere oke igwe ndị ama dị otu a gbara anyị gburugburu, nʼihi nke a, ka anyị wepụ ihe ọbụla nke na-adọghachi anyị azụ dịka ibu arọ, ya na mmehie niile nọdebere anyị nsọ karịa. Ka anyị werekwa ntachiobi gbaa ọsọ nke chere anyị nʼihu. 2Ka anyị na-elegide Jisọs anya, onye mbụ na onye na-eme ka okwukwe anyị zuo oke, onye jiri nʼihi ọṅụ e debere nʼihu ya, die ahụhụ na ihe ihere nke obe, ọ nọdụ nʼaka nri nke ocheeze Chineke. 3Tuleenụ nʼobi unu gbasara onye ahụ tachịrị obi na nkwụgide sitere nʼaka ndị mmehie, ka ike ghara ịgwụ unu maọbụ obi unu adaa mba. 4Nʼime ọgụ nke unu na-alụso mmehie, unu eguzogideghị ruo nʼọnọdụ nke iwufu ọbara unu. 5Unu echefuola okwu nkasiobi ahụ, nke e jiri gbaa unu ume dịka ụmụ, “Nwa m ewela ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị dịka ihe dị mfe, mgbe ọ na-ata gị ahụhụ maọbụ daa mba mgbe ọ na-abara gị mba. 6Nʼihi na onye Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba. Ọ bụkwa onye ọ nabatara dị ka nwa ya, ka ọ na-apịa ụtarị.” 7Tachie obi, mụta ihe site nʼahụhụ. Nʼihi na Chineke na-emeso unu mmeso dị ka nna ọbụla hụrụ ụmụ ya nʼanya si emeso ha mmeso. Nwata ọbụla adịghị nke nna ya na-adịghị abara mba. 8Ya mere ọ bụrụ na a dịghị abara unu mba dịka esi bara ndị ọzọ, unu abụghị ụmụ kama unu bụ ndị amụtara nʼịkwa iko. 9Dịka ịma atụ, ndị bụ nna anyị site nʼanụ ahụ na-apịa anyị ụtarị mgbe ọbụla anyị nupuru isi. Ma nke a adịghị egbochi anyị ịsọpụrụ ha. O kwesikwaghị ka anyị rubere Nna nke mmụọ isi karịa ma dịkwa ndụ? Anyị mee nke a, anyị ga-adị ndụ. 10Ha na-azụ anyị nwa oge nta dị ka ha si tụpụta nʼuche ha. Ma ọ na-azụ anyị nʼihi ọdịmma anyị. Ọ na-achọ ka anyị keta oke nʼịdị nsọ ya.

Oziọma (maka ndị nwụrụ nʼihi okwukwe)

Mat 20:1–16

1“Ihe ọzọ a ga-eji tụnyere alaeze eluigwe bụ nwoke nwere ala ubi, onye pụrụ nʼisi ụtụtụ ịkpọta ndị ọrụ ga-arụ ọrụ nʼubi vaịnị ya. 2Ya na ndị ọrụ ahụ kwekọtara na ọ ga-akwụ ha otu denarị, nʼihi ọrụ ụbọchị ahụ. Emesịa o zigara ha nʼubi vaịnị ya. 3“Mgbe ọ pụrụ nʼihe dị ka elekere itoolu nke ụtụtụ, o sitere nʼebe a na-akpọta ndị ọrụ na-agafe hụ ndị ọzọ ka ha guzoro nʼọma ahịa na-enweghị ọrụ ha na-arụ. 4Ọ sịrị ha, ‘Unu onwe unu gaakwanụ rụọ ọrụ nʼubi vaịnị m, ihe ọbụla ziri ezi ka m ga-akwụ unu.’ 5Ya mere ha gara. “Ọ pụkwara nʼelekere iri na abụọ na elekere atọ nke ehihie, ma meekwa otu ihe ahụ. 6Mgbe o ruru elekere ise nke anyasị, ọ pụrụ hụ ndị ọzọ ka ha guzoro. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, ‘Gịnị mere unu ji guzoro nʼebe a taa niile na-arụghị ọrụ?’ 7“Ha zara sị ya, ‘Nʼihi na ọ dịghị onye kpọrọ anyị ọrụ.’ “Ọ gwara ha sị, ‘Unu onwe unu gaakwanụ rụọ ọrụ nʼubi vaịnị m. Aga m akwụkwa unu ihe dị mma.’ 8“Mgbe o ruru oge anyasị, onye nwe ubi vaịnị ahụ gwara onye na-elekọtara ya ndị ahụ anya sị, ‘Kpọkọta ndị ọrụ ahụ kwụọ ha ụgwọ, site na ndị ikpeazụ bịara ọrụ ruo na ndị bu ụzọ.’ 9“Mgbe ndị a kpọrọ ọrụ nʼelekere ise anyasị naara ego ha, a kwụrụ ha otu denarị, otu denarị. 10Ma mgbe ndị a kpọrọ ọrụ nʼisi ụtụtụ bịara ịnara ego ha, ha lere anya na a ga-akwụ ha karịa. Ma a kwụkwara ha niile otu denarị. 11Mgbe ha naara ego ahụ, ha tamuru ntamu megide nna nwe ụlọ, 12na-asị, ‘Ndị a bịara nʼikpeazụ rụrụ ọrụ naanị otu awa, ma i meela ka anyị na ha hara. Anyị bụ ndị buru ihe mgbu nke ọrụ ma okpomọkụ nke anwụ niile chara nʼụbọchị taa.’ 13“Ma ọ zara otu nʼime ha sị, ‘Enyi m, emeghị m gị ihe ọjọọ ọbụla. Ọ bụ na mụ na gị ekwughị na m ga-akwụ gị otu denarị nʼụbọchị? 14Nara nke ruru gị laa. A chọrọ m ịkwụ ndị a bịara nʼikpeazụ ụgwọ dị ka m si kwụọ gị. 15Ọ bụ na m enweghị ike iji ihe m nwere mee otu ọ masịrị m? Ọ bụ anya ukwu ka ị na-enwe nʼihi afọ ofufu m?’ 16“Ya mere, onye ikpeazụ ga-abụ onye bu ụzọ, ma onye bu ụzọ ga-abụkwa onye ikpeazụ.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 9 Maachị na kalenda nzukọ bụ 22 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike