Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 17 Maachị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 17 Maachị 2027
Wenezdee · Izu nke 5 nke Lent
Mmemme na ndị nsọ
Wenezdee nke izu nke 5 nke Lent
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: odo odo
Onye nsọ Patrik, Bishọp · Ncheta nkenke
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
14Nebukadneza sịrị ha, “Ọ bụ eziokwu, Shedrak, na Mishak, na Abednego, na unu adịghị efe chi m maọbụ kpọọ isiala nye oyiyi ọlaedo ahụ m guzobere? 15Mgbe unu nụrụ ụda opi, ọja, une na ụbọ akwara maọbụ ihe egwu ọzọ, ọ bụrụ na unu adaa nʼala kpọọ isiala nye oyiyi ahụ a kpụrụ akpụ, ihe niile ga-adị mma. Kama ọ bụrụ na unu ajụ ịkpọ isiala, a ga-atụnye unu ngwangwa nʼime ọkụ na-enwu ajọ onwunwu. Kedụ chi ahụ nke pụrụ ịnapụta unu site nʼaka m?” 16Shedrak, na Mishak, na Abednego, gwara eze, “O Nebukadneza, ọ dịghị mkpa na anyị ga-azara ọnụ anyị nʼihu gị banyere okwu a. 17Ọ bụrụ Chineke anyị na-efe nwere ike ịzọpụta anyị site nʼọkụ na-enwusi ike nʼaka gị, ya zọpụta anyị. 18Ma ọ bụrụkwa na ọ zọpụtaghị anyị, mata nke ọma, o eze, na anyị agaghị efe chi gị ndị a maọbụ kpọọ isiala nye oyiyi a ị kpụrụ akpụ nke ị guzobere.” 19Mgbe ahụ, Nebukadneza jupụtara nʼoke iwe megide Shedrak, na Mishak, na Abednego, nke bụ nʼihu ya gbarụrụ nʼebe ha nọ. O nyere iwu sị ka e mee ụlọ ọkụ ahụ ka ọ dị ọkụ ugboro asaa karịa ka o kwesiri. 20Ọ nyere ụfọdụ ndị kacha sie ike nʼetiti ndị agha ya iwu ka e kee Shedrak, na Mishak, na Abednego eriri nʼụkwụ na aka, tụbakwa ha nʼọkụ ahụ na-enwu enwu. 24Nʼọnọdụ iju anya, Eze Nebukadneza wuliri nʼụkwụ ya, jụọ ndị ndụmọdụ sị, “Ọ bụghị ndị ikom atọ anyị kere agbụ ka anyị tụbara nʼime ọkụ?” Ha zara eze, “Ọ bụ ezie, eze.” 25Ọ sịrị, “Ma ana m ahụ mmadụ anọ ndị a na-ekeghị agbụ, ka ha na-agagharị nʼime ọkụ ahụ. Leekwa na ọkụ ahụ anaghị ere ha. Onye ahụ mere ha mmadụ anọ yiri nwa nke ndị bụ chi.” 28Mgbe ahụ, Nebukadneza sịrị, “Otuto dịrị Chineke nke Shedrak, Mishak na Abednego nʼihi na o zitere mmụọ ozi ya ịzọpụta ndị ohu ya tụkwasịrị ya obi, mgbe ha jụrụ ime ihe eze nyere nʼiwu, kama ha jiri aka ha họrọ ịnwụ, kama ife chi ọzọ nke na-abụghị Chineke nke ha.
Abụ Ọma nzaghachi
Ọ dịghị na nsụgharị a
Oziọma
31Jisọs gwara ndị Juu ndị kwere na ya, “Ọ bụrụ na unu anọgide nʼokwu m nʼezie unu ga-abụ ndị na-eso ụzọ m. 32Unu ga-amatakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.” 33Ha zara ya, “Anyị bụ ụmụ Ebraham, o nwebeghị oge anyị ji bụrụ ohu onye ọbụla. Olee otu i si na-asị na a ga-eme ka anyị nwere onwe anyị?” 34Jisọs zara ha, “Nʼezie, nʼezie asị m unu, onye ọbụla na-eme mmehie bụ ohu mmehie. 35Ohu enwekwaghị ọnọdụ mgbe ọbụla nʼezinaụlọ, ma ọkpara nwere ọnọdụ ruo ebighị ebi. 36Ya mere, ọ bụrụ na Ọkpara ahụ emee ka unu nwere onwe unu nʼezie, unu ga-abụ ndị nwere onwe unu. 37Ama m na unu bụ ụmụ ụmụ Ebraham, ma unu na-achọ igbu m nʼihi na okwu m enweghị ọnọdụ nʼime unu. 38Ana m ekwu ihe m hụrụ nʼebe Nna m nọ, ma unu na-eme ihe unu nụrụ site nʼaka nna unu.” 39Ha zara ya, “Ebraham bụ nna anyị.” Jisọs sịrị ha, “Ọ bụrụ na unu bụ ụmụ Ebraham, unu gara na-arụ ọrụ Ebraham rụrụ. 40Ma unu na-achọ igbu m, bụ onye gwara unu eziokwu ahụ m nụrụ nʼebe Chineke nọ. Ebraham emeghị otu a. 41Unu na-arụ ọrụ nna unu rụrụ.” Ha sịrị ya, “Anyị abụghị ụmụ a mụrụ site nʼịkwa iko; naanị Chineke ya onwe ya bụ otu Nna anyị nwere.” 42Jisọs gwara ha, “Ọ bụrụ nʼezie na Chineke bụ Nna unu, unu ga-ahụ m nʼanya, nʼihi na ọ bụ Chineke zitere m. Abịaghị m site nʼike aka m.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Patrik, Bishọp
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike