Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 7 Maachị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 7 Maachị 2027

Sọnde · Izu nke 4 nke Lent

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 4 nke Lent

Sọnde · Agba ofufe: pinki

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

2Ih 36:14–16, 19–23

14Nʼime ka ihe dị njọ karịa, mmadụ niile, tinyere ndị ndu nʼetiti ndị nchụaja, nọgidere bụrụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi, site nʼịgbaso omenaala rụrụ arụ nke mba niile gbara ha gburugburu. Ha merụrụ ụlọnsọ Onyenwe anyị, nke o doro nsọ nʼime Jerusalem. 15Onyenwe anyị, Chineke nna nna ha, sitere nʼọnụ ndị amụma ya gwa ha okwu mgbe na mgbe, ịdọ ha aka na ntị. O mere nke a nʼihi na o nwere obi ebere nʼebe ha nọ, na nʼebe ụlọnsọ ukwu ya dị. 16Ma ha kwara ndị amụma Chineke ndị a emo, lelịa okwu Chineke ha wetara anya, chịa amụma ha buru ọchị, tutu ruo mgbe ha kpasuru ọnụma Onyenwe anyị megide ndị ya, ruo mgbe ihe ọbụla na-adịghịkwa nke pụrụ igbochi ngosipụta oke ọnụma a. 19Ha sunyere ụlọnsọ Chineke ọkụ, kwatukwa mgbidi Jerusalem. Ha sunyere ụlọeze niile ọkụ, mebikwaa ihe niile ndị bara uru dị nʼime ya. 20Ha buuru ndị fọdụrụ, bụ ndị niile gbanarịrị mma agha, gaa Babilọn, ha ghọrọ ya, ghọkwara ụmụ ya ndị nọchiri anya ya, ndị ohu, tutu ruo mgbe ehiwere alaeze Peshịa. 21Ala ahụ nwere ụbọchị izuike niile kwesiri ya nʼebe o zuruoke, nʼoge niile nke ịtọgbọ nʼefu ya, o zuru ike, ruo mgbe iri afọ asaa ahụ zuru, nʼimezu okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ Jeremaya onye amụma. 22Ma nʼafọ mbụ nke ọchịchị Sairọs eze Peshịa, ime ka okwu Onyenwe anyị nke sitere nʼọnụ Jeremaya mezuo, Onyenwe anyị kpaliri mmụọ Sairọs, eze Peshịa ka o mee mkpọsa nʼalaeze ya niile, ma denyekwa ya nʼakwụkwọ iwu, sị, 23“Otu a ka Sairọs, eze Peshịa kwuru: “ ‘ Onyenwe anyị, Chineke nke eluigwe, e nyela m alaeze niile nke dị nʼụwa. O nyekwala m ọrụ iwuru ya ụlọnsọ na Jerusalem, nke dị na Juda. Ya mere, onye ya ọbụla nʼetiti ndị ya nwere ike ịga, ka Onyenwe anyị Chineke ha nọnyekwara ha.’ ”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 137:1–6

1Nʼakụkụ iyi niile Babilọn ka anyị nọdụrụ ala kwaa akwa mgbe anyị chetara Zayọn. 2Ọ bụ nʼosisi pọpla ka anyị kokwasịrị ụbọ akwara anyị niile. 3Nʼebe ahụ ka ndị dọtara anyị nʼagha gwara anyị ka anyị bụọrọ ha abụ, ndị na-emekpa anyị ahụ rịọrọ anyị ka anyị bụọrọ ha abụ ọṅụ; ha kwuru sị, “Bụọrọnụ anyị otu abụ nʼime abụ Zayọn!” 4Ma, olee otu anyị ga-esi bụọ abụ Onyenwe anyị ebe anyị nọ nʼala ọzọ? 5Ọ bụrụ na m echezọọ gị, Jerusalem, ka aka nri m chefuo ǹka ya. 6Ọ bụrụ na m echezọọ gị, ọ bụrụkwa na m akwụsị iche echiche banyere Jerusalem, oke ọṅụ m, ka ire m rapara nʼokpo ọnụ m.

Ihe ọgụgụ nke abụọ

Efe 2:4–10

4Chineke onye jupụtara nʼobi ebere, maka oke ịhụnanya o nwere nʼebe anyị nọ, 5mere ka anyị soro Kraịst dịrị ndụ ọzọ; ọ bụladị mgbe anyị bụ ndị nwụrụ anwụ nʼime ajọ omume. Ọ bụ site nʼamara ya ka e ji zọpụta unu. 6Ọ kpọlitere anyị na ya, mee ka anyị nọdụ ọdụ nʼebe niile nke eluigwe nʼime Kraịst Jisọs. 7O mere nke a igosi ọgbọ nke na-abịa, ịdị ukwuu nke akụ amara ya, nke o sitere nʼobiọma ya gosi anyị nʼime Kraịst Jisọs. 8Nʼihi na ọ bụ site nʼamara ka e ji zọpụta unu site nʼokwukwe. Nke a abụghị ihe unu rụpụtara nʼonwe unu, ọ bụ onyinye nke Chineke. 9O siteghị nʼọrụ, ka onye ọbụla ghara ịnya isi. 10Nʼihi na anyị bụ akaọrụ ya, nke o kere nʼime Kraịst Jisọs nʼihi ịrụ ezi ọrụ. Ọ bụ otu a ka Chineke siri kwadoo na anyị kwesiri ibi ndụ ụbọchị niile.

Oziọma

Jọn 3:14–21

14Dị ka Mosis weliri agwọ elu nʼime ọzara, otu a ka a ga-ewelikwa Nwa nke Mmadụ elu. 15Ka onye ọbụla kwere na ya nwee ndụ ebighị ebi.” 16Nʼihi na Chineke hụrụ ụwa nʼanya, nke a mere o jiri nye Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka onye ọbụla kweere na ya ghara ịla nʼiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi. 17Nʼihi na Chineke eziteghị Ọkpara ya nʼụwa ka o maa ụwa ikpe, kama ka e site nʼaka ya zọpụta ụwa. 18Ikpe amaghị onye ọbụla kwere na ya, ma onye ọbụla na-ekweghị aghọọlarị onye ikpe mara, nʼihi na o kweghị nʼaha Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya. 19Nke a bụ mkpebi ikpe ahụ; na Ìhè abịala nʼụwa, ma ụmụ mmadụ hụrụ ọchịchịrị nʼanya kama ìhè ahụ, nʼihi na ọrụ ha jọrọ njọ. 20Nʼihi na onye ọbụla na-eme ihe ọjọọ kpọrọ ìhè ahụ asị, ọ dịghị abịakwute ìhè ahụ, ka a ghara ime ka ọrụ ya pụta ìhè. 21Ma ndị na-ebi ndụ nʼeziokwu na-abịakwute ìhè ahụ, ka e nwee ike hụta ya nke ọma, na ihe niile ha na-eme sitere na ike Chineke.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike