Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 2 Maachị
Kalenda Ọtọdọks · 17 Febụwarị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 2 Maachị 2027
Tiuzdee · Izu ịhapụ anụ · Olu 6
Mmemme na ndị nsọ
Tiuzdee nke Izu ịhapụ anụ
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
10Otu a ka anyị si amata ndị bụ ụmụ Chineke, na ndị bụ ụmụ ekwensu: Onye ọbụla na-adịghị eme ihe ziri ezi abụghị nwa Chineke, otu a ka ọ dịkwa onye na-adịghị ahụ ụmụnna ha nʼanya. 11Nʼihi na nke a bụ ozi ahụ unu nụrụ site na mmalite, ka anyị hụrịta onwe anyị nʼanya. 12Ka anyị hapụ ịdị ka Ken, onye bụ nke ajọ onye ahụ, na onye gburu nwanne ya. Gịnị mere o ji gbuo ya? Ọ bụ nʼihi na ọrụ ya jọrọ njọ, ma nke nwanne ya ziri ezi. 13Ka ọ gharakwa iju unu anya ụmụnna m, na ụwa kpọrọ unu asị. 14Anyị matara na anyị esitela nʼọnwụ baa na ndụ nʼihi na anyị na-ahụ ụmụnna anyị nʼanya. Onye ọbụla na-adịghị ahụ ibe ya nʼanya na-anọgide nʼọnwụ. 15Onye ọbụla na-akpọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ, unu matakwara na o nweghị onye ọbụla bụ ogbu mmadụ nwere ndụ ebighị ebi nʼime ya. 16Ọ bụ otu a ka anyị sị mata ihe bụ ịhụnanya, na Jisọs tọgbọrọ ndụ ya nʼihi anyị. Anyị kwesikwara ịtọgbọ ndụ anyị nʼihi ụmụnna anyị. 17Ọ bụrụ na onye ọbụla nwere akụ nke ụwa, ahụ nwanna ya ka ọ nọ na mkpa ma o nweghị obi ebere nʼebe ọ nọ, olee otu ịhụnanya Chineke si dịrị nʼime ya? 18Ụmụntakịrị m, ka ịhụnanya anyị ghara ịbụ naanị nʼegbugbere ọnụ maọbụ nke okwu efu, kama ka ọ bụrụ nke sitere nʼeziokwu nakwa nʼomume anyị. 19Anyị ga-esitekwa na nke a mata na anyị bụ ndị nke eziokwu ahụ ma matakwa otu anyị ga-esi mee ka obi anyị kwenye nʼihu ya. 20Nʼihi na ọ bụrụ na obi anyị amaa anyị ikpe, Chineke dị ukwuu karịa obi anyị, ọ mazukwara ihe niile.
Oziọma
10Mgbe ahụ Judas Iskarịọt, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ jekwuuru ndịisi nchụaja ịgba izu otu ọ ga-esi rara ya nye ha nʼaka. 11Mgbe ha nụrụ nke a, ha ṅụrịrị ọṅụ kwee ya nkwa inye ya ego. Site nʼụbọchị ahụ, o bidoro ịchọgharị ụzọ ọ ga-esi rara ya nye ha. 12Nʼụbọchị mbụ nke Mmemme achịcha na-ekoghị eko, mgbe ha na-achụ aja atụrụ ngabiga, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa kwadoro gị ihe, maka oriri ngabiga?” 13O zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Gaanụ nʼime obodo, otu nwoke bu ite mmiri ga-ezute unu. Soronụ ya. 14Ebe ọbụla ọ banyere, sịnụ onyenwe ụlọ ahụ, Onye ozizi sịrị, Olee ụlọ ọbịa a kwadoro m, ebe mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-anọ rie oriri ngabiga? 15Ọ ga-egosi unu otu ọnụụlọ buru ibu nʼelu ụlọ ahụ, ebe e dozichara ihe niile. Kwadoonụ ihe anyị nʼebe ahụ.” 16Ndị na-eso ụzọ ya pụrụ baa nʼime obodo, ha hụrụ ihe niile dị ka ọ gwara ha. Ma kwadokwa nri ngabiga ahụ. 17Mgbe o ruru uhuruchi, ya na ndị ozi ya iri na abụọ ahụ so bịa. 18Mgbe ha nọ na-eri nri, Jisọs gwara ha sị, “Nʼezie agwa m unu, otu onye nʼime unu ga-arara m nye. E, otu onye so m ugbu a na-eri nri!” 19Ha bidoro inwe obi mwute, na-asị ya nʼotu nʼotu, “Ọ bụ m? Ọ bụ m?” 20Ọ sịrị ha, “Ọ bụ otu onye nʼime mmadụ iri na abụọ a. Onye mụ na ya na-amanyekọta aka nʼime otu efere. 21Nwa nke Mmadụ ga-ala dị ka e dere banyere ya. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ onye a ga-esite nʼaka ya rara Nwa nke Mmadụ nye. Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.” 22Dị ka ha na-eri nri, o weere achịcha, nye ekele, nyawa ya, nye ha sị, “Rienụ ya, nke a bụ ahụ m.” 23Mgbe ahụ, o buuru iko, nye ekele bunyekwa ha. Ha niile ṅụrụ site nʼotu iko ahụ. 24Ọ sịrị ha, “Nke a bụ ọbara m nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, nke a na-awụfu nʼihi ọtụtụ mmadụ. 25Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, agaghị m aṅụ mmanya vaịnị ọzọ tutu ruo ụbọchị ahụ, mgbe m ga-aṅụ ya ọhụrụ nʼalaeze Chineke.” 26Mgbe ha bụsịrị abụ, ha pụrụ gaa nʼUgwu Oliv. 27Jisọs sịrị ha, “Unu niile ga-agbahapụ m, nʼihi na e dere ya otu a sị, “ ‘Aga m etigbu onye ọzụzụ atụrụ, igwe atụrụ ga-agbasasịkwa.’ 28Ma mgbe e mesịrị ka m si nʼọnwụ bilie, aga m ebu unu ụzọ gaa Galili.” 29Pita kwuru, “Ọ bụrụ na mmadụ niile agbahapụ gị, agaghị m eme otu a.” 30Jisọs sịrị ya, “Ịgwa gị eziokwu, nʼụbọchị taa, nʼabalị taa, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa ugboro abụọ, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.” 31O kwusịrị ike sị, “Ọ bụrụkwa na ihe ọnwụ adapụta, aga m eso gị nwụọ. Agaghị m agọnarị gị!” Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ha niile kwuru. 32Ha pụrụ garuo ebe a na-akpọ Getsameni. Nʼebe ahụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Nọdụnụ nʼebe a ka m gaa kpee ekpere.” 33Ọ kpọọrọ Pita, na Jemis na Jọn tinyere onwe ya. Ọ malitere inwe ihe mwute dị ukwuu nakwa obi ịlọ mmiri. 34Ọ sịrị ha, “Ọ na-ewute mkpụrụobi m nke ukwuu ruo nʼọnụ ọnwụ. Nọdụnụ nʼebe a na-eche nche.” 35Ọ gatụrụ nʼihu daa nʼala kpee ekpere, sị, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee ka oge awa ahụ gabiga ya. 36O kwuru sị, “Abba, Nna, ị pụrụ ime ihe niile. Napụ m iko a, ma otu ọ dị, ọ bụghị ka e mee uche m, kama ka e mee uche gị.” 37Ọ bịara hụ ha ka ha na-arahụ ụra. Ọ sịrị Pita, “Saimọn, ị na-arahụ ụra? Ọ bụ na ị nweghị ike iche nche otu awa? 38Nọrọnụ na nche, na-ekpekwanụ ekpere ka unu ghara ịdaba nʼọnwụnwa. Mmụọ dị ike ma anụ ahụ adịghị ike.” 39Ọ pụkwara ọzọ, gaa kpee ekpere, na-ekwukwa otu okwu ahụ. 40Mgbe ọ lọghachiri azụ ọ hụrụ na ha na-arahụ ụra, nʼihi na anya ha dị arọ nke ukwuu. Ha amakwaghị ihe ha ga-agwa ya. 41Mgbe ọ lọghachiri nke ugboro atọ, ọ sịrị ha, “Unu ka nọ na-arahụ ụra na-ezukwa ike? O zuola! Oge awa ahụ abịala. Lee, a rarala Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmehie. 42Bilienụ! Ka anyị gawa! Lee, onye na-arara m nye nọ nso.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 17 Febrụwarị na kalenda nzukọ bụ 2 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike