Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 3 Maachị
Kalenda Ọtọdọks · 18 Febụwarị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 3 Maachị 2027
Wenezdee · Izu ịhapụ anụ · Olu 6
Mmemme na ndị nsọ
Wenezdee nke Izu ịhapụ anụ
Ụbọchị obubu ọnụ
E kwere azụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
21Ndị m hụrụ nʼanya, ọ bụrụ na obi anyị amaghị anyị ikpe, anyị nwere nkwuwa okwu nʼihu Chineke 22na-anatakwa ya ihe ọbụla anyị rịọrọ nʼihi na anyị na-erube isi nʼiwu ya, na-emekwa ihe na-atọ ya ụtọ. 23Nke a bụkwa iwu ya: ka anyị kwere nʼaha Ọkpara ya Jisọs Kraịst, ya na ịhụrịta ibe anyị nʼanya dịka o nyere anyị nʼiwu. 24Ndị niile na-erube isi nye iwu ya na-anọgidesikwa ike nʼime ya, ya onwe ya na-anọgidesikwa ike nʼime ndị ahụ! Otu a ka anyị si mara na ọ na-anọgidesike nʼime anyị: Ọ bụ site na Mmụọ nke o nyere anyị. 4:1Ndị enyi m hụrụ nʼanya, unu ekwenyela okwu mmụọ niile, kama nwaleenụ mmụọ niile ahụ i mata ma ha si na Chineke, nʼihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha apụọla baa nʼime ụwa. 2Otu a ka unu ga-esi mata Mmụọ nke Chineke: Mmụọ ọbụla nke na-ekwupụta na Jisọs Kraịst abịala nʼanụ ahụ sitere na Chineke. 3Ma mmụọ ọbụla nke na-adịghị ekwupụta Jisọs esiteghị na Chineke, mmụọ dị otu a bụ nke onye ahụ na-emegide Kraịst nke unu nụrụ na ọ ga-abịa, ma ugbu a ọ bịala nʼụwa. 4Ụmụntakịrị m, unu bụ ndị sitere na Chineke, unu emeriekwala ha nʼihi na onye ahụ nke bi nʼime unu dị ukwuu karịa onye ahụ nọ nʼime ụwa. 5Nʼihi na ndị a si nʼime ụwa pụta. Ya mere, ihe ha na-ekwu okwu ya bụ naanị ihe banyere ụwa. Ụwa na-aṅakwa ha ntị. 6Anyị sitere na Chineke, onye ọbụla maara Chineke na-ege anyị ntị, ma onye ọbụla na-esiteghị na Chineke anaghị ege anyị ntị. Ọ bụ otu a ka anyị si amata mmụọ eziokwu na mmụọ nke okwu ụgha.
Oziọma
43Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, Judas, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ batara, ya na igwe mmadụ, ndị ji mma agha na mkpọ. Ọ bụ ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu, na ndị ode akwụkwọ, na ndị okenye ndị Juu zitere ha. 44Ma onye na-arara ya nye, nyere ha rịị ihe ịrịbama sị, “Onye ahụ nke m ga-esutu ọnụ bụ ya; jidenụ ya, kpụrụnụ ya gawa, ma jidesiekwanụ ya ike.” 45Ngwangwa o jekwuuru Jisọs, sị ya, “Onye ozizi!” ma sutukwa ya ọnụ. 46Ndị ikom ahụ jidere Jisọs ma sekpụrụ ya nʼike. 47Ma otu onye nʼime ndị guzo nʼebe ahụ, mịpụtara mma agha ya, gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị ya. 48Jisọs sịrị ha, “Abụ m onyendu nke ndị na-enupu isi nke mere unu ji were mma agha na mkpọ bịa ijide m? 49Ụbọchị niile ka mụ na unu nọ mgbe m na-ezi ihe nʼụlọnsọ ukwu, ma unu ejideghị m. Ma ihe akwụkwọ nsọ kwuru aghaghị imezu.” 50Mgbe ahụ, ha niile hapụrụ ya gbalaga. 51Ọ dị otu nwokorobịa na-eso ya, ọ ji naanị akwa ọcha linin kpuchie onwe ya. Mgbe ha jidere ya, 52ọ hapụụrụ ha akwa ọcha linin ya, gbara ọtọ gbalaga. 53Ha duuru Jisọs gakwuru onyeisi nchụaja, ha niile bụ ndịisi nchụaja, na ndị okenye na ndị ozizi iwu zukọrọ nʼebe ahụ. 54Pita sooro ha, ma ọ nọ nʼebe dị anya. O sooro ha bata nʼobi onyeisi nchụaja. Nʼebe ahụ, o sooro ndị nche nọdụ ọdụ na-anya ọkụ. 55Ndịisi nchụaja na ndịisi ikpe nʼụlọikpe ukwu nọ na-achọ ama megide Jisọs, ka ha nwee ike gbuo ya. Ma ọ dịghị nke ha chọtara. 56Ọtụtụ bịara gbaa ama ụgha megide ya, ma ama ha abụghị otu. 57Mgbe ahụ ụfọdụ biliri gbaa ama ụgha megide ya, sị, 58“Anyị nụrụ mgbe o kwuru sị, ‘Aga m akwatu ụlọnsọ ukwu a nke e ji aka wuo, nʼụbọchị atọ aga m ewukwa ụlọ ọzọ, nke a na-ejighị aka wuo.’ ” 59Ọ bụladị na nke a, ama ha niile adakọtakwaghị nʼotu. 60Mgbe ahụ, onyeisi nchụaja biliri ọtọ nʼihu ha, jụọ Jisọs ajụjụ sị, “Ọ bụ na ị nweghị ihe ọbụla ị ga-aza? Gịnị ka i nwere ikwu banyere ama ndị a a na-agba megide gị?” 61Ma ọ gbakwara nkịtị, ọ zaghị ihe ọbụla. Ọzọkwa, onyeisi nchụaja jụrụ ya sị, “Ị bụ Kraịst, Ọkpara Onye a gọziri agọzi?” 62Jisọs sịrị, “Abụ m ya, unu ga-ahụkwa Nwa nke Mmadụ ka ọ na-anọdụ ala nʼaka nri nke Onye ji ike niile, na-abịakwa nʼigwe ojii nke eluigwe.” 63Onyeisi nchụaja dọwara uwe ya kwuo sị, “Gịnị mere anyị ji achọ ndị akaebe ọzọ? 64Unu anụla okwu nkwulu si ya nʼọnụ pụta! Gịnị bụ mkpebi unu?” Ha niile mara ya ikpe sị, “O kwesiri ka ọ nwụọ!” 65Mgbe ahụ ụfọdụ bidoro ịgbụ ya ọnụ mmiri asọ, jiri akwa kechie ya anya, tiekwa ya aka na-asị, “Buo amụma!” Ndị nche kpụpụtara ya tiekwa ya ihe. 66Dịka Pita nọ nʼobi ahụ, otu nʼime ụmụ agbọghọ na-ejere onyeisi nchụaja ozi bịara nso ebe ọ nọ. 67Mgbe ọ hụrụ Pita ka ọ na-anya ọkụ, o leziri ya anya nke ọma, sị, “Ị bụ otu nʼime ndị na-eso Jisọs onye Nazaret ahụ.” 68Ma ọ gọrọ agọ sị, “Amaghị m, maọbụ ghọtakwa ihe ị na-ekwu.” Ma ọ pụrụ gaa nʼụzọ e si abata. Mgbe ahụ oke ọkụkụ kwara akwa. 69Mgbe nwaagbọghọ ahụ hụrụ Pita ọzọ, o gosiri ya ndị ọzọ nọ nʼebe ahụ sị ha, “Nwoke a bụkwanụ otu nʼime ha.” 70Ma ọ gọkwara agọ ọzọ. Mgbe oge nta gasịrị, ndị guzo Pita nso sịrị ya, “Nʼezie, ị bụ otu nʼime ha, nʼihi na ị bụ onye Galili.” 71Mgbe ahụ o bidoro ịbụ onwe ya ọnụ, na ịṅụ iyi na-asị, “Amaghị m onye nwoke a unu na-ekwu okwu ya bụ.” 72Nʼotu oge ahụ, oke ọkụkụ kwara akwa nke ugboro abụọ. Mgbe ahụ Pita chetara okwu Jisọs gwara ya sị, “Tupu oke ọkụkụ akwaa akwa ugboro abụọ, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.” Obi tiwara ya mee ka ọ kwaa akwa. 15:1Nʼezigbo isi ụtụtụ, ndịisi nchụaja na ndị okenye na ndị ozizi iwu, na ndị nzukọ ndị okenye niile, nwere mkpebi. Ha kere Jisọs agbụ, duru ya nyefee nʼaka Pailet.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 18 Febrụwarị na kalenda nzukọ bụ 3 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike